Mee Ka Ntụgharị Uche Bụrụ Ihe Na-atọ Ụtọ
NYE ụfọdụ ndị, ntụgharị uche pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike. Ha pụrụ ile ntụgharị uche anya dị ka ihe siri ike bụ́ nke chọrọ ka mmadụ tinye uche ya n’ihe n’ụzọ miri emi. Obi ndị dị otú a pụkwara ịdị na-ama ha ikpe n’ihi na ha adịghị atụgharị uche, karịsịa mgbe ha gụrụ banyere mkpa ntụgharị uche dị. (Ndị Filipaị 4:8) Otú ọ dị, ịtụgharị uche n’ụzọ dị jụụ n’eziokwu ndị anyị mụtaworo banyere Jehova, àgwà ya ndị mara mma, ihe ndị dị ịtụnanya o mere, ihe ndị ọ chọrọ anyị n’aka, na nzube ya dị ebube pụrụ ma kwesị ịbụ ụzọ na-enye obi ụtọ anyị ga-esi na-eji oge anyị eme ihe. N’ihi gịnị?
Jehova Chineke bụ Onye Ọchịchị Kasị Elu n’eluigwe na ala. Ọ na-arụsikwa ọrụ ike iji hụ na nzube ya mezuru. (Jọn 5:17) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-elebara ihe onye nke ọ bụla n’ime ndị na-efe ya ofufe na-eche anya. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid maara nke a ma site n’ike mmụọ nsọ Chineke dee, sị: “Jehova, I gwupụtawo ala obi m, I wee mara m. Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m. Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya.”—Abụ Ọma 139:1, 2.
Na mbụ, mmadụ pụrụ ile okwu ndị ahụ ọbụ abụ kwuru anya dị ka ihe na-akụda mmụọ. Mmadụ pụrụ iche, sị, ‘Ọ bụ ezie na Chineke nọ “n’ebe dị anya,” ọ na-ahụ echiche ọjọọ nile na-abata m n’uche.’ N’ezie, abamuru dị n’iche otú ahụ. Ọ pụrụ inyere anyị aka ịlụso echiche na-ezighị ezi ọgụ, ma kwupụtara ha Chineke mgbe ọ bụla ha batara anyị n’uche, na-enwe obi ike na ọ ga-agbaghara anyị na-adabere n’okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jizọs. (1 Jọn 1:8, 9; 2:1, 2) Otú ọ dị, n’otu oge ahụkwa, anyị kwesịrị ịghọta na Jehova na-ebu ezi ihe n’obi enyocha ndị na-efe ya ofufe. Ọ na-ege ntị mgbe anyị na-atụgharị uche banyere ya.
Ị pụrụ ịjụ, sị, “Jehova ọ̀ na-ama n’ezie banyere echiche nile ziri ezi nke ọtụtụ nde ndị na-efe ya ofufe?” N’ezie, ọ na-ama. Jizọs mere ka mmasị Jehova nwere n’ebe anyị nọ pụta ìhè mgbe ọ sịrị na Jehova na-arịba ọbụna nza pere mpe ama, ọ gbakwụnyeziri, sị: “Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Luk 12:6, 7) Nza apụghị iche banyere Jehova. Ya mere, ọ bụrụ na ọ na-elekọta ha, lee ka ọ na-aghaghị isi lekọta anyị ọbụna karị ma nwee ọṅụ dị ukwuu mgbe anyị nile n’otu n’otu na-eche banyere ya! Ee, dị ka Devid, anyị pụrụ iji obi ike kpee ekpere, sị: “Ka . . . ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova, bụ́ oké nkume m, na onye mgbapụta m.”—Abụ Ọma 19:14.
A na-ahụ ihe àmà ọzọ na-egosi n’ezie na Jehova na-elebara ntụgharị uche nke ndị ohu ya na-akwụsi ike n’akụkụ ya na-enwe anya, n’okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Malakaị onye amụma kwuru. N’ikwu banyere ụbọchị anyị, o buru amụma, sị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.” (Malakaị 3:16) Ịdị na-echetara onwe anyị na Jehova ‘na-aṅa ntị’ mgbe anyị na-atụgharị uche banyere ya, pụrụ n’ezie ime ka ịtụgharị uche n’ihe ime mmụọ bụrụ ihe na-atọ ụtọ. N’ihi ya, ka anyị kwughachi ihe ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru bụ́ onye dere, sị: “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.”—Abụ Ọma 77:12.