‘O Yiri Nkume Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Na-acha Ọbara Ọbara’
JỌN onyeozi hụrụ ọhụụ nke otu ocheeze dị ebube nke dị n’eluigwe. Onye nọ n’ocheeze ahụ “yiri . . . nkume jaspa.” O yikwara “nkume dị oké ọnụ ahịa nke na-acha ọbara ọbara.” (Mkpughe 4:2, 3) Olee ụdị nkume ndị a na-ekwu okwu ha?
Ha abụghị nkume ndị ìhè na-apụghị ịgafe na ha bụ́ ndị elu ha na-egbuke egbuke. N’oge ochie, e ji okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “jaspa” kọwaa nkume ndị nwere àgwà dị iche iche, gụnyere nkume ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị ìhè pụrụ ịgafe na ha. A. T. Robertson kwuru n’akwụkwọ bụ́ Word Pictures in the New Testament na “nkume jaspa” nke Mkpughe 4:3 “apụtụghị [ịbụ] jaspa dị ọnụ ala e nwere n’oge anyị a.” Ọzọkwa, n’isi akwụkwọ ndị ikpeazụ nke Mkpughe, Jọn kọwara obodo eluigwe, bụ́ Jeruselem, na-asị: “Mgbukepụ ya dị ka nkume dị nnọọ oké ọnụ ahịa, dị ka nkume jaspa nke na-enwupụ nke ọma.” (Mkpughe 21:10, 11) O yiri ka nkume ndị ahụ Jọn onyeozi na-ekwu banyere ha hà bụ ndị ìhè pụrụ isi na ha gafee.
Onye ahụ e gosiri n’ụzọ ihe atụ dị ka onye nọ n’ocheeze n’ọhụụ Jọn bụ Onye kasị dị ebube n’eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke. Ọ bụ ya bụ onye kasị dị ọcha ma dị nsọ. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ọchịchịrị ma ọlị.” (1 Jọn 1:5) N’ihi ya, Jọn gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ‘ime onwe ha ka ha dị ọcha dị nnọọ ka Jehova dị ọcha.’—1 Jọn 3:3.
Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ ndị Chineke ga-ele anya dị ka ndị dị ọcha? Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị nwee okwukwe n’ọbara Kraịst wụsịrị maka mgbaghara nke mmehie anyị. Anyị aghaghịkwa ịnọgide “na-eje ije n’ìhè ahụ” site n’ịmụchi Bible anya na ibi ndụ kwekọrọ na ya.—1 Jọn 1:7.