Bịaruo Chineke Nso
Ọ Na-achọ Ebe Anyị Na-emezi Emezi
“JEHOVA na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.” (1 Ihe E Mere 28:9) E si n’ike mmụọ nsọ dee okwu ndị a iji mee ka obi anyị jupụta n’ekele maka otú Jehova nweruru mmasị n’ebe anyị nọ. Jehova na-achọ ezi ihe dị anyị n’obi n’agbanyeghị na anyị ezutụdịghị okè. Nke a pụtara nnọọ ìhè n’ihe o kwuru banyere Abaịja, nke dị ná 1 Ndị Eze 14:13.
Abaịja biri n’ezinụlọ ọjọọ. Nna ya, bụ́ Jeroboam, bụ onyeisi nke ọchịchị si n’ezi ofufe dapụ.a Jehova zubere ikpochapụ ụlọ Jeroboam, “dị nnọọ ka mmadụ si ekpopụ nsị.” (1 Ndị Eze 14:10) Ma, Chineke nyere iwu na ọ bụ naanị otu onye n’ezinụlọ Jeroboam, bụ́ Abaịja—onye nọ n’ezigbo ọrịa mgbe ahụ—ka a ga-eli nke ọma.b N’ihi gịnị? Chineke kọwara, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel ahụwo ihe dị mma n’ime ya n’ụlọ Jeroboam.” (1 Ndị Eze 14:1, 12, 13) Olee ihe okwu ndị a na-agwa anyị banyere Abaịja?
Baịbụl ekwughị na Abaịja bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nke na-efe Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe dịtụ mma n’ime ya. Ọ bụ ‘Jehova hụrụ’ ihe a dị mma n’ime ya, ikekwe, ihe ahụ metụtara ofufe Ya. Ndị edemede bụ́ ndị rabaị na-ekwu na ọ ga-abụ na Abaịja na-aga efe ofufe n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem kwa afọ ma ọ bụ na o wepụrụ ndị nche nna ya dowere igbochi ndị Izrel ịga Jeruselem.
N’agbanyeghị ihe ihe a dị mma a hụrụ n’ime Abaịja bụ, ihe ahụ pụrụ iche. Nke mbụ bụ na o si ya n’obi. Ihe a dị mma dị “n’ime ya”—ya bụ, n’obi ya. Nke abụọ abụrụ na ọ pụrụ iche. Abaịja mere ihe a dị mma n’agbanyeghị na ọ nọ “n’ụlọ Jeroboam.” Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Ndị bi n’ebe ma ọ bụ n’ezinụlọ a na-akpa àgwà ọjọọ ma nọgide na-akpa ezi àgwà kwesịrị ka a jaa ha ezigbo mma.” Onye ọzọ kwuru na àgwà ọma Abaịja “pụtara ìhè . . . , otú ahụ kpakpando si akacha enye ìhè mgbe ihu igwe gbara ọchịchịrị, na otú ahụ osisi sida na-akacha ama mma mgbe osisi ndị gbara ya gburugburu na-enweghị akwụkwọ.”
Nke ka nke bụ na ihe e kwuru ná 1 Ndị Eze 14:13 na-akụziri anyị ihe magburu onwe ha banyere Jehova na ihe ọ na-achọ n’ime anyị. Cheta na Chineke ‘hụrụ’ ihe dị mma “n’ime” Abaịja. O doro anya na Jehova nọ na-achọ ihe n’obi Abaịja ruo mgbe Ọ hụrụ obere ihe dị mma. Otu ọkà mmụta kwuru na ọ bụrụ na e jiri Abaịja tụnyere ndị ezinụlọ ya, ọ dị ka otu nkume pel “dị n’ime ikpo nkume.” Jehova nwere mmasị n’ihe a dị mma ma gọzie ya, metụrụ otu onye a nọ n’ajọ ezinụlọ ebere.
Ọ́ naghị emesi anyị obi ike ịmara na Jehova na-achọ ihe ọma n’ime anyị ma jiri ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị na anyị ezughị okè? (Abụ Ọma 130:3) Ịmara nke a kwesịrị ịkpali anyị ịbịaru Jehova, bụ́ Chineke nke na-enyocha obi anyị iji chọta obere ihe ọma ọ bụla dị na ya, nso.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Jeroboam malitere ofufe chi nwa ehi n’alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu iji mee ka ndị ya ghara ịga Jeruselem ife Jehova n’ụlọ nsọ ya dị n’ebe ahụ.
b N’oge Baịbụl, elighị mmadụ nke ọma na-egosi na Chineke na-ewesa onye ahụ iwe.—Jeremaya 25:32, 33.