Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 7/1 p. 31
  • Okwukwe Ya Na-agba Ndị Ọzọ Ume

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwukwe Ya Na-agba Ndị Ọzọ Ume
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kwụghachi Ọchịchọ A Chọtere Aka Ụgwọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Edebesịwo M Okwukwe Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 7/1 p. 31

Okwukwe Ya Na-agba Ndị Ọzọ Ume

MGBE a mụrụ Silvia na December 1992, o yiri obere nwatakịrị nwanyị ji nnọọ ahụ́. Ma mgbe ọ dị afọ abụọ, a chọpụtara na Silvia na-arịa ọrịa cystic fibrosis, bụ́ ọrịa a na-adịghị agwọ agwọ nke na-eme ka o siere mmadụ ike iku ume ma na-eme ka o sie ike nri ịgbari n’ahụ́. Iji nagide ọrịa ya, Silvia na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ iri atọ na isii kwa ụbọchị, jiri imi na-ekuru ọgwụ ndị a na-ekuru ekuru, ma na-emega nnọọ ahụ́ nke ọma. Ebe ọ bụ na akpa ume ya adịghị arụcha ọrụ nke ọma, a na-akwụnyere ya akpa ikuku oxygen mgbe nile, ọbụna ma ọ na-apụ apụ.

Mama ya bụ́ Teresa kwuru, sị: “Otú Silvia si na-anagide ọrịa a na-atụ nnọọ n’anya. Ihe ndị ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ mere nnọọ ka okwukwe ya sie ike. Okwukwe a o nwere na-enyere ya aka idi mwute na ahụ́ erughị ala ọ na-enwe. Ọ na-echetakarị ụwa ọhụrụ Jehova kwere ná nkwa, bụ́ ebe a ga-agwọ ndị ọrịa nile.” (Mkpughe 21:4) Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ya e nwee nkụda mmụọ, ihu ọchị Silvia na-enwe bụ́ nke na-egosi na ụjọ ejighị ya, na-agba ha ume. Ọ na-agwa ndị mụrụ ya na nwanne ya nwoke, sị: “Ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ga-anọchi anya ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a.”

Silvia na-agachi ozi ọma anya, ndị ọ na-ekwusara ozi ọma nke sitere n’Okwu Chineke na-achọpụtakwa na ọ na-enwe nnọọ ihu ọchị bụ́ nke na-egosi na o nwere obi ụtọ na ọṅụ. Ụmụnna ndị ha na ya nọ n’otu ọgbakọ na Canary Islands na-ejikwa nnọọ mmasị na-ege ntị mgbe ọ na-aza ajụjụ na mgbe ọ na-eme ihe omume. Mgbe ọ bụla e mechikwara ọmụmụ ihe, Silvia na-enwe mmasị ichere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze iji soro ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị kọrịa. Omume enyi ya na mgbasapụ ihu ya akpaliwo onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ahụ ịhụ ya n’anya.

Papa ya bụ́ Antonio kwuru, sị: “Silvia na-akụziri anyị ihe dị nnọọ mkpa. N’agbanyeghị nsogbu a na-enwe, ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke, anyị kwesịkwara igosi na anyị nwere ekele maka ya.” Dị ka Silvia, ndị ohu Chineke nile—ma nwata ma okenye—na-echeresi nnọọ ike mgbe ‘onye obibi ya na-agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.’—Aịsaịa 33:24.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ebe Silvia nọ na-agụ Bible, mama ya ejidere ya akpa ikuku “oxygen” ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya