Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 7/1 p. 28
  • Chineke ò nwere mmalite?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke ò nwere mmalite?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Kere Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isoro Chineke Na-ejegharị—Na-eburu Mgbe Ebighị Ebi N’uche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ànyị Ga-amatali Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 7/1 p. 28

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Chineke ò nwere mmalite?

▪ Baịbụl zara na Chineke enweghị mmalite. Ọ dịghị mgbe Chineke na-adịghị. Ọ bụ ezie na ọ na-esiri anyị ike ịghọta otú ọ ga-esi bụrụ na Chineke dị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, anyị ekwesịtụghị ikwu na ọ bụghị eziokwu n’ihi na anyị agaghị aghọtachali ya.

Ànyị kwesịrị ịtụ anya na anyị ga-aghọtali ụzọ niile nke Chineke? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!” (Ndị Rom 11:33) Anyị agaghị aghọtachali amamihe na ihe ọmụma Chineke otú ahụ nwa a mụrụ ọhụrụ na-agaghị aghọtachali ihe niile banyere nna ya. Ọ bụ ezie na isi ihe Pọl bu n’obi kwuo okwu ndị a si n’ike mmụọ nsọ bụ otú amamihe na ebere Chineke si pụọ iche, okwu ndị a na-egosi na e nwere ihe ndị metụtara Jehova Chineke na ọrụ ya ndị anyị na-agaghị aghọtali. O doro anya na otu n’ime ihe ndị ahụ anyị na-agaghị aghọtali bụ na Chineke enweghị mmalite. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ike ịtụkwasị nnọọ ihe Baịbụl na-akụzi banyere Chineke obi. Jizọs Kraịst kwuru banyere ihe odide ndị dị nsọ, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.

Mozis kpegaara Jehova ekpere, sị: “Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị, ọ dịghịkwa mgbe ị na-agaghị adị.” (Abụ Ọma 90:2, The Holy Bible, New Century Version) N’ebe a, Mozis kọwara na Chineke na-adịru mgbe ebighị ebi n’ụzọ abụọ. Otu bụ na ọ ga-adị ruo mgbe ebighị ebi n’ọdịnihu. Jehova bụ “Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Mkpughe 4:10) N’ihi ya, Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ọdịnihu. Ụzọ nke ọzọ bụ na ọ dị ndụ kemgbe mgbe ebighị ebi gara aga. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, e keghị Chineke eke, o nweghịkwanụ mmalite. Kama nke ahụ, Chineke dị adị kemgbe mgbe ebighị ebi gara aga.

Ihe a na-anaghị ahụ anya na-esiri ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ike nghọta. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ụfọdụ anyị na-ekwere ihe ụfọdụ ndị siiri anyị ike nghọta, dị ka ịgụ oge gaa ihu ma ọ bụ gaa azụ. E nwere ike ịgụ oge gaa ihu ma ọ bụ gaa azụ ruo mgbe a na-agaghị agụtalikwa ya. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike iji nke ahụ tụnyere afọ ndụ Onye Okike anyị?

N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na ọ bụ naanị Chineke ka a na-etu aha ahụ pụrụ iche bụ́ “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Timoti 1:17) Chegodị echiche: Jizọs Kraịst, ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe, na ụmụ mmadụ bi n’ụwa nwechara mmalite n’ihi na e kere ha eke. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Ma, e keghị Chineke eke. Isi ọnwụ na e kere Chineke eke ga-akpata arụmụka na-enweghị isi, nke na-agaghịkwa ebi ebi banyere onye kere Onye Okike. Mba, ọ bụ naanị Jehova dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 90:2) E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Jehova dị “site na mgbe niile ebighị ebi gara aga.”—Jud 25.

Ma, buru n’uche na Chineke ịdị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi gbasara nnọọ anyị. Ilerukwu ekpere Mozis anya ga-eme ka anyị hụ na Chineke ịdị mgbe ebighị ebi na-emesi anyị obi ike na ndụ ebighị ebi o kwere anyị ná nkwa bụ ihe e ji n’aka. A kọwara na Chineke “aghọworo anyị ezigbo ebe obibi site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ” bụ́ nke dị iche ná ndụ anyị na-adị ugbu a nke na-agwụ ngwa ngwa. Dị ka Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, Jehova nọnyeere ndị ya kemgbe, na-anọnyere ha ugbu a, ọ ga-anọnyekwara ha mgbe niile. Ka eziokwu ahụ magburu onwe ya kasie gị obi!—Abụ Ọma 90:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya