Okwu Ndị Yiri Ilu Sitere n’Aka Chineke na Nzube Chineke
MGBE mmadụ na-amaghị ya, ọ bụrụ ihe tara akpụ; ma mgbe mmadụ maara ya, ọ bụrụ ihe dị mfe. Gịnị ka a na-ekwu maka ya? Ọ bụ okwu ndị yiri ilu.
N’ọgbọ a na-ewere ihe otú ha dị, ndị mmadụ na-ele okwu ndị yiri ilu anya dị ka egwuregwu ụmụaka, ma n’oge gboo, okwu ndị yiri ilu bụ “nnwale nke amamihe,” ka The Interpreter’s Dictionary of the Bible na-ekwu.—Tụlee Ilu 1:5, 6.
Kama ikwu uche ma ọ bụ nzube ya hoo haa, mgbe ụfọdụ Jehova amarawo ụma mee ka okwu amụma ya ghara idocha anya, na-eji okwu ndị yiri ibe ha, “okwu ndị na-edochaghị anya” bụ́ ndị dị mgbagwoju anya, ma ọ bụ okwu ndị yiri ilu na-esi ike nghọta, eme ihe. (Abụ Ọma 78:2, King James Version; Ọnụ Ọgụgụ 12:8, The Emphasized Bible) N’eziokwu, ọ bụ ezie na e ji okwu Hibru maka okwu ndị yiri ilu mee ihe nanị ugboro 17 n’ime Bible, okwu ndị yiri ilu na ilu juru nnọọ eju n’Akwụkwọ Nsọ.
E Nwere Ọtụtụ Okwu Ndị Yiri Ilu Dị na Bible
A kọrọ na Eze Solomọn nwere ike ịza ọbụna ajụjụ, ma ọ bụ okwu ndị yiri ilu kasị dị mgbagwoju anya e wetaara ya. (1 Ndị Eze 10:1, nkọwa ala ala peji nke NW) N’ezie nke a bụ n’ihi amamihe Chineke nyere ya. Ọ bụrụ na e nwere eziokwu ọ bụla dị n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge ochie kọrọ, bụ́ na Solomọn dara otu mgbe n’asọmpi nke okwu ndị yiri ilu nke ya na Eze Hiram nke Taịa sọrọ, ọ ga-abụ ma eleghị anya mgbe mmụọ Jehova funahụsịrị ya n’ihi ndapụ o si n’ezi ofufe dapụ. N’otu aka ahụ, Onyeikpe Samsọn gosipụtara mmasị n’okwu ndị yiri ilu. N’otu oge, n’ịbụ onye e ji mmụọ nsọ nye ike, otu okwu yiri ilu nyere ya ohere nke imenye ndị iro Chineke ụjọ.—Ndị Ikpe 14:12-19.
Otú ọ dị, ọtụtụ okwu ndị yiri ilu dị na Bible metụtara nzube Jehova kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, tụlee Jenesis 3:15. Amụma a, bụ́ nke isiokwu Bible hiwere isi na ya, bụ n’onwe ya ihe siri ike nghọta, “ihe omimi.” (Ndị Rom 16:25, 26) E wezụga ịbụ onye e nyere ọhụụ na mkpughe karịrị ike mmadụ, Pọl onyeozi hụkwara akụkụ ụfọdụ nke nzube Chineke “n’ime ilu,” ma ọ bụ n’ikwu ya n’ụzọ nkịtị, “okwu na-edochaghị anya.” (1 Ndị Kọrint 13:12; 2 Ndị Kọrint 12:1-4) Gịnịkwanụ banyere ịkọ nkọ na-enweghị ọgwụgwụ ndị a kọworo banyere ọnụ ọgụgụ dị omimi nke anụ ọhịa ahụ—“[narị isii na iri isii na isii]”—e webatara na mberede ná Mkpughe 13:18 n’akọwaghị ya akọwa? Ònye pụrụ ịkọwa okwu ndị a yiri ilu sitere n’aka Chineke, gịnịkwa bụ nzube ha?
Ịkọwa Ihe Omimi
Nye ọtụtụ n’ime anyị, ịhụ ụzọ bụ ihe kasị dị oké ọnụ ahịa n’ime ikike ise anyị ji amata ihe. Ma e wezụga ìhè, ọhụhụ ụzọ mmadụ ga-afọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-abaghị uru. Ọ ga-afọ nke nta ka anyị kpuo ìsì. Otú ahụkwa ka uche mmadụ dị. O nwere ikike dị ịtụnanya ime ntụnyere, iche echiche, ma si otú ahụ kọwaa ihe ndị dị mgbagwoju anya. Ma, a chọkwuru ihe ọzọ iji kọwaa ihe omimi dị nsọ. Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ ịkọwa okwu ndị yiri ilu ndị e kwuru na Bible, nanị Onye dere ha, bụ́ Jehova, Chineke nke ìhè, pụrụ ikpughe ihe ha pụtara.—1 John 1:5.
N’ụzọ dị mwute, oké mpako na ọchịchọ nke inwere onwe ha adịghị ekwe ndị mmadụ mgbe mgbe ichere ka Jehova nye azịza. N’ịbụ ndị ihe omimi ahụ kpaliri mmasị ha, e nwere ndị bụ́ ndị, site n’ịchọ ihe ga-akpali ọgụgụ isi ha ma n’abụchaghị eziokwu, chọrọ azịza ndị na-adịghị n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, nkà mmụta ihe omimi nke ndị Juu ya na usoro okpukpe Cabala ya, tụlere ihe ọnụ ọgụgụ na mkpụrụ akwụkwọ nke mkpụrụ okwu Hibru pụtara ma e jiri majik nyochaa ha. N’aka nke ọzọ, ndị Gnostic nke narị afọ nke abụọ ji Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik mee ihe ná mgbalị nke ikpughe ihe ihe omimi ndị dị na ha pụtara.
Otú ọ dị, nnyocha nile dị otú ahụ dubakwuru ha n’ememe ndị ọgọ mmụọ ma ọ bụ nkwenkwe ụgha ma mee ka ha pụọ n’ebe eziokwu Chineke dị. ‘Eenụ, ọ bụrụ na ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa,’ ka ndị Gnostic tụgharịrị n’uche, ‘mgbe ahụ Onye Okike ya, bụ́ Yahweh, apụghị ịbụ ezi Chineke.’ Nke a ọ̀ bụ nkwubi okwu kasị mma ha pụrụ iru? Lee otú echiche mmadụ si ghara imi emi! Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi, n’ịlụ ọgụ megide echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ nke òtù ndị Gnostic mesịrị wulite, dọsiri aka ná ntị ike n’akwụkwọ ozi ya, sị: “Unu agabigala ihe e deworo n’akwụkwọ”!—1 Ndị Kọrint 4:6.
Ịkọwa “Okwu Ndị Na-edochaghị Anya”
Ma, n’ihi gịnị ka Chineke nke ìhè ga-eji na-ekwudị “okwu ndị na-edochaghị anya”? Ọdịdị nke okwu ndị yiri ilu na-anwale ikike mmadụ nwere iche echiche na iru ná nkwubi okwu. Ya mere, n’ịbụ ndị e tinyegasịrị n’Akwụkwọ Nsọ nile dị ka e si efesasị ihe na-eme ka nri tọọ ụtọ n’elu ezigbo nri, e ji ha mee ihe mgbe ụfọdụ nanị iji kpalie mmasị nke ndị na-agụ ya ma ọ bụ iji mee ka ozi e ziri dokwuo anya. N’ọnọdụ ndị a, a na-ejikarị nkọwa ha esochi ha.—Ezikiel 17:1-18; Matiu 18:23-35.
