“Nne Ewu Ọhịa Mara Mma”
MARA mma abụghị nkọwaaha ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ga-eji akọwa ewu. Anyị pụrụ iche banyere ewu dị ka anụ ndị bara uru, ndị pụrụ iri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla, ndị anyị si na ha enwetakwa anụ dị ụtọ na mmiri ara na-edozi ahụ—ma ọ ga-esiri anyị ike ịsị na ha mara mma.
Ka o sina dị, Bible na-akọwa nwunye dị ka “nne ele nke na-ahụ n’anya na nne ewu ọhịa mara mma.” (Ilu 5:18, 19) Solomọn, bụ́ onye dere akwụkwọ Ilu, bụ onye ji oké mmasị kirie anụ ọhịa ndị nọ n’Israel, ya mere n’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, e nwere ezi ihe mere o ji jiri okwu ntụnyere a mee ihe. (1 Ndị Eze 4:30-33) Ikekwe, dị ka nna ya bụ́ Devid, o kiriwo nne ewu ọhịa ndị na-abịakarị n’ógbè ahụ dị gburugburu En-gedi, nke dị nso n’ikperé mmiri Osimiri Nwụrụ Anwụ.
Obere ìgwè nne ewu ọhịa ndị bi n’Ọzara Judia dị nso na-abịakarị n’isi iyi nke En-gedi. Ebe ọ bụ nanị ebe a pụrụ isi nweta mmiri dị mma n’ala a kpọrọ nkụ, En-gedi abụrụwo ebe nne ewu ọhịa na-enwekarị mmasị ije ṅụọ mmiri na ya eri ọtụtụ narị afọ. N’ezie, o yiri ka aha ahụ bụ́ En-gedi ọ̀ pụtara “isi mmiri nke nwa ewu,” bụ́ ihe na-agba akaebe na ụmụ ewu na-anọkarị n’ebe a. Eze Devid nwetara nchebe n’ebe a pụọ ná mkpagbu nke Eze Sọl, n’agbanyeghị na ọ ghaghị ibi dị ka onye gbara ọsọ ndụ “n’elu oké nkume nke ewu ọhịa.”—1 Samuel 24:1, 2.
N’En-gedi, ị ka pụrụ ikiri nne ewu ọhịa ka ọ na-eji ụzọ dị nwayọọ na nlezianya na-agbadata ebe ndịda dị nkume nkume ka ọ na-eso mkpi na-aga na mmiri ahụ. Mgbe ahụ ị pụrụ ịmalite ịghọta ntụnyere ahụ e ji nne ewu ọhịa tụnyere nwunye na-eguzosi ike n’ihe. Ọdịdị nwayọọ ya na àgwà ọma ya na-egosikwa akparamàgwà ọma nke onye bụ́ nwanyị. Ihe àmà na-egosi na okwu ahụ bụ́ “mara mma” na-ezo aka n’ọdịdị dị nwayọọ na nke mara mma nke nne ewu ọhịa.a
Nne ewu ọhịa aghaghị ịgbasi ike ma dị nwayọọ. Dị ka Jehova gwara Job, nne ewu ọhịa na-amụ nwa na nkume ndị dị elu, n’ebe dị nkume nkume, nke mmadụ na-apụghị iru bụ́ ebe nri pụrụ ịdị ụkọ, nke na-ekpobigakwa ọkụ ókè. (Job 39:1) N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, ọ na-elekọta ụmụ ya ma na-akụziri ha ịrị na ịwụkwasị n’elu nkume ndị ahụ n’ụzọ dị nkọ dị ka ya onwe ya si eme. Nne ewu ọhịa na-ejikwa obi ike echebe ụmụ ya pụọ n’anụ ndị na-eri ibe ha. Otu onye na-ekiri ụmụ anụmanụ hụrụ ka nne ewu ọhịa na-alụso ugo ọgụ ruo ọkara awa, ebe nwa ya hudara n’okpuru ya maka nchebe.
Ndị Kraịst bụ́ nwunye na nne, na-azụkarị ụmụ ha n’ọnọdụ ndị siri ike mgbe mgbe. Dị ka nne ewu ọhịa, ha na-egosipụta na ha ji obi ha nile na achọghị ọdịmma onwe onye nanị elekọta ibu ọrụ Chineke nyere ha. Ha na-ejikwa obi ike na-agbalịsi ike ichebe ụmụ ha pụọ n’ihe ize ndụ ime mmụọ. Ya mere, n’abụtụghị iwetu ndị inyom ala site n’iji okwu ntụnyere a mee ihe, ihe Solomọn nọ na-eme n’ezie bụ ịdọta uche n’ịdị nwayọọ na ịma mma nke nwanyị—àgwà ime mmụọ ndị na-apụta ìhè ọbụna na gburugburu ebe ihe kasị sie ike.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka The New Brown-Driver-Briggs-Gesenius Hebrew and English Lexicon si kwuo, n’ihe a na-ekwu banyere ya n’ebe a, okwu Hibru bụ́ chen, nke a sụgharịrị ịbụ “mara mma,” pụtara ‘ịdị nwayọọ na ịdị mma nke àgwà na ọdịdị.’
[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]
Onye Kraịst bụ́ nwunye na nne na-egosipụta àgwà ime mmụọ ndị mara mma mgbe ọ na-arụzu ibu ọrụ ndị Chineke nyere ya