Ala Ndị Venda Nke Na-amị Mkpụrụ
KEMGBE afọ iri gara aga, mụ na nwunye m arụwo ọrụ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile n’etiti ndị Venda. Ndị Venda bi na ndịda nke Osimiri Limpopo n’ebe ugwu nke South Africa, ihe mejupụtakwara mba ha bụ ọtụtụ ebo ndị gabigara Limpopo na narị afọ ndị gara aga. Ụfọdụ ndị Venda na-ekwu na ndị nna nna ha malitere ibi n’ebe a ihe karịrị 1,000 afọ gara aga.
N’ezie, ógbè a bụbu akụkụ nke ebe mepere anya n’oge ochie a kpọrọ Alaeze Mapungubwe. Ọ bụ obodo mbụ mepere anya na South Africa, ndagwurugwu sara mbara nke Osimiri Limpopo dịkwa na ya, site na Botswana n’ebe ọdịda anyanwụ ruo na Mozambique n’ebe ọwụwa anyanwụ. Malite n’ihe dị ka 900 O.A. ruo 1100 O.A., Mapungubwe bụ ebe ndị Arab na-agba mgbere ahịa si enweta ọdụ́, mpi anụ rhino, akpụkpọ anụ, ọla copper, na ọbụna ọlaedo. E gwupụtawo ihe ndị e ji nkà kpụọ bụ́ ndị e ji ọlaedo techie n’ugwu ebe a na-eli ndị oké ozu nke a kpọrọ Mapungubwe. Ha so n’ime “ihe kasị ochie na-egosi igwu ọlaedo n’ebe ndịda Africa,” ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-atụ aro ya.
A dịghịzi egwupụta ọlaedo n’ebe a. Taa, a maara ala ndị Venda nke ọma maka ịmị mkpụrụ ya. N’ebe ndịda nke Ugwu Soutpansberg ka e nwere ndagwurugwu na-eme nri, bụ́ ebe na-emepụta mkpụrụ osisi ndị dị ka ube Bekee, unere, mango, na gova n’ụba. E wezụga mkpụrụ akị ndị dị ka pecan na macadamia, e nwekwara akwụkwọ nri n’ụba. Ha gụnyere muroho nke na-eto n’ọhịa, bụ́ nke na-atọ ka akwụkwọ nri spinach, ọ na-atọkwa ọtụtụ ndị bi n’ógbè ahụ ụtọ nke ukwuu.
Ndị Venda bụ ndị udo na ndị na-ele ọbịa nke ọma. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ka onyeisi ezinụlọ na-ekwu ka e siere onye ọbịa a na-atụghị anya ya otu ọkụkọ. A na-eji vhuswa, bụ́ nri bụ́ isi e ji ọka mee, eri nke a. Mgbe nleta ahụ gasịrị, onyeisi ezinụlọ ahụ ga-edupụtụ onye ọbịa ya. Nke a bụ ụzọ omenala e si akwanyere onye ọbịa ùgwù. A na-akụziri ụmụaka ikele ndị ọbịa n’ụzọ nkwanye ùgwù site n’ihulata ala na ịkụfe otu aka n’aka nke ọzọ. Na peji a ị na-ahụ ndị inyom abụọ bụ́ ndị Venda ka ha na-ekele ibe ha n’ụzọ omenala a.
Asụsụ Tara Akpụ
Ọ naghị adịrị ndị si Europe mfe ịmụta asụsụ ndị Venda. Otu ihe isi ike dị na ya bụ na a na-asụpe ọtụtụ okwu otu ụzọ ahụ ma na-akpọpụta ha n’ụzọ dịgasị iche. Ka m na-ekwuru otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke ji asụsụ Venda eme ihe okwu dabeere na Bible otu ụbọchị, m nọ na-agbalị ịgba ndị na-ege m ntị ume ịgwa onye ọ bụla okwu. Otu onye na-ege ntị chịwara ọchị n’ihi na m sịrị “site na mkpịsị aka gaa na mkpịsị aka” kama ịsị “site n’otu onye gaa n’ọzọ.”
Mgbe mbụ m nwara ịsụ asụsụ Venda n’ọrụ ịgba àmà ihu ọha, nwanyị onye Venda zaghachiri, sị: “Amaghị m asụ Bekee.” Echere m na asụwo m nnọọ asụsụ Venda kwere nghọta, ma o chere na ọ bụ Bekee! Ka m na-eru otu ụlọ nso n’oge ọzọ, agwara m otu nwatakịrị ka ọ kpọọrọ m onyeisi ezinụlọ. Okwu Venda maka onyeisi ezinụlọ bụ thoʹho. Ná nkwuhie ọnụ, asịwo m thohoʹ, si otú ahụ na-arịọ ka m gwatụ enwe nọ n’ụlọ ahụ okwu! Nkwuhie ọnụ ndị dị otú a kụdara m mmụọ, ma site n’ịnọgidesi ike mụ na nwunye m nwere ike iji asụsụ Venda kwurịta okwu nke ọma ugbu a.
Mkpụrụ Ime Mmụọ
Ala ndị Venda abụrụwala ebe na-amị mkpụrụ n’ụzọ ime mmụọ. N’afọ ndị 1950, e guzobere ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’etiti ndị si ná mba ndị gbara ha gburugburu bịa ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ọla copper n’obodo Messina. Ọrụ ha ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ mere ka ọtụtụ ndị Venda mata eziokwu Bible. Afọ iri mgbe nke ahụ gasịrị otu ìgwè Ndịàmà bụ́ ndị Venda nọ na-enwe nzukọ n’ụlọ mmadụ n’obodo Sibasa.
Iji mee ka ịba ụba ahụ gaa ngwa ngwa, alaka Watch Tower Society dị na South Africa zigara ndị na-ezisa ozi ọma oge nile n’ubi a na-amị mkpụrụ. N’oge na-adịghị anya, ìgwè Sibasa ahụ amụbawo ghọọ ọgbakọ buru ibu. E nwere nzukọ ndị Kraịst n’ọnụ ụlọ ụlọ akwụkwọ n’oge ahụ. Otú ọ dị, site n’enyemaka nke Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè Pietersburg ihe dị ka kilomita 160 gaa n’ebe ndịda, e wuru otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Thohoyandou, bụ́ obodo ya na ya gbara agbata obi.
Ndị na-asụ asụsụ Venda n’ebe ugwu nke South Africa karịrị 500,000. E nweghị onye Venda bụ Onyeàmà mgbe ọrụ nkwusa Alaeze malitere n’ebe a n’afọ ndị 1950. Ugbu a e nwere ihe karịrị mmadụ 150. Ma a ka nwekwara ọtụtụ ebe a na-akpabeghị aka nakwa ọrụ dị ukwuu a ka ga-arụ. Na 1989 anyị malitere ileta otu obodo nta ndị Venda a na-akpọ Hamutsha. Nanị otu Onyeàmà bi n’ebe ahụ mgbe ahụ. Ugbu a ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 40 bi n’obodo nta ahụ. Sitekwa n’enyemaka nke Ndịàmà sitere n’ọgbakọ ndị dị na Pietersburg na ego nke ụmụnna anyị ndị nọ n’ala ndị bara ọgaranya tụtara, anyị na-arụchapụ Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị.
Anyị bi n’ime ụlọ nta ụgbọ na-adọkpụ nke dị n’ugbo. Site n’ime ka ndụ anyị dị mfe, anyị nwekwuru oge iwere ozi ọma ahụ gakwuru ndị ebe ahụ. (Mak 13:10) N’ihi nke a, e jiriwo ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ ndị aka ịrara ndụ ha nye Jehova Chineke gọzie anyị n’ụba. Otu ihe atụ bụ otu nwoke aha ya bụ Michael, bụ́ onye hụrụ akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala n’ụlọ otu enyi ya.a Ọ malitere ịgụ ya, ọ matakwara eziokwu ahụ ozugbo. Ya mere o degaara Watch Tower Society akwụkwọ ka e zitere ya akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible. N’akwụkwọ ozi ya Michael kọwara na a ka mepụrụ ya baptism dị ka onye òtù chọọchị Apọstọlik dị n’ebe ahụ. “Achọpụtawo m,” ka ọ gara n’ihu na-ekwu, “na m na-aga n’ụzọ na-abụghị nke na-eduga n’Alaeze Chineke. Ekpebiwo m ịghọ onye òtù unu, ma amaghị m otú m ga-esi eme ya.” O nyeziri adres ya ma rịọ ka e zitere ya otu onye n’ime Ndịàmà Jehova inyere ya aka. Agbalịrị m chọta Michael ma malitere ya ọmụmụ Bible ebe obibi. Taa, ọ bụ Onyeàmà e mere baptism, o jikwa iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi.
Na December 1997, anyị gara Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke e nwere n’ámá egwuregwu dị na Thohoyandou. Mmadụ 634 bịara ya, e mekwara ndị ọhụrụ 12 baptism. Enwere m ihe ùgwù nke ikwu okwu abụọ n’asụsụ Venda. Nke ahụ bụ n’ezie oge dị ịrịba ama n’ime afọ iri anyị nweworo obi ụtọ ịnọ n’ala a na-amị mkpụrụ!—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.