Jehova na-enye ihe ọmụma n’ụba ma ọ dịghị mgbe ọ bụ n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. (Jemes 1:5-8) Tụlee akwụkwọ Ilu, bụ́ ihe ndekọ nke ọtụtụ okwu mgbagwoju anya nke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ nke ụfọdụ nwere ike ile anya dị ka okwu ndị yiri ilu. Ịghọta ha na-ewe oge na ntụgharị uche. Ma mmadụ ole dị njikere itinye mgbalị ahụ? Ọ bụ nanị ndị dị njikere igwupụta ha na-enweta ihe ọmụma ndị dị na ha.—Ilu 2:1-5.
Jisọs jikwa ilu mee ihe iji kpughee ọnọdụ obi nke ndị na-ege ya ntị. Ìgwè mmadụ gbara ya gburugburu. Akụkọ ya tọrọ ha ụtọ. Ọrụ ebube ya masịrị ha. Ma, ọ̀ bụ mmadụ ole dị njikere ịgbanwe ụzọ ndụ ha ma soo ya? Lee ka ndị na-eso ụzọ Jisọs si dị iche, bụ́ ndị chọrọ ugboro ugboro ịghọta ozizi Jisọs ma jiri ọchịchọ obi jụ onwe ha iji ghọọ ụmụazụ ya!—Matiu 13:10-23, 34, 35; 16:24; Jọn 16:25, 29.
Ilegara Ìhè ahụ Anya
“Mmasị e nwere n’okwu ndị yiri ilu,” ka otu akwụkwọ na-ekwu, “yiri ka ya na oge oké iche echiche hà na-adabakọ.” Taa, anyị nwere oké ihe ùgwù nke ịdị ndụ n’oge ‘a ghaara ndị Chineke ìhè’ ime mmụọ. (Abụ Ọma 97:11; Daniel 12:4, 9) Ànyị pụrụ iji ndidi chere Jehova ka o kpughee nzube ya dị ka ọgụgụ oge ya si dị? Nke ka mkpa, ànyị na-eme ihe n’egbughị oge iji gbanwee ndụ anyị mgbe anyị matara otú anyị pụrụ isi kwekọkwuo n’uche Chineke e kpughere ekpughe? (Abụ Ọma 1:1-3; Jemes 1:22-25) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova ga-agọzi mgbalị anyị, ka mmụọ nsọ wee nwee ike ime ka anya nke uche anyị na-ahụ ọmarịcha onyinyo zuru ezu nke nzube Chineke nke ọma, na-eme ka ọhụhụ ụzọ ime mmụọ anyị ka mma, dị nnọọ ka ugegbe anya na-edozi anya na-ahụ inyoghi inyoghi.—1 Ndị Kọrint 2:7, 9, 10.
N’ezie, okwu ndị yiri ilu dị n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka Jehova pụta ìhè dị ka “[Onye] na-ekpughe ihe nzuzo nile.” (Daniel 2:28, 29) Ọzọkwa, ọ bụkwa Onye na-enyocha obi. (1 Ihe E Mere 28:9) O kwesịghị iju anyị anya ịmata na ikpughe ìhè nke eziokwu Chineke abụwo ihe na-agawanye n’ihu mgbe nile. (Ilu 4:18; Ndị Rom 16:25, 26) Kama ịchọ ihe ọmụma banyere ihe ndị dị omimi nke Chineke site na nkà mmụta ihe omimi ma ọ bụ amamihe mmadụ bụ́ nke na-emighị emi, bụ́ ndị pụrụ nanị iduga n’ihe efu, ka anyị jiri obi ike na-elegara Jehova Chineke anya ịmụkwasị ìhè nke eziokwu ‘n’okwu ya ndị na-edochaghị anya,’ na-eme ka ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi mata nzube ya ndị dị ebube n’oge ọ kara aka.—Emọs 3:7; Matiu 24:25-27.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 26]
Biblia Hebraica Stuttgartensia, Deutsche Bibelgesellschaft Stuttgart