Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 10/1 p. 32
  • Ì Nwere Ezi Uche?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Ezi Uche?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 10/1 p. 32

Ì Nwere Ezi Uche?

MGBE Mosis na-ahọpụta ndị ikpe Israel, ọ gbalịsiri ike ịchọta “ndị ikom maara ihe, ndị nwekwara [ezi uche na ahụmahụ, NW].” (Deuterọnọmi 1:13) Ahụmahụ, bụ́ nke ya na afọ ndụ na-agakọ, abụghị nanị ihe a chọrọ. Amamihe na inwe ezi uche dịkwa mkpa.

Onye nwere ezi uche na-ama ụzọ dị mma isi na-ekwu okwu na isi na-eme omume. Dị ka Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary si kwuo, onye nwere ezi uche ‘nwekwara ike iji akọ nọgide na-agbachi nkịtị.’ Ee, e nwere “mgbe ikwu okwu,” e nwekwara “mgbe ịgba nkịtị,” onye nwekwara ezi uche na-aghọta ọdịiche dị n’etiti ha. (Eklisiastis 3:7) Mgbe mgbe, a na-enwe ezi ihe mere a ga-eji gbachi nkịtị, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.”—Ilu 10:19.

Ndị Kraịst na-elezi anya ịbụ ndị na-egosipụta ezi uche n’ụzọ ha si emeso ibe ha ihe. Onye na-ekwukarịsị okwu mgbe mgbe ma ọ bụ onye kasị eji ike ekwu okwu adịghị abụkarị onye kasị mkpa ma ọ bụ onye kasị baa uru. Cheta na Mosis “dị ike n’okwu ya,” ma ọ pụghị iduzi mba Israel nke ọma ruo mgbe ọ zụlitere ndidi, ịdị nwayọọ n’obi, na njide onwe onye. (Ọrụ 7:22) Ya mere, ndị e nyefere ikike n’ebe ndị ọzọ nọ aghaghị ịgbalịsi ike karịsịa ịdị umeala n’obi na igosipụta ezi uche.—Ilu 11:2.

N’Okwu Chineke, a kọwara ndị ahụ Jisọs Kraịst nyefeworo “ezinụlọ ya” dị ka ‘ndị kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa uche.’ (Matiu 24:45-47) Ha adịghị eji omume nke amaghị ebe ike ha ruru anwa ibutere Jehova ụzọ na-adabere ná mkpali ha nwere na mberede; ha adịghịkwa ala azụ mgbe ntụziaka Chineke nyere n’ihe, doro anya. Ha maara mgbe bụ oge ikwu okwu na mgbe bụ oge ịgba nkịtị ma chere maka inwetakwu nkọwa. Ndị Kraịst nile ga-eme nke ọma ọ bụghị nanị iṅomi okwukwe ha kamakwa igosipụta onwe ha dị ka ndị nwere ezi uche, dị ka òtù ohu ahụ na-eme.—Ndị Hibru 13:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya