Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 4/1 p. 8
  • Ihe Baịbụl Zara Ọ̀ Dị Mkpa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Baịbụl Zara Ọ̀ Dị Mkpa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Eziokwu ahụ Ga-eme Ka Unu Pụọ n’Ohu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 4/1 p. 8

Ihe Baịbụl Zara Ọ̀ Dị Mkpa?

“Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—JỌN 8:32.

BAỊBỤL kwuru ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Jizọs. Ihe ndị o kwuru ga-eme ka anyị mata onye Jizọs bụ n’ezie, meekwa ka anyị ghara ikwere ihe ndị na-abụghị eziokwu a na-ekwu banyere Jizọs. Ihe Baịbụl kwuru ọ̀ dị mkpa, ka mmadụ ò kwesịrị ikwere ihe ọ bụla dị ya mma? Ee, ọ dị mkpa. Ọ dị Jehova mkpa. Ọ dị Jizọs mkpa. O kwesịkwara ịdị anyị mkpa.

● Gịnị mere o ji dị Jehova mkpa? Ihe kpatara ya bụ na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jehova chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ ma bie ndụ ebighị ebi. Jizọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa [ya bụ, ụmụ mmadụ] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka . . . onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya . . . nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ gbapụta anyị ná mmehie ma mee ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ọ bụ otú a ka Chineke chọrọ ka ọ dịrị mgbe o kere mmadụ. (Jenesis 1:28) Ọ na-agụkwa Chineke agụụ inye ndị mụtara nke bụ́ eziokwu banyere Ọkpara ya, ma na-eme ihe ndị Jizọs kụziri, ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.

● Gịnị mere o ji dị Jizọs mkpa? Jizọs hụkwara ụmụ mmadụ n’anya. O gosiri otú ọ hụruru anyị n’anya mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà maka anyị. (Jọn 15:13) Ọ maara na ọ bụ ya bụ naanị ụzọ ụmụ mmadụ ga-esi enweta nzọpụta. (Jọn 14:6) O kwesịghị iju anyị anya na Jizọs chọrọ ka ọtụtụ ndị rite uru n’àjà ahụ o ji ndụ ya chụọ maka anyị. Ọ bụ ya mere o ji nye ezigbo ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha kụziere ndị niile bi n’ụwa uche Chineke.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

● Gịnị mere o ji kwesị ịdị anyị mkpa? O doro anya na o nwere ihe ndị dị gị mkpa ná ndụ. Ọ̀ bụ na ọ naghị agụ gị agụụ ka gị na ndị ezinụlọ gị nwee ezigbo ahụ́ ike? Ị́ chọghị ka ihe dịrị gị na ndị ị hụrụ n’anya mma? Jehova ji Ọkpara ya na-enye gị na ndị ị hụrụ n’anya ohere inwe ezigbo ahụ́ ike na ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ahụhụ na ihe mgbu na-agaghị adị na ya. (Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ị̀ ga-achọ ka ihe ndị a ruo gị aka? Ọ bụrụ na ị chọrọ, o nwere ihe i kwesịrị ime.

Legodị anya ọzọ n’amaokwu Baịbụl ahụ anyị ji malite isiokwu a, bụ́ nke sịrị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” Ọ bụrụ na anyị amata eziokwu banyere Jizọs na ọrụ ndị ọ na-arụ iji mezuo uche Chineke, ọ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ ná nsogbu kacha akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ, ya bụ, mmehie na ọnwụ. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ inwere onwe gị, i kwesịrị ‘ịmara eziokwu.’ Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo eziokwu banyere Jizọs nakwa otú eziokwu ahụ ga-esi abara gị na ndị ị hụrụ n’anya uru? Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya