E Nwere Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Dị Ndụ na Namibia!
NAMIBIA gbatịrị ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 1,500 n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri Africa. Ikpo ájá, ugwu ndị nkume jupụtara na ha, na ala dị larịị ndị ajịrịja nkume jupụtara na ha mejupụtara ikperé mmiri nile nke mba ahụ. Nkume ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị nwere àgwà ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche gwakọtara n’etiti nkume iyi ndị dị n’ụsọ mmiri nke Namibia. Ọbụna a na-ahụ diamond n’ebe ahụ site n’oge ruo n’oge. Ma mba ahụ nwere ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa nkume ndị a. Namibia nwere ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị ndụ—mmadụ ndị si n’ọtụtụ akụkụ nke mba ahụ.
Ndị mbụ biri na Namibia sụrụ ìgwè asụsụ a kpọrọ Khoisan. E ji ụda na-adatụ ike ike mara okwu ha. N’ime ndị na-asụ Khoisan taa bụ ndị Damara nwere akpụkpọ ahụ ojii, ndị na-achatụ ọcha nwere obere ahụ bụ́ ndị a na-akpọ ndị Nama, na ndị dinta Bushman a ma ama. Ọtụtụ agbụrụ ndị isi ojii abịawokwa na Namibia n’ime narị afọ ndị na-adịbeghị nnọọ anya. E kewara ndị a gaa n’ógbè atọ bụ́ isi: ndị Ovambo (agbụrụ kasị ukwuu na Namibia), ndị Herero, na ndị Kavango. Ndị Europe malitere ibi na Namibia na narị afọ nke 19. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị si mba ọzọ kwabatara mgbe a chọpụtasịrị diamond n’ájá ndị dị n’ọzara.
Ndị bi na Namibia dị oké ọnụ ahịa n’ihi na ha bụ akụkụ nke ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị Chineke nyere Ọkpara ya, si otú a na-emeghe ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ọtụtụ narị ndị Namibia bụ́ ndị si n’ọtụtụ agbụrụ anabataworị ozi nke nzọpụta ahụ. A pụrụ iji ndị a tụnyere nkume ndị dị oké ọnụ ahịa dị ndụ n’ihi na ha so n’ime “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” bụ́ ndị a na-achịkọbata ugbu a n’ime ụlọ ofufe nke Jehova.—Hagaị 2:7.
A Malite Igwupụta Akụ̀ Ime Mmụọ
Ọ bụ na 1928 ka a malitere igwupụta akụ̀ ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Namibia. N’ime afọ ahụ, alaka Watch Tower Society nke dị na South Africa zigaara ndị bi n’akụkụ dị iche iche nke mba ahụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible dị 50,000. N’afọ sochirinụ, otu onye Kraịst e tere mmadụ si South Africa nke aha ya bụ́ Lenie Theron sochiri mmasị e gosipụtara. N’ime ọnwa anọ, nanị ya jezuru mba ahụ sara mbara, na-etinye akwụkwọ ndị e ji amụ Bible dị ihe karịrị 6,000 n’asụsụ Afrikaans, Bekee, nakwa na German. N’ezie, ọrụ a nile abụghị n’efu.
Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Bernhard Baade, bụ́ onye Germany na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ala. Na 1929, o nwetara àkwá site n’aka onye ọrụ ugbo na-eji peji nke akwụkwọ Watch Tower bipụtara ekechi àkwá nke ọ bụla. Bernhard ji ịnụ ọkụ n’obi gụọ peji nke ọ bụla, na-eche banyere onye dere akwụkwọ ahụ. O mesịrị ruo na peji nke ikpeazụ, bụ́ nke gosiri adres Watch Tower Society nke dị na Germany. Bernhard dere akwụkwọ ka e zitekwuoro ya akwụkwọ, ghọọkwa onye Namibia mbụ nabatara eziokwu ahụ.
Ndị Ọrụ Oge Nile Abịarute
Na 1950, ndị ozi ala ọzọ anọ e nyere ọzụzụ na Watchtower Bible School of Gilead bịarutere Namibia. Na 1953, ọnụ ọgụgụ ndị ozi ala ọzọ mụbara ruo asatọ. Ha gụnyere Dick na Coralie Waldron, bụ́ di na nwunye si Australia bụ́ ndị ka na-eje ozi n’ebe a n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọtụtụ ndị mkpọsa Alaeze oge nile ndị ọzọ si South Africa na mba ofesi ekerewokwa òkè n’igwupụta akụ̀ ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Namibia. E zigawo ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ na Namibia, tinyekwara ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi.
Isi ihe ọzọ na-atụnye ụtụ n’uto ime mmụọ na Namibia abụrụwo ịsụgharị na ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ ndị bụ́ isi nke obodo ahụ, dị ka Herero, Kwangali, Kwanyama, Nama/Damara, na Ndonga. Kemgbe 1990, ọmarịcha ọfịs nsụgharị nakwa ebe obibi maka ndị ọrụ afọ ofufo oge nile, anọworị na-arụ ọrụ n’isi obodo ya, bụ́ Windhoek. Karen Deppisch, bụ́ onye soworo di ya kere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma oge nile n’akụkụ dị iche iche nke Namibia, na-ekwu, sị: “Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya mgbe anyị na-enye ha akwụkwọ n’asụsụ ha, karịsịa mgbe ụdị akwụkwọ ọ bụla e nwere kpọmkwem n’asụsụ ahụ dị nnọọ ole na ole.”
Ịnụcha Nkume Ndị ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa
Ụfọdụ n’ime akụ̀ nkịtị ndị dị oké ọnụ ahịa nke Namibia abụrụwo nke ebili mmiri na ájá ndị na-aga n’elu ha eri ọtụtụ puku afọ nụchara. Ma, n’ezie, usoro dị otú ahụ sitere n’okike adịghị ewepụta ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị ndụ. Ọ na-ewe ụmụ mmadụ na-ezughị okè mgbalị iji “tụpụ mmadụ ochie” ma yikwasị mmadụ ọhụrụ yiri Kraịst. (Ndị Efesọs 4:20-24) Dị ka ihe atụ, ife ndị nna nna nwụrụ anwụ ofufe bụ ọdịnala dị ike n’ọtụtụ agbụrụ nke Namibia. Ndị òtù ezinụlọ na ndị agbata obi na-akpagbukarị ndị jụrụ ife ndị nna nna ofufe. Mgbe ndị mmadụ mụtara site na Bible na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” ha na-eche ule ihu. (Eklisiastis 9:5) N’ụzọ dị aṅaa?
Otu Onyeàmà bụ́ onye Herero na-akọwa, sị: “Irubere eziokwu ahụ isi bụ oké ihe ịma aka. Ekwetara m iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ma o were m oge iji tinye ihe ndị m na-amụta n’ọrụ. Nke mbụ, aghaghị m ịnwale ma ọ̀ dị ihe ga-eme m ma m kwụsị ikere òkè na nkwenkwe ọdịnala. Dị ka ihe atụ, ana m anyara ụgbọala gafee ebe ụfọdụ na Namibia n’akwụsịghị iji tụkwasị nkume n’ili ma ọ bụ n’ewelighị okpu m elu n’ekele nye ndị nwụrụ anwụ. Nke nta nke nta, abịara m kwenyesie ike na ọ dịghị ihe ga-eme m n’ihi efeghị ndị nna ochie nwụrụ anwụ ofufe. Lee ka m si nwee obi ụtọ na Jehova agọziwo mgbalị ndị m mere inyere ezinụlọ m na ndị ọzọ nwere mmasị aka ịmụta eziokwu ahụ!”
Mkpa Maka Ndị Na-egwupụta Akụ̀ Ime Mmụọ
Tupu ndị ozi ala ọzọ ahụ abịarute na 1950, e nwere nanị otu onye nkwusa ozi ọma na Namibia. Ọnụ ọgụgụ ahụ amụbaala n’esepụghị aka ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu bụ́ 995. Ma, e nwere ọtụtụ ọrụ a ka ga-arụ. N’ezie, a kpabeghị ógbè ụfọdụ aka. Ị̀ nọ n’ọnọdụ ije ozi n’ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị mkpọsa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi? Mgbe ahụ, biko, gafeta na Namibia ma nyere anyị aka ịchọta na ịnụchakwu nkume ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa.—Tụlee Ọrụ 16:9.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 26]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
AFRICA
NAMIBIA
[Foto]
Namibia bụ mba e nwere ọmarịcha nkume ndị dị oké ọnụ ahịa na ya
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Map: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.; Diamond: Site n’ikike Namdek Diamond Corporation
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
A na-ekwusara agbụrụ nile dị na Namibia ozi ọma ahụ
[Foto dị na peeji nke 28]
Ị̀ pụrụ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị mkpọsa Alaeze?