Chọọchị Na Ọchịchị na Byzantium
ONYE guzobere Iso Ụzọ Kraịst kwuru nnọọ ihe doro anya banyere ọdịiche pụtara ìhè nke kwesịrị ịdị n’etiti ụmụazụ ya na ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.” (Jọn 15:19) Jizọs gwara Paịlet, bụ́ onye nnọchianya nke ike ọchịchị nke oge ya, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a.”—Jọn 18:36.
Iji rụzuo ọrụ e nyere ha bụ́ ime nkwusa “ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa,” Ndị Kraịst aghaghị izere ịbụ ndị ihe omume ụwa na-adọrọ uche ha. (Ọrụ 1:8) Dị ka Jizọs, Ndị Kraịst oge mbụ agaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 6:15) O doro anya na Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi anọghị n’ọkwá ọchịchị. Nke a mesịrị gbanwee.
“Akụkụ nke Ụwa”
Obere oge ka onye ikpeazụ n’ime ndịozi nwụsịrị, ndị ndú okpukpe ji obi ha malite ịgbanwe echiche ha banyere onwe ha na ụwa. Ha malitere iche banyere otu “alaeze” nke, ọ bụghị nanị na ọ nọ n’ụwa kamakwa, bụrụ akụkụ ya. Ileba anya n’otú okpukpe na ọchịchị si nwee njikọ n’Alaeze Ukwu nke Byzantium—Alaeze Ukwu nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Rom, nke isi obodo ya dị na Byzantium (Istanbul ugbu a)—ga-akụziri anyị ihe.
N’ọha mmadụ ebe okpukpe keere nnọọ òkè dị ukwuu, Chọọchị Byzantium, nke hiwere isi na Byzantium, kpara ike dị egwu. Ọkọ akụkọ ihe mere na chọọchị, bụ́ Panayotis Christou, kwuru n’otu mgbe, sị: “Ndị Byzantium lere alaeze ukwu ha dị n’ụwa anya dị ka ihe nnọchianya nke Alaeze Chineke.” Otú ọ dị, ndị ọchịchị nke alaeze ukwu ahụ anọgideghị na-enwe echiche dị otú ahụ. N’ihi ya, mmekọrịta dị n’etiti Chọọchị na Ọchịchị bịara bụrụ ọgụ na mgba mgbe ụfọdụ. Akwụkwọ bụ́ The Oxford Dictionary of Byzantium, na-asị: “Ndị bishọp nke Constantinople [ma ọ bụ Byzantium] gosipụtara àgwà dị iche iche, gụnyere iji ụjọ na-edo onwe ha n’okpuru onye ọchịchị dị ike . . . , iso onye eze ukwu jikọọ aka n’ụzọ gara nke ọma . . . , na iji anya ike guzogide uche onye eze ukwu.”
Onyeisi ndị bishọp nke Constantinople, bụ́ onyeisi Chọọchị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ghọrọ onye a na-akwanyere ùgwù dị ukwuu. Ọ bụ ya na-echi onye eze ukwu echichi, n’ihi ya na-atụ anya ka ọ bụrụ onye ga na-akwadosi Chọọchị Ọtọdọks ike. Onyeisi ndị bishọp na-abakwa ọgaranya nke ukwuu, ebe ọ bụ na ọ bụ ya ka nnukwu ihe onwunwe nke chọọchị dị n’aka. O nwere ikike n’ebe imerime ndị mọnk nọ otú o si nwee mmetụta n’ebe ndị nkịtị nọ.
Onyeisi ndị bishọp na-anọkarị n’ọnọdụ nke iguzogide eze ukwu. Ọ pụrụ iyi ya egwu ịchụpụ ya—na-eji aha Chineke amanye ya ime uche ya—ma ọ bụ na-eji ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi chụtuo eze ukwu mee ihe.
Ka ike ọchịchị na-enwe n’ebe ndị na-abụghị n’isi obodo ji nwayọọ nwayọọ na-ebelata, ndị bishọp bịara ghọọ mgbe mgbe, ndị kasị ike n’obodo ha, na-enwe ike ha ka nke ndị gọvanọ na-achị ógbè, bụ́ ndị ha na-enye aka ahọpụta. Ndị bishọp na-eleba anya n’okwu ikpe, na-etinyekwa aka n’azụmahịa mgbe ọ bụla o metụtara chọọchị—nakwa mgbe ụfọdụ ọ na-emetụtaghị ya. Ihe so akpata ya bụ na ndị ụkọchukwu na ndị mọnk, bụ́ ndị nọcha n’okpuru bishọp nke ógbè ha, ruru ọtụtụ iri puku.
Ọchịchị na Ịzụ Ọkwá
Dị ka ihe e kwuru n’elu na-egosi, ọkwá onye ụkọchukwu ghọrọ nke e jikọtara ya na ọchịchị n’ụzọ a na-apụghị ikewa ekewa. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ihe omume okpukpe ha dị iche iche furu ego buru ibu. Ihe ka ọtụtụ ná ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá dị elu biri ndụ okomoko. Ka chọọchị na-enweta ike na akụ̀ na ụba, ịda ogbenye na ịdị nsọ nke ndịozi kwụsịrị ịdị irè. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị bishọp kwụrụ ụgwọ maka nhọpụta ha. Ịzụ ọkwá ghọrọ ihe a na-emekarị ruo n’ọkwá kasị elu. Ndị ụkọchukwu ndị aka ji akụ̀ na-akwado zọrọ ọkwá chọọchị dị iche iche n’ihu onye eze ukwu.
Iri ngo sokwa n’ụzọ e si enweta ndị ndú okpukpe nọ n’ọkwá dị elu. Mgbe Eze Ukwu Nwanyị bụ́ Zoe (ihe dị ka 978-1050 O.A.) mere ka e gbuo di ya bụ́ Romanus nke Atọ ma chọọ ịlụ enyi ya nwoke nke gajekwa ịghọ Eze Ukwu Michael nke Anọ, o mere ngwa ngwa kpọọ Onyeisi Ndị Bishọp bụ́ Alexius ka ọ bịa n’obí eze. N’ebe ahụ ka onyeisi ndị bishọp matara banyere ọnwụ Romanus na ememe agbamakwụkwọ a chọrọ ka o duzie. Na chọọchị na-eme ememe Friday Ọma n’uhuruchi ahụ emeghị ka ihe dịrị Alexius mfe. Otú ọ dị, ọ naara nnukwu onyinye eze ukwu nwanyị ahụ nyere ya ma meere ya ihe ọ rịọrọ.
Ịnọ n’Okpuru Eze Ukwu
N’akụkọ ihe mere eme nke Alaeze Ukwu Byzantium, mgbe ụfọdụ, eze ukwu na-eji ike o nwere n’ezie ime nhọpụta eme ihe mgbe a bịara n’ịhọrọ onye ga-abụ onyeisi ndị bishọp nke Constantinople. N’oge ndị dị otú ahụ, ọ dịghị onye pụrụ ịghọ onyeisi ndị bishọp ma ọ bụ nọtee aka n’ọkwá ahụ ma ọ bụrụ na onye eze ukwu achọghị ya.
Eze Ukwu Andronicus nke Abụọ (1260-1332) hụrụ mkpa ọ dị ịgbanwe ndị isi ndị bishọp ugboro itoolu. N’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ebumnobi ya bụ ịhụ na ọ bụ onye ga-akasị ekwenyere ya nọ n’ọkwá onyeisi ndị bishọp. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Byzantines si kwuo, ọbụna otu onyeisi ndị bishọp kwere eze ukwu nkwa n’akwụkwọ o degaara ya “ime ihe ọ bụla ọ chọrọ, n’agbanyeghị otú o si megide iwu, na izere ime ihe ọ bụla ga-ewute ya.” Ndị eze ukwu gbalịrị ugboro abụọ ịmanye chọọchị ime ihe ha chọrọ site n’ime onye si n’ezinụlọ ndị eze ukwu onyeisi ndị bishọp. Eze Ukwu Romanus nke Mbụ bugoro nwa ya bụ́ Theophylact, onye dị nanị afọ 16, n’ọkwá onyeisi ndị bishọp.
Ọ bụrụ na onyeisi ndị bishọp emeghị ihe ọ chọrọ ka o mee, ọ pụrụ ịmanye ya ịrịtu ma ọ bụ nye nzukọ ndị isi chọọchị ntụziaka ịchụtu ya. Akwụkwọ bụ́ Byzantium na-ekwu, sị: “Ka akụkọ ihe mere nke ndị Byzantium na-aga nnọọ n’ihu, ndị nọ n’ọkwá ọchịchị ka elu na ọbụna Eze Ukwu kpọmkwem [bịara] kere òkè dị ukwuu n’ịhọrọ ndị ga-abụ ndị bishọp.”
Ka onyeisi ndị bishọp nọ ya n’akụkụ, onye eze ukwu na-eduzi nzukọ nke kansụl chọọchị. Ọ na-eduzi arụmụka, na-atụpụta ụkpụrụ okpukpe, ma na-eso ndị bishọp arụrịta ụka tinyere ndị jụrụ okwukwe bụ́ ndị ọ bụ ya ga-ekwubi ihe a ga-eme ha—mkpọgbu n’elu osisi. Onye eze ukwu na-abịanyekwa aka n’ụkpụrụ ndị a tụrụ na kansụl ndị ahụ ma na-ahụ na a gbasoro ha. Ọ bụghị nanị na ọ na-ebo ndị guzogidere ya ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru kama ọ na-ebokwa ha ebubo ịbụ ndị iro chọọchị na Chineke. “Ọ dịghị ihe a ga-eme na Chọọchị nke ga-emegide uche na iwu nke Eze Ukwu,” ka otu onyeisi ndị bishọp na narị afọ nke isii kwuru. N’ozuzu ha, ndị bishọp nọ n’obí eze—ndị na-adị nnọọ ngwa ikwenye ihe ọ bụla e kwuru, ndị dịkwa mfe iji ihu ọma na akọ zụta—emeghị mkpesa otú ndị ka ha n’ọkwá na-emeghị.
Dị ka ihe atụ, mgbe Onyeisi Ndị Bishọp bụ́ Ignatius (ihe dị ka 799-878 O.A.) jụrụ inye Minista Ukwu bụ́ Bardas oriri nsọ, onye minista ahụ megwaara. Bardas boro Ignatius ebubo na aka ya di n’ihe a sị na ọ bụ nkata arụrụala na ịgba ọchịchị mgba okpuru. E jidere onyeisi ndị bishọp ahụ ma chụga ya mba ọzọ. Iji dochie anya ya, onye minista ahụ mere ka a họpụta Photius, bụ́ onye nkịtị nke rịruru n’ọkwá nile nke chọọchị n’ime ụbọchị isii, ma mesịa ruo n’ọkwá onyeisi ndị bishọp. Photius ò ruru eru maka ọkwá onyeisi ndị bishọp ahụ? A kọwawo ya dị ka nwoke “nwere oké ọchịchọ, onye dị mpako gabiga ókè, na onye kasị bụrụ aka ochie n’ihe banyere ọchịchị.”
Ozizi Na-ejere Ọchịchị Ozi
Mgbe mgbe, a na-eji arụmụka ndị e nwere banyere ozizi ndị Ọtọdọks na ozizi nduhie ezochi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe ndị metụtara ọchịchị kama ịbụ ọchịchọ iwebata ozizi ndị dị ọhụrụ nwekwara mmetụta n’ebe ọtụtụ ndị eze ukwu nọ. N’ikwu ya n’ozuzu, ọ bụ nanị eze ukwu nwere ikike ikwu ihe ga-abụ ozizi na ịmanye chọọchị irube isi n’iwu ya.
Dị ka ihe atụ, Eze Ukwu Heraclius (575-641 O.A.) gbalịsiri ike idozi esemokwu a na-enwe n’ihe banyere ọdịdị Kraịst bụ́ nke chọrọ ikewa alaeze ukwu ya chọwarala itisa etisa. N’ịgbalị ime udo, o webatara ozizi ọhụrụ a kpọrọ Ozizi Otu Uche.a Ijizi jide n’aka na ógbè ndị dị n’ebe ndịda nke alaeze ukwu ya ga-erubere ya isi, Heraclius họọrọ Cyrus nke Phasis, bụ́ onye nabatara ozizi ahụ eze ukwu ahụ kwadoro, ịbụ onyeisi ndị bishọp ọhụrụ nke Aleksandria. Ọ bụghị nanị onyeisi ndị bishọp ka eze ukwu ahụ mere Cyrus kama o mere ya onye ga na-elekọta Ijipt, na-enye ya ikike n’elu ndị ọchịchị nọ n’ebe ahụ. Mgbe Cyrus kpagbutụrụ chọọchị nke Ijipt, o nwetara nkwado nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha.
Iweta Ajọ Ihe n’Ubi
Olee otú ihe ndị a merenụ pụrụ isi gosipụta okwu na mmụọ nke ekpere Jizọs bụ́ ebe o kwuru na ụmụazụ ya agaghị ‘abụ akụkụ nke ụwa’?—Jọn 17:14-16.
Ndị sị na ha bụ́ ndị ndú Ndị Kraịst n’oge Byzantium nakwa mgbe ọ gasịrị anatawo ajọ ụgwọ ọrụ n’ihi aka ha tinyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha nke ụwa. Gịnị ka ntụle a dị mkpirikpi a tụlere akụkọ ihe mere eme na-agwa gị? Ndị ndú nke Chọọchị Byzantium hà nwetara ihu ọma Chineke na nke Jizọs Kraịst?—Jems 4:4.
Ezi Iso Ụzọ Kraịst eritebeghị uru site n’aka ndị ndú okpukpe dị otú ahụ nwere oké ọchịchọ na ndị iko ha bụ́ ndị ọchịchị. Ngwakọta a rụrụ arụ nke okpukpe na ọchịchị enyewo echiche na-ezighị ezi banyere okpukpe dị ọcha nke Jizọs kụziri. Ka anyị mụrụ ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga ma nọgide ‘n’abụghị akụkụ nke ụwa.’
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ozizi Otu Uche na-ekwu na ọ bụ ezie na Kraịst nwere ọdịdị abụọ nke dị ka nke Chineke na nke dị ka nke mmadụ, o nwere otu uche.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]
“DỊ KA Ọ BỤ CHI NKE NA-EJEGHARỊ N’IHU IGWE”
Ihe ndị metụtara Onyeisi Ndị Bishọp bụ́ Michael Cerularius (ihe dị ka 1000-1059), bụ ihe atụ nke òkè ndị isi chọọchị pụrụ ikere n’ihe ndị metụtara Ọchịchị nakwa oké ọchịchọ ha ji eme ihe. Mgbe Cerularius rusịrị n’ọkwá onyeisi ndị bishọp, ọ chọkwuru ọkwá ka elu. A kọwawo ya dị ka onye okomoko, onye mpako, na onye na-adịghị ekwe ekwe—“onye àgwà ya na-eme ka ọ dị ka ọ bụ chi nke na-ejegharị n’ihu igwe.”
N’ihi ọchịchọ ya ibuli onwe ya n’ọkwá, Cerularius kpatara nkewa nke ya na popu nọ na Rom na 1054, na-arụgide eze ukwu ịnakwere nkewa ahụ. N’inwe obi ụtọ n’ihi mmeri a, Cerularius mere ndokwa ime ka Michael nke Isii rịkwasị n’ocheeze ma nyere ya aka ime ka ọchịchị ya sikwuo ike. Otu afọ ka e mesịrị, Cerularius manyere eze ukwu ahụ ịrịtu ma mee ka Isaac Comnenus (ihe dị ka 1005-1061) rịgoro n’ocheeze ahụ.
Nsogbu dị n’etiti ndị isi ndị bishọp na ndị eze ukwu kara njọ. Cerularius—n’ijide n’aka na ọ ga-enweta nkwado nke ọha na eze—yiri egwu, nye iwu, ma jiri ike mee ihe. Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke biri ndụ n’oge ahụ kwuru, sị: “O ji okwu mkparị kwuo banyere ọdịda nke Eze Ukwu ahụ ga-ada na-asị, ‘Ebuliri m gị elu, nwa anụ ọhịa; ma m ga-akwatu gị.’” Otú ọ dị, Isaac Comnenus mere ka e jide ya, tụọ ya mkpọrọ, ma chụga ya Imbros.
Ihe atụ ndị dị otú ahụ na-egosi otú nsogbu onyeisi ndị bishọp nke Constantinople kpatara haruru na otú o jiruru anya ike guzogide onye eze ukwu. Ọtụtụ mgbe, ndị eze ukwu mesiri ndị ikom dị otú ahụ ike, bụ́ ndị bụ́ aka ochie na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nwee ike iguzogide ma eze ukwu ma ndị agha.
[Map/Foto dị na peeji nke 9]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ọ̀tụ̀tụ̀ Kasị Elu nke Alaeze Ukwu Byzantium
Ravenna
Rom
MASEDONIA
Constantinople
Oké Osimiri Ojii
Nicaea
Efesọs
Antiọk
Jeruselem
Aleksandria
Oké Osimiri Mediterenian
[Ebe E Si Nweta Foto]
Map: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.
[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]
Comnenus
Romanus nke Atọ (n’aka ekpe)
Michael nke Anọ
Eze Ukwu Nwanyị bụ́ Zoe
Romanus nke Mbụ (n’aka ekpe)
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Comnenus, Romanus nke Atọ, na Michael nke Anọ: Site n’aka Classical Numismatic Group, Inc.; Eze Ukwu Nwanyị bụ́ Zoe: Hagia Sophia; Romanus nke Mbụ: Foto si n’aka Harlan J. Berk, Ltd.
[Foto ndị dị na peeji nke 12]
Photius
[Foto ndị dị na peeji nke 12]
Heraclius na nwa ya nwoke
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Heraclius na nwa ya nwoke: Foto site n’aka Harlan J. Berk, Ltd.; ihe nile e ji chọọ ya mma, peeji nke 8-12: Site n’akwụkwọ bụ́ L’Art Byzantin III Ravenne Et Pompose