Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 4/8 p. 8-10
  • Ụzọ Isi Laghachi Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Laghachi Paradaịs
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Paradaịs—N’eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Elu Ụwa?
  • E Weghachi Paradaịs
  • Ihe Mere Ụfọdụ Ga-eji Jee Eluigwe
  • Paradaịs Ime Mmụọ Akwadebe Ụzọ
  • Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • I Pụrụ Inwe Ọdịnihu Obi Ụtọ!
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • “Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 4/8 p. 8-10

Ụzọ Isi Laghachi Paradaịs

N’IHI agụụ siri ike ụmụ mmadụ nwere maka Paradaịs na mgbalị dị iche iche ma ndị ukwu ma ndị nta iji mepụtaghachi ya, mmadụ ga-eche na ka ọ na-erule ugbu a na ụwa ga-abụ paradaịs n’ezie. Ma ọ bụghị.

Kama nke ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ ebutewo anyaukwu ụzọ, bụ́ nke na-achịkarị n’ajụghị ase mmebi nke gburugburu ebe obibi na ụdị ihe dị iche iche dị ndụ dị n’ime ya. N’ikweta na akụ̀ na ụba nkịtị ga-emeri, ọtụtụ ndị enwekwaghị olileanya ọ bụla na ọ dị mgbe a ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs Iden. Kama nke ahụ, ha na-elega anya n’ịdị ndụ n’eluigwe mgbe a nwụsịrị dị ka nanị olileanya ha nwere maka Paradaịs. Echiche a na-apụta, nke mbụ, na agụụ siri ike anyị na-enwe dị ka mmadụ maka Iden ga-abụ nke na-agaghị emezu ruo mgbe ebighị ebi nakwa, nke abụọ, na Chineke agbahapụworo nzuzu na anyaukwu ụmụ mmadụ mbara ụwa a. Nke a ọ̀ dị otú a? Gịnị nnọọ ka ọdịnihu ga-eweta? Oleekwa ebe ọdịnihu ahụ ga-abụ?

Paradaịs—N’eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Elu Ụwa?

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, mgbe ọ na-agwa onye ohi a kpọgburu n’akụkụ ya nke chegharịrịnụ okwu, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Jisọs ò bu n’obi na onye ohi ahụ ga-eso ya jee eluigwe? Ee e.

Onye mmehie ahụ agadịghị echeworị otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ikekwe ọ ga-amaworị amaokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke dị n’ụbọchị ya, dị ka akụkụ mbụ nke Abụ Ọma 37:29: “Ndị ezi omume ga-enweta ala.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Jisọs kụziri otu eziokwu ahụ, na-ekwu, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Akụkụ akwụkwọ nsọ a kwekọrọ n’ihe a na-akpọkarị Ekpere Onyenwe Anyị, bụ́ nke na-asị: “Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.

Bible na-akụzi na Chineke kere ụwa, ọ bụghị eluigwe, dị ka ebe obibi nye ezinụlọ mmadụ. Okwu ya na-ekwu na “ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere [ụwa]” kama “ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ruo ogologo oge hà aṅaa? “Ọ tọwo ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Ee, “ụwa na-eguzoru mgbe ebighị ebi.”—Eklisiastis 1:4.

Ọ bụ nzube Chineke ka ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ejere ya ozi mee ụwa a ebe obibi ha ruo mgbe ebighị ebi. Rịba ama otú Okwu Chineke, bụ́ Bible, si kwuo okwu na nke a. Abụ Ọma 37:11 na-ebu amụma, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” Ruo ogologo oge hà aṅaa? Abụ Ọma 37:29 na-ekwu, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe ahụ a ga-emezu akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-ekwu, sị: “Ị [Chineke] na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya,” ya bụ, ihe ụtọ ndị kwekọrọ n’uche Chineke.—Abụ Ọma 145:16.

Olee banyere ndị na-enweghị ọchịchọ ime uche Chineke? Ilu 2:21, 22 na-ekwu, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”

E Weghachi Paradaịs

N’isi nso ugbu a, a ga-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe megide ụwa ọjọọ a. (Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5, 13) Ma Chineke ga-echebe “oké ìgwè mmadụ” gabiga mbibi ahụ na-abịanụ banye n’ime ụwa ọhụrụ nke ọ ga-eme.—Mkpughe 7:9-17.

Mgbe ahụ, Chineke ga-eduzi ọrụ ọṅụ nke ụmụ mmadụ ọ na-achị ga-enwe nke ime ka ụwa dum ghọọ ebe obibi paradaịs maka ihe a kpọrọ mmadụ. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. . . . N’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.”—Aịsaịa 35:1, 6.

Na Paradaịs ahụ na-agbasapụ agbasapụ, agụụ, ịda ogbenye, ógbè ndị ruru unyi, ndị na-enweghị ebe obibi, ma ọ bụ ógbè ndị jupụtara na mpụ agaghị adịkwa ọzọ. “Ọtụtụ ọka dị n’ala.” (Abụ Ọma 72:16) “Osisi ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya.” (Ezikiel 34:27) “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.” (Aịsaịa 65:21, 22) “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.

Ihe Mere Ụfọdụ Ga-eji Jee Eluigwe

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga-ekweta ma eleghị na ha nwere agụụ siri ike maka paradaịs elu ala. Nke ahụ bụ ebumpụta ụwa, n’ihi na ọ dịghị mgbe Chineke kụnyere n’ime ha agụụ siri ike maka eluigwe; ha apụghị ọbụna ichetụ n’echiche ihe ịdị ndụ n’eluigwe dị ka ya. Dị ka ihe atụ, ná mkparịta ụka o so ụkọchukwu ya na Chọọchị England nwee, Pat, ọ bụ ezie na ọ bụ ezigbo onye chọọchị, kwuru, sị: “Echetụbeghị m echiche banyere ije eluigwe. Achọghị m ije, e kwuwerị, gịnị ka m ga-eme ebe ahụ?”—Tụlee Abụ Ọma 115:16.

N’eziokwu, Bible na-akụzi na ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè nke ụmụ mmadụ, 144,000, na-eje eluigwe. (Mkpughe 14:1, 4) Ọ na-akọwakwa ihe kpatara ya: “I wee mee ha ka bụrụ alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha bụkwa eze n’elu ụwa.” (Mkpughe 5:9, 10, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Tinyere Eze ha, bụ́ Jisọs Kraịst, ndị a mejupụtara “alaeze” ahụ, ọchịchị eluigwe ọhụrụ nke ụwa, nke ndị Kraịst na-ekpe ekpere maka ya. Ọchịchị a ga-elekọta ọrụ ime ka ọnọdụ ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ dịghachi mma.—Daniel 2:44; 2 Pita 3:13.

Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọchịchọ ibi n’eluigwe adịghị n’ime mmadụ site n’okike, ịrụ ọrụ pụrụ iche nke mmụọ Chineke “na-agba àmà” nye 144,000 ahụ ka ha wee nwee mmetụta nke “ọkpụkpọ dị elu” a pụrụ iche. (Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Filipaị 3:14) Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, ụdị ịrụ ọrụ a nke mmụọ nsọ adịghị mkpa maka ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha n’ihi na ebe obibi ebighị ebi ha gaje ịbụ n’ụwa paradaịs.

Paradaịs Ime Mmụọ Akwadebe Ụzọ

Olee otú mmadụ ga-esi ruo eruo maka ndụ agwụghị agwụ n’ime Paradaịs n’elu ala? “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ,” ka Jisọs kwuru, “ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’ijikọta mmekọrịta udo nke ụmụ mmadụ na ihe ọmụma Chineke, Aịsaịa 11:9 na-ekwu, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Tụlee Aịsaịa 48:18.

N’ezie, ihe ọmụma a abụghị nanị ihe ọmụma e bu n’isi. Ọ na-emetụta ụdị onye mmadụ bụ ma na-akwalite àgwà Chineke, ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ n’obi, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịzụlite àgwà ndị a, n’ihi ya kwa, ọbụna ugbu a, e ji paradaịs ime mmụọ dị mma gọzie ha.—Aịsaịa 65:13, 14.

Lee ka ọnọdụ ime mmụọ ha si dị iche na nke ụwa, nke na-adakpukwu n’ime asọpụrụghị Chineke na mmebi! Otú ọ dị, n’isi nso, Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ka ọ dịgodị ugbu a, Ndịàmà Jehova na-akpọ gị òkù ileta—ee, inyocha—paradaịs ime mmụọ ha na-anụ ụtọ ya. Jiri anya gị hụrụ na ugbu a Jisọs, bụ́ Eze eluigwe a na-adịghị ahụ anya, ji nwayọọ na-edu ndị ga-ebi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ aga n’ụzọ ahụ dị warara na-eduga na Paradaịs elu ala ahụ na ndụ agwụghị agwụ!—Matiu 7:13, 14; Mkpughe 7:17; 21:3, 4.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ndị ga-alanarị ọgwụgwụ ụwa a ga-anụ ụtọ ikere òkè n’ime ka ụwa ghọọ paradaịs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya