Sayensị Na Bible Hà Na-emegiderịta Onwe Ha n’Ezie?
IHE ndị kpatara esemokwu ahụ dị n’etiti Galileo na Chọọchị Katọlik mere ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Copernicus na Galileo. Ndị Gris oge ochie nakweere echiche nke ụwa ịdị n’etiti mbara igwe, ọkà ihe ọmụma bụ́ Aristotle (384-322 T.O.A.) na onye na-enyocha mbara igwe na onye na-agụ kpakpando bụ́ Ptolemy (narị afọ nke abụọ O.A.), mekwara ka o wuo ewuo.a
Ọ bụ echiche onye Gris bụ́ ọkà ná mgbakọ na mwepụ, nke bụ́kwa ọkà ihe ọmụma bụ́ Pythagoras (narị afọ nke isii T.O.A.) kpaliri Aristotle inwe echiche o nwere banyere eluigwe na ụwa. N’ịnabata echiche Pythagoras nke bụ́ na ihe gbara okirikiri bụ ihe zuru okè, Aristotle kweere na mbara igwe bụ ihe ndị gbara okirikiri dịcha n’ime ibe ha, dị ka mkpo dị iche iche nke otu yabasị. E ji kristal mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ gbara okirikiri, ụwa dịkwa n’etiti ha. Kpakpando na-agbagharị gburugburu, n’ịbụ ndị ikike karịrị nke mmadụ bụ́ nke dị n’elu elu nke ihe okirikiri ndị ahụ na-akwagharị. Aristotle kwekwaara na anyanwụ na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe zuru okè, na ha apụghị inwe ntụpọ, nakwa na ha apụghị ịgbanwe agbanwe.
Echiche ahụ wuru ewu nke Aristotle dabeere na nkà ihe ọmụma, ọ bụghị na nkà mmụta sayensị. O chere na ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ụwa ịgba gburugburu. Ọ jụkwara echiche bụ́ na e nwere oghere na-enweghị ihe dị na ya, ebe ọ bụ na o kweere na ọ bụrụ na ụwa ana-agba gburugburu, ọ ga na-akụ n’ihe ndị ọzọ ma ọ bụ kwụsịrị onwe ya ma ọ bụrụ na o nweghị ihe nọgidere na-akwagharị ya. N’ihi na echiche Aristotle yiri ihe ezi uche dị na ya dabere n’ihe ọmụma e nwere mgbe ahụ, a nọgidere na-anakwere ya otú ahụ ọ dị ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ. Ọbụna na narị afọ nke 16 bụ́ oge na-adịbeghị anya, ọkà mmụta bụ́ onye France bụ́ Jean Bodin kwupụtara echiche ahụ ọtụtụ ndị nwere, na-asị: “O nweghị onye isi dị mma, ma ọ bụ onye nwetụrụ ihe ọmụma banyere physics, nke ga-echetụ na ụwa, n’otú a o bururu n’ibu ma dị arọ . . . , na-agba . . . gburugburu n’etiti onwe ya ma na-agba anyanwụ gburugburu; n’ihi na ọ bụrụ na ụwa anwa anwaa gbagharịtụ, anyị ga-ahụ ka obodo ukwu na ebe ndị e wusiri ike, obodo nta na oké ugwu dị iche iche na-ada.”
Chọọchị ahụ Anakwere Echiche Aristotle
Ihe ọzọ so kpata esemokwu Galileo na chọọchị ahụ mere na narị afọ nke 13, o metụtakwara onye Katọlik a ma ama bụ́ Thomas Aquinas (1225-1274). Aquinas kwanyeere Aristotle ùgwù nke ukwuu bụ́ onye ọ na-akpọ Nnukwu Ọkà Ihe Ọmụma. Aquinas gbalịsiri ike ruo afọ ise ịgwakọta echiche Aristotle na ozizi chọọchị. Wade Rowland kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Galileo’s Mistake (“Echiche Hiere Ụzọ nke Galileo”), na ka ọ na-erule n’oge Galileo, “ozizi Aristotle a gwakọtara ya na nke Chọọchị bụ́ nke Aquinas ziri dị ka ozizi okpukpe aghọwo ebe ozizi Chọọchị Rom hiwere isi.” Burukwa n’uche na n’oge ahụ, e nweghị òtù ndị ọkà mmụta sayensị. Agụmakwụkwọ dịkarị n’aka chọọchị. Ọ na-abụkarị otu ndị na-akụzi ozizi okpukpe na nkà mmụta sayensị.
Nke a bụ ntọala nke esemokwu ahụ dị n’etiti chọọchị ahụ na Galileo. Ọbụna tupu ya amalite inyocha mbara igwe, Galileo edewo ihe metụtara otú ihe dị iche iche si agagharị. O mere ka e nyowe ọtụtụ ihe ndị Aristotle ahụ a na-akwanyere nnọọ ùgwù kwuru enyowe. Otú o sina dị, ọ bụ nkwụsi ike Galileo n’ịkwalite echiche nke anyanwụ ịdị n’etiti mbara igwe na olu o kwesiri ike na o kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ mere Ndị Njụta Okwukwe ji kpee ya ikpe n’afọ 1633.
Ka ọ na-azara ọnụ ya, Galileo kwusiri ike na ya nwere okwukwe siri ike na Bible dị ka Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. O kwukwara na e dere Akwụkwọ Nsọ maka ndị nkịtị, nakwa na e kwesịghị ile ihe ndị Bible kwuru bụ́ ndị yiri ka hà na-egosi na anyanwụ na-agagharị agagharị anya n’ụzọ nkịtị. Arụmụka ya arụpụtaghị ihe ọ bụla. N’ihi na Galileo jụrụ nkọwa Akwụkwọ Nsọ nke dabeere n’echiche nkà ihe ọmụma Gris, a mara ya ikpe! Chọọchị Katọlik nọgidere na-ekwu na ihe ya mere ziri ezi ruo na 1992 bụ́ mgbe o kwetara na ya kpere Galileo ikpe na-ezighị ezi.
Ihe Ndị Anyị Ga-amụta
Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe omume ndị a? Otu bụ na Galileo adịghị ihe ọ bụla o nwere megide Bible. Kama nke ahụ, ọ bụ ozizi chọọchị ka o megidere. Otu onye na-ede akwụkwọ banyere okpukpe kwuru, sị: “Ihe anyị na-amụta site n’ihe metụtara Galileo eyighị ka ọ̀ bụ na Chọọchị ahụ gbasobigara eziokwu Bible ókè; kama nke ahụ, ọ bụ na ọ gbasochighị ya anya.” Site n’ikwe ka nkà ihe ọmụma Gris metụta ozizi ya, chọọchị ahụ gbasoro ọdịnala kama ịgbaso ozizi Bible.
Ihe a nile na-echetara anyị ịdọ aka ná ntị ahụ Bible nyere, bụ́: “Nọrọnụ na nche: eleghị anya a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.
Ọbụna taa, ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm nọgidere na-anabata ozizi na nkà ihe ọmụma ndị na-emegide Bible. Otu n’ime ha bụ ozizi evolushọn nke Darwin, bụ́ nke ha kweere kama ikwere ihe Jenesis kwuru banyere otú e si kee ihe. N’ezie, site n’iji ozizi evolushọn Darwin dochie anya ihe Jenesis kwuru banyere okike, chọọchị dị iche iche emewo Darwin Aristotle nke oge a, meekwa ozizi evolushọn nkwenkwe okpukpe.b
Ezigbo Sayensị Na-ekwekọ na Bible
Ihe e kwuru n’elu ekwesịtụghị ime ka mmadụ kwụsị inwe mmasị na sayensị. N’ikwu eziokwu, Bible n’onwe ya na-agba anyị ume ịmụta ihe site n’aka ọrụ Chineke na iji ihe ndị anyị na-ahụ ghọta àgwà ndị dị ebube nke Chineke. (Aịsaịa 40:26; Ndị Rom 1:20) N’ezie, Bible adịghị azọrọ na ya na-akụzi sayensị. Kama nke ahụ, ọ na-ekpughe ụkpụrụ Chineke, akụkụ ụfọdụ nke àgwà ya bụ́ ndị nanị ihe ndị e kere eke na-apụghị ịkụzi, nakwa nzube ya maka ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 19:7-11; 2 Timoti 3:16) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Bible kwuru banyere ihe ndị e kere eke, ihe ndị o kwuru na-ezi ezi mgbe nile. Galileo n’onwe ya kwuru, sị: “Ma Akwụkwọ Nsọ ma ihe e kere eke sitechara n’Okwu Ọnụ Chineke . . . Ọ dịghị mgbe eziokwu abụọ ga-emegiderịta onwe ha.” Tụlee ihe atụ ndị na-esonụ.
