Inyere Ndị Nọ ná Mkpa Aka
“Onye anya ya na-eme ebere ka a ga-agọzi, n’ihi na o nyetụwo onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nri ya.”—ILU 22:9.
Ihe mere ụfọdụ ndị ji agba Krismas.
Ebe ọ bụ na Jizọs nyeere ndị ogbenye na ndị nọ n’ahụhụ aka ma gwọọ ndị ọrịa, ụfọdụ ndị na-achọkwa ime ka ya. Ha chere na oge kacha mma ime otú ahụ bụ n’oge Krismas maka na ọ bụ n’oge ahụ ka ọtụtụ ndị ji arịọ ka e nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.
Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike inyere ndị nọ ná mkpa aka n’oge Krismas?
N’oge Krismas, ọtụtụ ndị anaghị enwe ohere. Ọ bụ n’oge ahụ ka ha ji aga azụ ihe n’ahịa ma na-ele ndị mmadụ ọbịa. Ọ bụkwa oge ha ji aga eleta ndị ikwu na ibe ha. Ha meecha ihe a niile, ike na-agwụcha ha, ha anaghịzi enwe ohere, ume, ma ọ bụkwanụ ego ha ga-eji gaa leta ndị ogbenye ma ọ bụ ndị nọ ná mkpa. Naanị ihe ha nwere ike ime bụ izigara ha obere ego.
Otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka.
“Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya, mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Ọ bụghị naanị n’oge Krismas ka ihe na-akọ ndị ogbenye ma ọ bụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ. Ọ bụrụ na ị chọpụta na mmadụ nọ ná mkpa, ya abụrụkwa na “ọ dị n’ike aka gị” inyere onye ahụ aka, nyere onye ahụ aka mgbe ahụ, echela ka oge Krismas ruo. Chineke ga-agọzi gị maka ihe ọma i meere onye ahụ.
“Kwa ụbọchị mbụ n’izu, ka onye ọ bụla n’ime unu nọrọ n’ụlọ ya wepụta ihe ma debe ya dị ka ihe si na-agara ya nke ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 16:2) Ọ bụ Ndị Kraịst oge ochie, bụ́ ndị chọrọ inyere ndị ogbenye aka, ka Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ a. Oleekwanụ maka gịnwa? Ọ́ gaghị adị mma ka ‘ị na-ewepụta’ ego ị ga na-enye ndị mmadụ ma ọ bụ ndị ọrụ ebere bụ́ ndị ị ma na ha ga-eji ego ahụ nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka? Ime otú a ga-eme ka i nwee ike isi n’ihe i nwere na-enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.
“Unu echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 13:16) Ị̀ hụrụ na ihe ebe a kwuru abụghị naanị na anyị kwesịrị ‘inye ndị ọzọ ihe’? O kwukwara na anyị kwesịrị ‘ịna-emere ha ihe ọma.’ Dị ka ihe atụ, ezigbo nne na nna na-akụziri ụmụ ha ka ha na-enyere ndị agadi aka kwa ụbọchị, ka ha na-aga eleta ndị ọrịa ma ọ bụkwanụ na-akpọ ha na fon. Ha na-akụzikwara ha ka ha ghara ịsọ ụmụaka nwere nkwarụ ma ọ bụ ụmụaka ndị ọ na-enweghị otú ọ hà ha asọ. Ihe ndị a na-eme ka ụmụntakịrị mụta inye ndị ọzọ ihe na ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma mgbe niile n’afọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ezigbo nne na nna na-akụziri ụmụ ha ka ha na-enyere ndị agadi, ndị ọrịa, na ụmụaka ndị ọ na-enweghị otú ọ hà ha aka. Ihe ndị a na-eme ka ụmụntakịrị mụta inye ndị ọzọ ihe na ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma mgbe niile n’afọ