Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ A
Mee 15, 2012
© 2012 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Naanị anyị ka ikike ibipụtaghachi ya dị n’aka.
Nke A Na-amụ Amụ
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
JULAỊ 2-8, 2012
Ì Ji Alụmdi na Nwunye, Bụ́ Onyinye Si n’Aka Chineke, Kpọrọ Ihe n’Ezie?
JULAỊ 9-15, 2012
Gbalịsie Ike Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ghara Itisa
JULAỊ 16-22, 2012
Tụkwasị Jehova Bụ́ Chineke nke Na-edebe “Oge na Mgbe A Kara Aka” Obi
JULAỊ 23-29, 2012
IHE ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ NA-EKWU
ISIOKWU NKE 1, 2 PEEJI NKE 3-12
Isiokwu ndị a ga-akọwa ihe mere anyị ji kwesị iso ndụmọdụ Jehova nyere ndị bụ́ di na nwunye. Ha ga-eme ka anyị jiri alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọkwuo ihe. Isiokwu ndị a ga-emekwa ka anyị ghọta ihe mere o ji dị mkpa ịgbalịsi ike ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ghara itisa nakwa otú ime ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi mee ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ.
ISIOKWU NKE 3 PEEJI NKE 17-21
Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụta otú Jehova si bụrụ Onye Ukwu Na-edebe Oge. Ihe ndị anyị ga-amụta ga-eme ka okwukwe anyị nwere na Jehova na n’Okwu ya bụ́ Baịbụl sikwuo ike. Ọ ga-emekwa ka anyị kpebisie ike iji oge anyị na-eme ihe bara uru ka anyị na-eche ka Jehova zọpụta anyị.
ISIOKWU NKE 4 PEEJI NKE 23-27
N’agbanyeghị na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị bụ ndị na-ezughị okè. Ma, anyị chọrọ ịna-egbukepụ ebube Jehova. Isiokwu a ga-akọwa otú anyị ga-esi eme ya. Ọ ga-akọwa ihe anyị ga-eme iji na-eṅomi Chineke ma na-eme ihe ga-atọ ya ụtọ. (Efe. 5:1) Ọ ga-akọwakwa otú anyị nwere ike isi nọgide na-eto Chineke.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
13 Mụ na Ndị Agadi Maara Ihe Bụ Enyi
22 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
28 “Lezienụ Anya Maka Ihe Iko Achịcha Ndị Farisii”
31 Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: N’ebe nnukwu ụgbọala na-akwụsị na Tuluuz, n’obodo Frans. Di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-ezi ndị na-anya ụgbọala ndị ahụ ozi ọma. Ihe karịrị otu puku nnukwu ụgbọala na narị asatọ ndị si mba dị iche iche dị na Yurop na-agafe n’obodo ahụ kwa ụbọchị
FRANS
MMADỤ OLE BI NA YA
62,787,000
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
120,172
NDỊ ỌSỤ ỤZỌ ỌHỤRỤ E NWERE KEMGBE AFỌ ISE GARA AGA
6,517