Ị̀ Pụrụ Ikwere na Paradaịs Elu Ala?
MMADỤ ole na ole kweere na ụwa ga-emesị ghọọ paradaịs. Ọtụtụ na-eche na ọ gaghị nnọọ adịgide adịgide. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Sacred Earth nke Brian Leigh Molyneaux dere si kwuo, ụwa a bịara dịrị n’ihi ‘oké mgbawa nke mbara igwe’ bụ́ nke gbawara ọtụtụ nde afọ gara aga. Ọ bụrụkwa na mmadụ n’onwe ya ebibighị ụwa, ọtụtụ ndị kweere na ya na eluigwe na ala dum pụrụ imecha “fụkọtaghachi ghọọ ihe gbara gburugburu na-acha ọkụ ọkụ.”
Onye England na-ede uri nke narị afọ nke 17 onye aha ya bụ John Milton enweghị echiche dị otú ahụ na-egosi enweghị olileanya. N’uri oge ochie ya bụ́ Paradise Lost, o dere na Chineke kere ụwa ka ọ bụrụ ebe obibi paradaịs maka ezinụlọ mmadụ. A tụfuru Paradaịs mbụ ahụ. Otú ọ dị, Milton kwetara na a ga-eweghachi ya—na otu ụbọchị, onye mgbapụta nke bụ́ Jizọs Kraịst “ga-akwụghachi ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya ụgwọ ọrụ, nabatakwa ha n’ọṅụ zuru okè . . . n’Eluigwe ma ọ bụ n’Ụwa.” Milton ji obi ike kwuo, sị: “N’ihi na mgbe ahụ, Ụwa nile ga-abụ Paradaịs.”
Paradaịs—N’eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Ụwa?
Ọtụtụ okpukpe kwenyere n’echiche Milton na ha ga-emecha nweta ụgwọ ọrụ n’ihi nhụjuanya na ihe mgbu ndị ha nagideworo n’ụwa a. Ma n’ebee ka ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ? Ọ̀ ga-abụ ‘n’Eluigwe ka ọ̀ bụ n’Ụwa’? Nye ụfọdụ, ụwa adịghị abata ha n’uche ma ọlị. Ha na-ekwu na ụmụ mmadụ ga-enwe “ọṅụ zuru okè” nanị mgbe ha hapụrụ ụwa ma biri n’ebe obibi ndị mmụọ n’eluigwe.
N’akwụkwọ bụ́ Heaven—A History, ndị edemede bụ́ C. McDannell na B. Lang kwuru na ọkà mmụta okpukpe nke narị afọ nke abụọ bụ́ Irenaeus kweere na ndụ n’ime paradaịs e weghachiri eweghachi “agaghị abụ n’ógbè dị anya n’eluigwe, kama n’ụwa.” Dị ka akwụkwọ ahụ si kwuo, ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe dị ka John Calvin na Martin Luther tụrụ anya ịga eluigwe, ha kwetakwara na “Chineke ga-eme ka ụwa dịghachi ọhụrụ.” Ndị òtù okpukpe ndị ọzọ nwekwara nkwenkwe yiri nke ahụ. McDannell na Lang kwuru na ụfọdụ ndị Juu kwenyere na n’oge Chineke, “a ga-ewepụ” ihe isi ike nile nke mmadụ, “e biekwa ndụ nwere nzube n’ụwa.” Dị ka nkwenkwe ndị Peasia oge ochie si dị, “a ga-eweghachi ụwa n’ịma mma mbụ ya, ụmụ mmadụ ga-amaliteghachikwa ibi n’udo,” ka The Encyclopædia of Middle Eastern Mythology and Religion kwuru.
Oleezi banyere olileanya nke paradaịs elu ala? È kere anyị ịdị ndụ n’ụwa ruo nanị nwa oge? Dị ka onye Juu bụ́ ọkà ihe ọmụma na narị afọ mbụ, bụ́ Philo, si kwuo, ọ̀ ga-abụ nanị “ihe omume na-adịru nwa oge, nke na-ejupụtakarị ná nsogbu” na njem anyị na-eme ịga n’ógbè ndị bụ́ mmụọ? Ka ọ̀ dị ihe ọzọ Chineke bu n’obi mgbe o kere ụwa ma tinye ụmụ mmadụ na ya n’ọnọdụ paradaịs? Ihe a kpọrọ mmadụ ọ̀ pụrụ ịchọta ezi afọ ojuju ime mmụọ na ọṅụ zuru okè n’ụwa ebe a? Gịnị ma ị tụlee ihe Bible nwere ikwu n’okwu a? Ị pụrụ ikpebi, dị ka ọtụtụ nde ndị ọzọ kpebiworo, na inwe olileanya maka ụwa paradaịs e weghachiri eweghachi bụ ihe ezi uche dị na ya n’ezie.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ode uri bụ́ John Milton kwetara na a ga-eweghachi Paradaịs
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 2]
IHU AKWỤKWỌ: Ụwa: Ụlọ Ọrụ U.S. Na-ahụ Maka Azụ na Anụ Ndị Bi n’Ọhịa, Washington, D.C./NASA
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 3]
Ụwa: Ụlọ Ọrụ U.S. Na-ahụ Maka Azụ na Anụ Ndị Bi n’Ọhịa, Washington, D.C./NASA; John Milton: Leslie’s