Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“A Pụrụ Ime Ihe Nile n’Ebe Chineke Nọ”
OKWU ndị ahụ dị n’elu, bụ́ nke a na-achọta na Matiu 19:26, ghọrọ eziokwu nye otu nwa agbọghọ nọ na Venezuela. Mgbe ọ mụtasịrị ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu, o meriri otu nsogbu tara akpụ. Ọ na-akọ, sị:
“Nne nne m nwere nnọọ obi ọma, na-ahụkwa n’anya. N’ụzọ dị mwute, ọ nwụrụ mgbe m dị nanị afọ 16. Ọnwụ ya metụrụ m n’ahụ nke ukwuu. Isi ghasasịrị m, achọghịdị m ịpụ n’èzí. Ọ fọrọ nke nta ka m bụrụ onye na-ekewapụ onwe ya iche kpam kpam.
“Agaghị m ụlọ akwụkwọ, enweghịkwa m ọrụ. Nanị ihe m na-eme bụ ịnọ n’ime ọnụ ụlọ m. N’ịbụ onye nọ nanị ya, n’enweghịkwa ndị enyi ọ bụla, enwere m oké ịda mbà n’obi. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe ma ọlị ma chọọ ịnwụ iji weta ihe nile ná njedebe. Anọgidere m na-ajụ onwe m, ‘Gịnị mere m ji dịrị ndụ?’
“Nne m na-anatabu magazin Ụlọ Nche na Teta! site n’aka otu Onyeàmà na-eto eto aha ya bụ Gisela. Otu ụbọchị nne m hụrụ Gisela ka ọ na-agafe n’ebe obibi anyị ma jụọ ya ma ọ̀ pụrụ inyere m aka. Gisela kwetara na ya ga-agbalị, ma ajụrụ m ịhụ ya. Nke a emeghị ka Gisela kwụsị. O deere m akwụkwọ ozi ma gwa m na ya chọrọ ịbụ enyi m nakwa na onye dị nnọọ mkpa karịa ya onwe ya chọkwara ịbụ enyi m. Ọ sịrị na onye ahụ bụ Jehova Chineke.
“Nke a metụrụ m n’ahụ, azaghachikwara m akwụkwọ ozi ya. Ruo ọnwa atọ anyị derịtara akwụkwọ ozi. Nanị mgbe Gisela kwaliri ma gbaa m ume ọtụtụ mgbe ka m mesịrị nwee obi ike izute ya. Ná nke mbụ anyị zutere, Gisela so m mụọ Bible, na-eji akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịrị, ọ kpọrọ m òkù ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ahụ. Nke ahụ juru m anya. Ruo afọ anọ, esibeghị m n’ụlọ pụọ apụọ, echiche nke ịpụ n’okporo ámá tụrụ m ụjọ.
“Gisela nwere nnọọ ndidi n’ebe m nọ. O mesiri m obi ike na ọ dịghị ihe m ga-atụrụ ụjọ nakwa na mụ na ya ga-eso gaa nzukọ ahụ. Ekwetara m n’ikpeazụ. Mgbe anyị bịarutere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ahụ malitere mawa m jijiji, ọsụsọ ana-agbakwa m. Enweghị m ike ikele onye ọ bụla. Ka o sina dị, ekwetara m ịnọgide na-eje nzukọ, Gisela nọgidesikwara ike na-akpọtụrụ m kwa izu.
“Iji nyere m aka imeri ịtụ egwu m, Gisela na-akpọrọ m aga nzukọ n’ezi oge. Anyị na-eguzo n’ọnụ ụzọ ma kelee onye ọ bụla ozugbo ha bịarutere. N’ụzọ dị otú ahụ ana m eche nanị otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ihu n’otu mgbe, kama ịbụ otu ìgwè zuru ezu n’otu mgbe. Mgbe m chere na mụ enwekwaghị ike ịnagide ya, Gisela hotaara m Matiu 19:26: ‘N’ebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime; ma a pụrụ ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.’
“Ọ bụ ezie na ọ dịghị mfe, emesịrị m nwee ike ije ọbụna mgbakọta nke ndị mmadụ ka ukwuu ná mgbakọ sekit. Lee nzọụkwụ dị ukwuu nke ahụ bụụrụ m! Na September 1995, enwetara m obi ike ịgwa ndị okenye okwu banyere ịmalite ozi ụlọ n’ụlọ. Ọnwa isii mgbe e mesịrị, n’April 1996, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri.
“Mgbe otu onye jụrụ m na nso nso a otú m si nweta obi ike ime nke a, azaghachiri m: ‘Ọchịchọ m nwere ime ihe na-atọ Jehova ụtọ karịrị egwu m na-atụ.’ Ọ bụ ezie na m ka na-enwe ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ, ọṅụ m mụbara site n’ozi m na-eje dị ka ọsụ ụzọ oge nile. N’ileghachi anya azụ, ekwenyeere m Gisela. Enweziri m Enyi nwere mmasị n’ebe m nọ bụ́ onye ‘na-eme m ka m dị ike.’”—Ndị Filipaị 4:13.
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
“Ọchịchọ m nwere ime ihe na-atọ Jehova ụtọ karịrị egwu m na-atụ”