Ihe dịdị mkpa karịa ngagharị nke kpakpando na mbara ala dị iche iche bụ na e nwere iwu ndị na-achịkwa ụmụ irighiri ihe nile dị n’eluigwe na ụwa, iwu ndị dị ka iwu ndọda. Onye mbụ a maara kwuru banyere iwu ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke ma e wezụga ihe Bible kwuru banyere ha bụ Pythagoras, bụ́ onye kweere na a pụrụ iji ọnụ ọgụgụ dị iche iche kọwaa eluigwe na ụwa. Puku afọ abụọ ka nke ahụ gasịrị, Galileo, Kepler, na Newton mesịrị gosipụta na e nwere iwu ndị ezi uche dị na ha na-achịkwa ụmụ irighiri ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa.
Ihe mbụ Bible kwuru banyere iwu ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke dị n’akwụkwọ Job. N’ihe dị ka afọ 1600 T.O.A., Chineke jụrụ Job, sị: ‘Ị̀ mawo ụkpụrụ [ma ọ bụ, iwu] nile nke eluigwe?’ (Job 38:33) Akwụkwọ Jeremaịa, bụ́ nke e dere na narị afọ nke asaa T.O.A., kpọrọ Jehova Onye Okike nke ‘ụkpụrụ nile nke ọnwa na nke kpakpando’ na ‘ụkpụrụ nile nke eluigwe na ụwa.’ (Jeremaịa 31:35; 33:25) N’ihi ihe ndị a Bible kwuru, onye na-akọwa Bible bụ́ G. Rawlinson kwuru, sị: “Ma ndị dere Bible ma sayensị ọgbara ọhụrụ na-ekwusi ike na e nwere iwu ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke.”
Ọ bụrụ na anyị agụọ site n’oge Pythagoras, e kwuru ihe ahụ dị na Job ihe dị ka otu puku afọ tupu a mata banyere ya. Buru n’uche na nzube Bible abụghị nanị ịgwa anyị banyere ihe ndị e kere eke, kama nke ahụ, nzube ya bụ́ isi bụ ime ka anyị mata na ọ bụ Jehova bụ Onye kere ihe nile—onye pụrụ ike iwu ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke.—Job 38:4, 12; 42:1, 2.
Ihe atụ ọzọ anyị pụrụ ịtụle bụ na mmiri ndị dị n’ụwa na-alaghachi n’urukpuru ma zookwa dị ka mmiri, a na-akpọkwa nke a nrugharị mmiri. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, anwụ na-amịrị mmiri site n’oké osimiri, mmiri ahụ na-aghọ urukpuru, zoo dị ka mmiri, mesịakwa laghachi n’oké osimiri. Ihe odide ndị kasị ochie a ka nwere ugbu a na-abụghị nke Bible bụ́ ndị kwuru banyere nrugharị mmiri bụ ndị e dere na narị afọ nke anọ T.O.A. Otú ọ dị, Bible kwuru ihe ndị o kwuru banyere nke ahụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke 11 T.O.A., Eze Solomọn nke Izrel kwuru, sị: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi ọzọ.”—Eklisiastis 1:7.
N’otu aka ahụ, ihe dị ka n’afọ 800 T.O.A., Emọs onye amụma, bụ́ onye ọzụzụ atụrụ na onye ọrụ ugbo dị umeala n’obi, dere na Jehova bụ “Onye ahụ Nke na-akpọ mmiri nke oké osimiri òkù, wee wụsa ha ala.” (Emọs 5:8) N’ejighị okwu ndị dị mgbagwoju anya na ndị siri ike nghọta mee ihe, ma Solomọn ma Emọs kọwara nrugharị mmiri n’ụzọ ziri ezi, nke ọ bụla n’ime ha ana-akọwa ya n’ụzọ dịtụ iche.
Bible na-ekwukwa na Chineke “na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” (Job 26:7) N’ihi ihe ọmụma e nwere n’afọ 1600 T.O.A., bụ́ ihe dị ka mgbe e kwuru okwu ndị ahụ, ọ ga-ara ahụ́ inweta onye ga-ekwu na ihe dị arọ pụrụ ịkwụụrụ onwe ya na mbara igwe n’enweghị ihe ji ya. Dị ka e kwuru na mbụ, Aristotle n’onwe ya jụrụ echiche nke bụ́ na e nwere oghere nke na-enweghị ihe dị na ya, ọ dịkwara ndụ ihe karịrị otu puku na narị afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị!
Ó jughị gị anya na Bible kwuru ihe ziri ezi otú ahụ—n’agbanyeghị na n’oge ahụ, e nwere echiche ndị na-ezighị ezi ma bụrụ ndị yiri ka ezi uche ọ̀ dị na ha? Nye ndị na-eche echiche, nke a bụ otu n’ime ihe àmà ndị na-egosi na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị ịghara ikwere ozizi ọ bụla nke na-emegide Okwu Chineke. Dị ka akụkọ ihe mere eme gosipụtaworo ugboro ugboro, nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ, ọbụna nke ndị oké amamihe a ma ama, na-ewu ma wuchaa, ma “okwu Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Na narị afọ nke atọ T.O.A., onye Gris bụ́ Aristarchus nke Samos kwupụtara echiche bụ́ na ọ bụ anyanwụ dị n’etiti mbara igwe, ma a jụrụ echiche ya ma nakwere nke Aristotle.
b Maka nkọwa zuru ezu nke isiokwu a, lee isi nke 15, “N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Ndị Ji Anabata Ozizi Evolushọn?” n’akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]
Otú Ndị Protestant Si Lee Ya Anya
Ndị ndú nke Ndozigharị Ndị Protestant kwukwara okwu megide echiche nke anyanwụ ịdị n’etiti mbara igwe. Ha gụnyere Martin Luther (1483-1546), Philipp Melanchthon (1497-1560), na John Calvin (1509-1564). Luther kwuru banyere Copernicus, sị: “Onye nzuzu a chọrọ ịgbanwe nkà mmụta mbara igwe kpamkpam.”
Ihe ndị ndozigharị ahụ ji kwado arụmụka ha bụ nkọwa nkịtị ha nyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ, dị ka ihe ndị e kwuru na Joshua isi 10 bụ́ nke kwuru na anyanwụ na ọnwa “guzo duu.”c N’ihi gịnị ka ndị ndozigharị ahụ ji nwee echiche a ha nwere? Akwụkwọ bụ́ Galileo’s Mistake na-akọwa na ọ bụ ezie na Ndozigharị Ndị Protestant mere ka ndị Protestant nwere onwe ha site n’aka Chọọchị Katọlik, o “metụtalighị ikike bụ́ isi” nke Aristotle na Thomas Aquinas, bụ́ ndị ‘ma ndị Katọlik ma ndị Protestant nabatachara echiche ha.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
c N’ụzọ nkà mmụta sayensị, ihe anyị na-ekwu ezighị ezi mgbe anyị na-ekwu banyere “ọwụwa anyanwụ” na “ọdịda anyanwụ.” Ma n’okwu a na-ekwu kwa ụbọchị, a nabatara okwu ndị a, ha zikwara ezi ma ọ bụrụ na anyị eburu n’uche na ọ bụ n’ụwa ka anyị nọ na-ele anyanwụ. N’otu aka ahụ, Jọshụa anọghị na-ekwu banyere nkà mmụta mbara igwe; nanị ihe ọ nọ na-eme bụ ịkọ ihe ndị merenụ otú o si hụ ha.
[Foto]
Luther
Calvin
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Servetus and Calvin, 1877
[Foto dị na peeji nke 4]
Aristotle
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ A General History for Colleges and High Schools, 1900
[Foto dị na peeji nke 5]
Thomas Aquinas
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religious Knowledge, 1855
[Foto dị na peeji nke 6]
Isaac Newton
[Foto dị na peeji nke 7]
Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, Bible kọwara nrugharị nke mmiri ndị dị n’ụwa