Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 4/15 p. 8-12
  • Ijikọta Ndị Mmadụ na Panama

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ijikọta Ndị Mmadụ na Panama
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Nta
  • Obodo Jikọtara Ebe na Ndị Dị Iche Iche
  • Imeri Ihe Ịma Aka na Comarca
  • Ịkwọ Ụgbọ Iji Ruo n’Obi Ndị Mmadụ
  • Imeri Nsogbu nke Amaghị Ede na Amaghị Agụ
  • Imeri Ihe Mgbochi nke Ịda Ogbi
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 4/15 p. 8-12

Ijikọta Ndị Mmadụ na Panama

“PANAMA, obodo jikọtara ụwa.” Iri afọ ise gara aga, e jiri okwu a kọwaa obodo ahụ dị n’Ebe Etiti America n’otu ihe omume redio a na-eme n’obodo ahụ. Taa, ọ bụ otú ahụ ka ọtụtụ ndị si ele mba ahụ anya.

Panama dị ka àkwà mmiri jikọtara Ebe Ugwu na Ebe Ndịda America. E wezụga nke ahụ, nke bụ́ ezigbo Àkwà Mmiri America gafere Ọwa Mmiri Panama a ma ama. Ọwa mmiri ahụ, nke bụ́ ọrụ nkà dị ịtụnanya, si n’etiti obodo ahụ gafee, jikọta Oké Osimiri Atlantic na nke Pacific. Nke a na-eme ka ọ dịrị ụgbọ mmiri si n’akụkụ nile nke ụwa mfe ịgafe ebe gaara ewe ha njem ụbọchị ma ọ bụ izu ole na ole n’oké osimiri n’ime awa ole na ole. Ee, Panama dị ka àkwà mmiri jikọtara ọtụtụ obodo dị n’ụwa.

Obodo Jikọtara Ebe na Ndị Dị Iche Iche

E nweekwala mba na agbụrụ dị iche iche bịara biri na Panama. Ndị a si ebe dị iche iche na ndị nwe obodo emeela ka e nwee ụdị ndị dị iche iche bisasịrị n’akụkụ nile nke ala a mara mma. Otú ọ dị, ọ̀ ga-ekwe omume iji eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa dị n’Okwu Chineke mee ka ndị a si n’obodo dị iche iche, bụ́ ndị nwere omenala dị iche iche, bụ́kwa ndị nọ n’okpukpe dị iche iche ma na-asụ asụsụ dị iche iche nwee otu echiche na nzube?

Ee, ọ ga-ekwe omume. Okwu Pọl onyeozi ndị e dekọrọ ná Ndị Efesọs 2:17, 18 gosiri na ikike àjà Kraịst nwere ijikọ ndị mmadụ nyeere Ndị Kraịst narị afọ mbụ—ma ndị Juu ma ndị Jentaịl—aka ịrụzu ihe dị otú ahụ. Pọl dere, sị: “Ọ [Jizọs] bịakwara wee kpọsaa ozi ọma nke udo nye unu, bụ́ ndị nọ n’ebe dị anya, na udo nye ndị nọ nso, n’ihi na site n’aka ya anyị, ndị abụọ ahụ, nwere ike ịbịaru Nna ahụ nso site n’otu mmụọ.”

N’ụzọ yiri nke ahụ taa, Ndịàmà Jehova na-ezisara ndị na ìgwè si n’obodo na okpukpe dị iche iche “ozi ọma nke udo” na Panama. E nweela ezi ịdị n’otu n’etiti ndị ‘na-abịaru Jehova nso.’ N’ihi ya, e hiwela ọgbakọ n’asụsụ isii na Panama—Spanish, Cantonese, Ụdị Asụsụ Ogbi nke Panama, Bekee, nakwa n’asụsụ abụọ nke ndị obodo ahụ, bụ́ Kuna na Ngobere (Guaymí). Ọ na-enye obi ụtọ ịhụ otú ndị na-asụ asụsụ ndị a dị iche iche siworo dịrị n’otu n’ofufe Jehova.

Imeri Ihe Ịma Aka na Comarca

Ndị Ngobe bụ agbụrụ kasị ukwuu n’ime agbụrụ asatọ e nwere na Panama. Ndị agbụrụ a dị ihe dị ka otu narị puku na iri puku mmadụ asaa, ihe ka ọtụtụ n’ime ha bi n’ebe sara mbara a malitere ịkpọ comarca, ma ọ bụ ebe dịpụrụ adịpụ, n’oge na-adịbeghị anya. Akụkụ dị ukwuu nke ebe ahụ dịpụrụ adịpụ bụ ugwu ndị dị n’oké ọhịa bụ́ ndị okwute juru na ha a na-ejikarị ụkwụ agaru, nakwa obodo ndị mara mma dị n’akụkụ mmiri bụ́ ndị a na-esi n’oké osimiri aga. Ndị ebe ahụ na-ebikarị n’ebe dị nso na mmiri, bụ́ nke na-eme ka ime njem dịrị ha mfe, ha na-ebikwa n’akụkụ mmiri. Ọtụtụ ndị bi na comarca na-enweta ihe ha na-eri site n’ịkụ kọfị n’ugwu, site n’igbu azụ, ma ọ bụ site n’ịrụ ọrụ ugbo. Ọtụtụ n’ime ha na-aga chọọchị Krisendọm. Otú ọ dị, e nwere ndị bi ebe ahụ na-ekpe okpukpe ọdịnala a na-akpọ Mama Tata. Ndị ọzọ na-agakwuru ndị sukia (ndị dibịa afa) obodo ahụ maka ọgwụgwọ mgbe ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe ha chere na ndị mmụọ ọjọọ na-enye ha nsogbu. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-asụ Spanish, asụsụ a kasị aghọta ebe a bụ Ngobere.

Ịkwọ Ụgbọ Iji Ruo n’Obi Ndị Mmadụ

Ndịàmà Jehova ghọtara na ọ dị mkpa ọ bụghị nanị inyere ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu ahụ, kamakwa ime ka o ruo ha n’obi. Nke a pụrụ ịkpali ha ịgbanwe ndụ ha iji bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. N’ihi ya, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche e zigara n’ebe asatọ dị iche iche n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ amụtawo asụsụ Ngobere site n’enyemaka nke Ndịàmà bụ́ ndị obodo ahụ bụ́ ndị maara asụsụ ahụ nke ọma.

Ọgbakọ 14 e hiwerela n’ebe ahụ na-egosi na ọtụtụ ndị ọzọ ka nwere ike ịghọ Ndịàmà. Dị ka ihe atụ, afọ ole na ole gara aga, e kenyere Dimas na Gisela, di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ọrụ n’otu obere ọgbakọ nwere ihe dị ka ndị nkwusa 40 nke dị n’obodo Tobobe nke dịdebere mmiri. Ọ dịghịrị ha mfe ime ka njem ha na-eji ụgbọ epeepe eme mgbe mgbe ịga kwusaara ndị bi n’akụkụ Oké Osimiri Atlantic ozi ọma mara ha ahụ́. Dimas na Gisela chọpụtara na osimiri dị jụụ nwere ike malite ibigbọ ebigbọ n’otu ntabi anya. Aka na azụ na-egbukarị ha mgbu mgbe ha kwọchara ụgbọ si n’otu obodo gaa n’ọzọ. Nsogbu ọzọ ha nwere bụ ịmụ asụsụ obodo ahụ. Ma, a gọziri ha n’ihi ịchụ onwe ha n’àjà na nnọgidesi ike ha n’afọ 2001 mgbe ihe dị ka narị mmadụ ise na iri ise na abụọ bịara Ncheta ọnwụ Kraịst.

Obodo Punta Escondida dị n’ofe mmiri site na Tobobe. Ruo oge ụfọdụ, obere ìgwè ndị nkwusa nọ na Punta Escondida na-akwọ ụgbọ agafere mmiri ahụ iji gaa ọmụmụ ihe na Tobobe mgbe ọ bụla ihu igwe dị mma, akụkọ ndị a na-anụ gosikwara na a ga-enwe ike ihiwe ọgbakọ ọhụrụ n’ebe ahụ. N’ihi ya, a gwara Dimas na Gisela ka ha kwafee Punta Escondida. N’ihe na-erughị afọ abụọ, ìgwè ahụ dị na Punta Escondida ghọrọ ọgbakọ na-arụsi ọrụ ike nke nwere ndị nkwusa 28, nwee ihe dị ka otu narị mmadụ na iri na anọ na-abịakarị ege okwu ihu ọha kwa izu. N’afọ 2004, ọgbakọ ọhụrụ ahụ ṅụrịrị nnọọ ọṅụ mgbe narị mmadụ anọ na iri ise na asatọ bịara Ncheta ọnwụ Kraịst.

Imeri Nsogbu nke Amaghị Ede na Amaghị Agụ

Ịmụta ka e si ede na ka e si agụ enyeworo ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu aka ịghọ ezi ndị enyi Jehova. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Fermina, bụ́ nwa agbọghọ si n’ógbè dị n’ugwu na comarca. Ndịàmà bụ́ ndị ozi ala ọzọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ o bi chọpụtara na ọ na-aṅa ntị nke ọma n’ozi Alaeze ahụ. Mgbe a jụrụ ya ma ọ̀ ga-ekwe ka a mụwara ya Bible, o kwuru na ya ga-achọ ịmụtakwu ihe. Ma o nwere otu nsogbu. Ọ na-asụ Spanish na Ngobere, ma o nweghị ike ịgụ ma ọ bụ dee nke ọ bụla n’asụsụ abụọ ahụ. Otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ kwetara iji broshuọ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writinga kụziere ya ka e si ede na ka e si agụ.

Fermina ji ihe ọmụmụ ya kpọrọ nnọọ ihe, na-eji ịnụ ọkụ n’obi akwadebe ebe a ga-amụ, na-arụ ọrụ e nyere ya ka ọ rụọ n’ụlọ ma jiri ịdị uchu na-anwale ịsụpe okwu dị iche iche. N’ime otu afọ, ọ mụtara ihe ruo n’ókè nke ịmụ broshuọ bụ́ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!b Mgbe a haziri ọmụmụ ihe ọgbakọ, Fermina malitere ịga. Otú ọ dị, n’ihi na ezinụlọ ya dara ogbenye, o siiri ya ike ịgbara ụmụ ya ụgbọ ịga ọmụmụ ihe. Mgbe otu onye ọsụ ụzọ chọpụtara ọnọdụ Fermina, ọ tụụrụ ya aro ka o lee ma ọ̀ ga-amalite ịkwa na ire uwe ọdịnala ụmụ nwanyị Ngobe. Fermina mere otú ahụ, n’agbanyeghịkwa mkpa ego ndị ọzọ o nwere, ọ hụrụ na o ji ego ọ na-enweta n’ire uwe ahụ aga nanị ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ya na ezinụlọ ya akwagala ebe ọzọ, ọ na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ. Obi dị ha ụtọ na ọ bụghị nanị na ha amụtala ka e si agụ na ka e si ede, kamakwa, karịsịa na ha abịala mata Jehova.

Imeri Ihe Mgbochi nke Ịda Ogbi

Na Panama, ihere na-emekarị ọtụtụ ezinụlọ nwere ndị ogbi. Mgbe ụfọdụ, a naghị enye ndị dị otú ahụ ohere ọ bụla ịgụ akwụkwọ. Ọtụtụ ndị ogbi na-ewere ya na ọ dịghị onye chọrọ ịma ihe banyere ha, ebe ọ bụ na ọ naghị adị mfe ha na ndị ọzọ ikwurịta okwu.

N’ihi ya, ọ bịara doo anya na a ghaghị ime ihe iji mee ka ndị ogbi nụ ozi ọma ahụ. N’ihi agbamume nke otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nyere otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ na-anụ ọkụ n’obi, ha malitere ịmụ Ụdị Asụsụ Ogbi nke Panama. Mgbalị ha rụpụtara ezi ihe.

Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ afọ 2001, e hiwela ìgwè na-eji asụsụ ogbi amụ ihe na Panama City. Ihe dị ka mmadụ 20 na-abịa ọmụmụ ihe ha. Ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ahụ na-amụtakwu asụsụ ahụ, ha ziri ndị “na-anụtụbeghị” eziokwu Bible n’asụsụ ha ozi ọma. Ọtụtụ Ndịàmà ụmụ ha bụ ndị ogbi malitekwara ịbịa ọmụmụ ihe ndị ahụ ma chọpụta na ọ dịkwuorola ụmụ ha mfe ịghọta ozizi Bible nakwa na ha enwekwuola mmasị n’eziokwu ahụ. Ọtụtụ ndị nne na nna mụtara ịsụ asụsụ ogbi, nke ahụ mekwara ka ọ dịkwuoro ha mfe iso ụmụ ha na-ekwurịta okwu. Ndị nne na nna ahụ na-enwekwu ike inyere ụmụ ha aka n’ụzọ ime mmụọ, ha na-achọpụtakwa na a na-ewusikwu ezinụlọ ha ike. Ihe banyere Elsa na nwa ya nwanyị bụ́ Iraida na-egosi nke a.

Otu Onyeàmà nke nọ n’ìgwè ahụ ji asụsụ ogbi amụ ihe nụrụ banyere Iraida, ya agaa leta ya ma nye ya broshuọ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!c Ihe Iraida mụtara banyere ụwa ọhụrụ site n’ihe osise ndị dị na broshuọ ahụ masịrị ya nke ukwuu. E ji broshuọ ahụ malitere ya ọmụmụ Bible. Mgbe ha mụchara akwụkwọ ahụ, ha gafere na broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?d Iraida gwaziri nne ya ka ọ na-enyere ya aka ịkwado ihe ọmụmụ ahụ na ịkọwara ya ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ.

Elsa nwere nsogbu abụọ: Ebe ọ na-abụghị Onyeàmà, ọ maghị eziokwu Bible, ọ maghịkwanụ asụsụ ogbi. A gwara ya ka ọ ghara iji asụsụ ogbi agwa nwa ya nwanyị okwu kama ka o mee ka nwa ya nwanyị mụta ikwu okwu. N’ihi ya, ya na nwa ya nwanyị adịchaghị ekwurịta okwu nke ọma. Arịrịọ ahụ Iraida rịọrọ ya ka o nyere ya aka kpaliri ya ịrịọ otu Onyeàmà nọ n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ ka ọ mụwara ya ihe. O kwuru, sị: “Arịọrọ m arịrịọ ahụ n’ihi nwa m nwanyị, n’ihi na ọ dịtụbeghị ihe m hụrụ masịrị Iraida otú a.” Elsa sooro nwa ya mụọ ihe ma mụta asụsụ ogbi. Ka Elsa na-etinyekwu oge n’inyere nwa ya nwanyị aka, nkwurịta okwu ha n’ụlọ bịara ka mma. Iraida malitere ịhọkwu ndị enyi ya ahọ, o sokwa ọgbakọ na-emekọrịta ihe. Ma Iraida ma nne ya na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya ugbu a. E mere Elsa baptizim n’oge na-adịbeghị anya, Iraida na-enwekwa ọganihu iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ. Elsa kwuru na ọ bụ ugbu a ka ya bịara mụtawa nwa ya nwanyị, nakwa na ha nweziri ike ikwurịta ọtụtụ ihe ndị dị mkpa ha abụọ ji kpọrọ ihe.

Ìgwè asụsụ ogbi ahụ, nke ghọrọ ọgbakọ n’April 2003, etoola ma nwee ndị nkwusa Alaeze 50 ugbu a, ihe karịkwara ọnụ ọgụgụ ahụ na-abịa ọmụmụ ihe ha. Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha bụ ndị ogbi. A na-ehiwe ìgwè asụsụ ogbi ndị ọzọ n’obodo atọ ndị ọzọ na-abụghị n’obodo ukwu Panama City. Ọ bụ ezie na a ka nwere ọtụtụ ndị ogbi a ga-ezi ozi ọma, o doro anya na e meela ihe pụtara ìhè iji hụ na ndị ogbi nwere obi eziokwu na Onye Okike ha, bụ́ Jehova Chineke, nwere ezi mmekọrịta.

A na-arụpụtakwa ihe ndị yiri nke ahụ n’akụkụ nile nke Panama. Ọtụtụ ndị adịla n’otu n’ofufe nke nanị ezi Chineke ahụ n’agbanyeghị na ha si n’obodo dị iche iche, na-asụ asụsụ dị iche iche ma bụrụ ndị a zụlitere n’ebe dị iche iche. Eziokwu nke Okwu Jehova emewo ka e nwee ezi mmekọrịta ná mba a, bụ́ nke ọtụtụ ndị weere dị ka “obodo jikọtara ụwa.”—Ndị Efesọs 4:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

b Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

c Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

d Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Map ndị dị na peeji 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OKÉ OSIMIRI CARIBBEAN

PANAMA

Tobobe

OKÉ OSIMIRI PACIFIC

Ọwa Mmiri Panama

[Foto dị na peeji nke 8]

Ụmụ nwanyị Kuna ka ha ji ákwà ọdịnala ha

[Foto dị na peeji nke 9]

Ebe onye ozi ala ọzọ na-ezi nwanyị Ngobe ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 10]

Ebe Ndịàmà bụ́ ndị Ngobe na-abanye n’ụgbọ iji gaa ụbọchị mgbakọ pụrụ iche

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Eziokwu Bible na-ejikọta ndị si n’agbụrụ dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na Panama

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọmụmụ Ihe “Ụlọ Nche” n’asụsụ ogbi

[Foto dị na peeji nke 12]

Ebe Elsa na nwa ya nwanyị, bụ́ Iraida, na-ekwurịta nnọọ okwu

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 8]

Ụgbọ mmiri na ụmụ nwanyị Kuna: © William Floyd Holdman/Index Stock Imagery; ime obodo: © Timothy O’Keefe/Index Stock Imagery

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya