Ndị A Chụpụrụ na Mbụ Ma Mesịa Nabataghachi Ha
N’AFỌ ole na ole gara aga, Santiago na nwunye ya, bụ́ Lourdes, kwagara Huillcapata, bụ́ obodo mara mma nke dị na Peru, iji kwusaara ndị bi ebe ahụ ozi na-eme ka e nwee olileanya bụ́ nke dị na Bible. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, otu onye ụkọchukwu si Cuzco bịa ma kpọkọta ndị nile bi ebe ahụ. Onye ụkọchukwu ahụ dọrọ ha aka ná ntị na ọbịbịa Ndịàmà Jehova bịara ebe ahụ ga-ewetara ha ihe otiti na-egbu egbu ma mee ka nnukwu snow nke ga-egbu ehi ha ma bibie ihe ọkụkụ ha daa.
Ọtụtụ ndị kweere n’ihe a onye ụkọchukwu ahụ kwuru. N’ihi nke a, ruo ihe karịrị ọnwa isii, ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’obodo ahụ kwere ka Ndịàmà bụ́ Santiago na Lourdes mụọrọ ha Bible. Osote gọvanọ obodo ahụ onye aha ya bụ Miguel, nọ na-achụgharị Santiago na Lourdes n’obodo ahụ, na-atụ ha nkume. Ma ha nọgidere na-emeghachi omume n’ụzọ udo, dị ka Ndị Kraịst.
Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ndị obodo ahụ kweere ka a mụwara ha Bible. Ọbụna Miguel gbanwere àgwà ya. Ọ malitere soro Santiago mụwa ihe, kwụsị ịṅụ oké mmanya ma ghọọ onye na-eme udo. N’ikpeazụ, Miguel, nwunye ya, na abụọ n’ime ụmụ ya ndị nwanyị nabatara eziokwu Bible.
Taa, e nwere ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-eme nke ọma n’obodo a. Miguel nwere obi ụtọ na ọtụtụ n’ime nkume ndị ahụ ọ tụrụ Santiago na Lourdes atụtaghị ha, o nwekwara ekele n’ebe di na nwunye ahụ nọ maka ihe nlereanya magburu onwe ya nke ime udo ha setịpụrụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 32]
Àgwà ime udo nke Santiago na Lourdes (n’elu) mere ka Miguel (n’isi isi aka nri) gbanwee àgwà ya