Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 4/1 p. 30-31
  • Maka Ndị Na-eto Eto—E Nyere Mozis Ọrụ Pụrụ Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Maka Ndị Na-eto Eto—E Nyere Mozis Ọrụ Pụrụ Iche
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mbibi E Bibiri Sọdọm na Gọmọra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Gwọrọ Ndị Mmadụ Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Meriri Ọnwụnwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 4/1 p. 30-31

Maka Ndị Na-eto Eto​—E Nyere Mozis Ọrụ Pụrụ Iche

Ihe ị ga-eme: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị e dere n’isiokwu a, were ya na o nwere ebe ị nọ na-ekiri ka ihe ị na-agụ na-eme. Werekwa ya na ị na-anụ ihe ndị ị na-agụ akụkọ ha na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Jehova Chineke na Mozis

Ihe a kọrọ: Otú Jehova si gwa Mozis ka o duru ụmụ Izrel pụọ n’Ijipt.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.​—GỤỌ ỌPỤPỤ 3:1-14; 4:1-17.

Kọwaa otú i chere osisi ogwu ahụ na-enwu ọkụ dị.

․․․․․

Mgbe Mozis nụrụ òkù Chineke kpọrọ ya, bụ́ nke e dere n’Ọpụpụ 3:4, olee otú i chere ihu ya dị, oleekwa ụdị olu o ji zaa Chineke?

․․․․․

Mgbe Mozis na-ajụ Jehova ajụjụ ndị ahụ e dere n’Ọpụpụ 3:11, 13 nakwa n’Ọpụpụ 4:1, 10, olee otú i chere obi dị Mozis?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Jiri ihe e ji eme nchọnchọ ndị i nwere chọpụtakwuo ihe okwu a pụtara: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) Gịnị mere Jehova ji kwuo ihe ahụ mgbe Mozis jụrụ ya aha ya?a

․․․․․

Gịnị ka i chere na ọ bụ ya mere na obi akaghị Mozis ịgakwuru Fero? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 12:3.)

․․․․․

Gịnị ka i chere na ọ bụ ya mere na obi akaghị Mozis ịgakwuru ndị Izrel?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Ihe mere ụmụ mmadụ ji atụ ụjọ ma a gwa ha mee ihe ụfọdụ.

․․․․․

Otú o si bụrụ na Jehova ma gị, marakwa ihe ị ga-emeli.

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Olee ihe ụfọdụ ọ na-abụ ị chọọ ime, obi anaghị aka gị ime ha?

․․․․․

Ya bụrụgodị na o nwere ihe ndị ị na-anaghị emete, olee uru i nwere ike ịbara Jehova Chineke?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? GỊNỊKWA MERE O JI BAARA GỊ URU?

․․․․․

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ isiokwu a n’Ịntanet ma ọ bụ na ị chọrọ isi n’Ịntanet bipụta ya, gaa n’adres anyị bụ́ www.jw.org

Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.jw.org

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndịàmà Jehova ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ ndị nwere ike inyere gị aka ka ị mụtakwuo ọtụtụ ihe na Baịbụl. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova bi gị nso ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị edetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya