Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 3/15 p. 30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 3/15 p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Oriri Devid na ụmụ okorobịa ya riri achịcha nsọ ọ̀ na-egosi na a pụrụ imebi iwu Chineke n’ọnọdụ ndị tara akpụ n’enwetaghị ntaramahụhụ?—1 Samuel 21:1-6.

Dị ka Levitikọs 24:5-9 si kwuo, ọ bụ ndị nchụàjà ga-eri achịcha nsọ ndị ahụ a na-edochi kwa Ụbọchị Izu Ike. Ụkpụrụ na-achịkwa otú a e si eji ya eme ihe bụ na achịcha ndị ahụ dị nsọ ma bụrụ nke ndị na-arụ ọrụ Chineke—ndị nchụàjà—ga-eri. Inye ha onye ọrụ nkịtị ma ọ bụ mmadụ iri ha nanị iji mee onwe ya obi ụtọ ga-abụ nnọọ ihe na-ekwesịghị ekwesị. Otú ọ dị, onye nchụàjà bụ́ Ahimelek emeghị mmehie n’inye Devid na ụmụ okorobịa ya achịcha nsọ.

O yiri ka Devid ọ̀ nọ n’ozi pụrụ iche Eze Sọl dunyere ya. Agụụ na-agụ Devid na ụmụ okorobịa ya. Ahimelek chọpụtara na ha dị ọcha. Ọ bụ ezie na a gbasowechaa mkpụrụ akwụkwọ nke Iwu ahụ, ha iri achịcha nsọ ndị ahụ ekwesịghị ekwesị, o kwekọrọ n’ihe bụ́ isi e ji achịcha nsọ ahụ eme. Ịtụle nke a mere ka Ahimelek ghara ịgbasowecha mkpụrụ akwụkwọ nke Iwu ahụ. Ọbụna Jizọs Kraịst ji ihe a merenụ gosi na ụzọ siri ike ndị Farisii chọrọ ka e si na-edebe iwu Ụbọchị Izu Ike ekwesịghị ekwesị.—Matiu 12:1-8.

Otú ọ dị, ihe ndị e kwuru n’elu apụtaghị na a pụrụ imebi iwu Chineke mgbe ọnọdụ tara akpụ. Dị ka ihe atụ, ọnọdụ yiri ka ò siri ike bilitere mgbe ndị dike nke Izrel na-alụso ndị Filistia agha. Eze Sọl kwuru, sị: “Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke na-eri nri ruo anyasị, ruokwa mgbe m bọsịrị ọ́bọ̀ n’ahụ́ ndị iro m.” Bible na-ekwu, sị: “Ha wee tigbuo ụfọdụ n’ime ndị Filistia n’ụbọchị ahụ.” Ike gwụrụ ndị agha ahụ, agụụ gụkwara ha, ‘ha wee malite igbu ụmụ anụmanụ n’ala ahụ wee rie ha na ọbara.’ (1 Samuel 14:24, 31-33) Ha mehiere megide Jehova site n’imebi iwu ya n’ihe metụtara ọbara. Ihe ha mere ekwekọghị na nanị ihe Chineke kwuru na a ga-eji ọbara na-eme, nke bụ́ ‘iji kpuchie’ mmehie. (Levitikọs 17:10-12; Jenesis 9:3, 4) Site n’obi ebere ya, Jehova nabatara àjà pụrụ iche a chụrụ maka ndị mehierenụ.—1 Samuel 14:34, 35.

Ee, Jehova na-atụ anya ka anyị rube isi n’iwu ya n’ọnọdụ ọ bụla. “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara,” ka Jọn onyeozi na-ekwu, “ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.”—1 Jọn 5:3.

[Foto dị na peeji nke 30]

A na-edebe achịcha nsọ ndị ọhụrụ n’ime ụlọikwuu ahụ kwa Ụbọchị Izu Ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya