Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 8/15 p. 2-3
  • Ndị Dị Nwayọọ n’Obi Ga-eketa Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Dị Nwayọọ n’Obi Ga-eketa Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • “Ka Uche Gị Meekwa n’Ụwa, Dị Ka Ọ Na-eme n’Eluigwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ụzọ Isi Laghachi Paradaịs
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 8/15 p. 2-3

Ndị Dị Nwayọọ n’Obi Ga-eketa Ụwa

Jean-Marie Pelt, onye France bụ́ ọkachamara n’ihe metụtara gburugburu ebe obibi, kwuru, sị: “Echere m na a ga-agbanwe ọnọdụ nke ihe ndị e kere eke ma mee ka ha dị n’otu. . . . Ọ bụghị na nso nso a, kama n’oge dị anya na-abịa n’ihu, bụ́ mgbe a ga-enwe eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”

ỌTỤTỤ ndị ọnọdụ ụwa na ọnọdụ ụmụ mmadụ na-enye nsogbu n’obi ga-achọ ịhụ ka e mere ka ụwa ghọọ paradaịs. Ma, ọchịchọ ahụ amaliteghị taa. Bible kwere nkwa ogologo oge gara aga na a ga-eweghachi Paradaịs n’elu ala. Okwu ndị a Jizọs kwuru, bụ́ “ndị dị nwayọọ n’obi . . . ga-eketa ụwa” na “ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa,” so n’okwu ndị a kasị mara amara n’Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 5:5; 6:10, Bible Nsọ nke Union Version) Otú ọ dị, taa, ọ bụghị ọtụtụ ndị kwenyere na ndị dị nwayọọ n’obi ga-adị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst ekwekwaghị na Paradaịs.

Akwụkwọ akụkọ French a na-ebipụta kwa izu bụ́ La Vie kọwara ihe mere ndị mmadụ ekwekwaghị na paradaịs—ma ọ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ na Chọọchị Katọlik. O kwuru, sị: “Ka [ozizi banyere] paradaịs wusịịrị ndị Katọlik ruo ma ọ dịkarịa ala narị afọ 19, a naghịzi akpọtụ ya aha n’ekpere, n’okwuchukwu ndị a na-ekwu n’ụbọchị Sunday, n’ihe ọmụmụ ndị ụkọchukwu, nakwa na katkizim.” E kwuru na okwu ahụ “bụ nnọọ ihe omimi na ihe dị mgbagwoju anya.” Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-ama ụma ezere okwu ahụ n’ihi na “ọ na-emekarị ka ndị mmadụ na-eche banyere inwe obi ụtọ n’ụwa.”

Frédéric Lenoir, ọkà ná mmekọrịta ọhaneze karịsịa n’ihe banyere okpukpe kwuru na “ọ dịghịzi ihe ndị mmadụ ji [paradaịs] kpọrọ.” Jean Delumeau, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme na onye derela akwụkwọ dị iche iche banyere paradaịs chekwara na ọtụtụ n’ime nkwa ndị Bible kwere banyere paradaịs ga-emezu n’ụzọ ihe atụ. O dere, sị: “Ihe Ndị Kraịst ka na-aza ma a jụọ ha, sị, ‘Paradaịs ọ̀ ka dị irè?’ bụ: N’ihi mbilite n’ọnwụ nke Onye Nzọpụta anyị, otu ụbọchị anyị nile ga-adị n’otu, anyị ga-enwetakwa obi ụtọ anyị na-atụ anya ya.”

Ozi banyere paradaịs elu ala, ọ̀ ka dị mkpa? Gịnị bụ kpọmkwem olileanya e nwere maka ụwa anyị n’ọdịnihu? Ọdịnihu ọ̀ bụ ihe e ji n’aka ka ọ̀ bụ ihe a na-ejichaghị n’aka? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Emma Lee/⁠Life File/⁠Getty Images

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya