Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Jenụwarị 15, 2013
© 2013 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Naanị Anyị Ka Ikike Ibipụtaghachi Ya Dị n’Aka.
NKE A NA-AMỤ AMỤ
FEBỤWARỊ 25, 2013–MACH 3, 2013
Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
MACH 4-10, 2013
Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Ịnọ Jehova Nso
MACH 11-17, 2013
MACH 18-24, 2013
Ijere Chineke Ozi n’Akwaghị Mmakwaara
MACH 25-31, 2013
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
Baịbụl kwuru banyere ọtụtụ ndị nwere okwukwe na obi ike. Ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ha mere, ọ ga-enyere anyị aka inwe okwukwe ma jiri obi ike na-efe Jehova. N’isiokwu a, anyị ga-amụ banyere isiokwu afọ 2013.
▪ Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Ịnọ Jehova Nso
▪ Na-abịaru Jehova Nso
E nwere ọtụtụ ihe anyị na-enweghị ike iji aka anyị kpebie, dị ka ihe atụ, ndị ga-abụ nne anyị na nna anyị na ụmụnne anyị, na ebe a ga-amụ anyị. Ma, anyị nwere ike iji aka anyị kpebie ma ànyị ga-anọ Jehova nso ka ọ̀ bụ na anyị agaghị anọ ya nso. N’isiokwu abụọ a, anyị ga-atụle ihe asaa anyị na-ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.
▪ Ijere Chineke Ozi n’Akwaghị Mmakwaara
O doro anya na e nwere ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga, bụ́ ndị ọ ga-adị anyị ka anyị gaghachi gaa mezie. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-emetaghị, o nwere ike ime ka anyị ghara iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú ihe Pọl onyeozi mere ga-esi nyere anyị aka ịna-ejere Jehova ozi n’akwaghị mmakwaara.
▪ Ndị Okenye Ọgbakọ Bụ ‘Ndị Ọrụ Ibe Anyị Maka Ọṅụ Anyị’
N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt, o kwuru banyere onwe ya na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ, sị: “Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu.” (2 Kọr. 1:24) Gịnị ka ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ Pọl kwuru? Oleekwa otú anyị ga-esi na-agba ibe anyị ume iji ọṅụ na-efe Chineke? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
3 Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Nọọwee
32 Otú Mkpọsa A Haziri nke Ọma Si Baa Uru
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ebe otu nwanna na nwunye ya, bụ́ ndị larala ezumike nká, na-amụrụ mmadụ Baịbụl n’ihu ụlọ ya n’obodo Kamp Perin. E nwere ụmụnna bụ́ ndị Heiti bi ná mba ọzọ. Ma dị ka nwanna a na nwunye ya, ụfọdụ n’ime ha na-alaghachi Heiti ka ha gaa jewe ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma
HEITI
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
17,954
MMADỤ OLE OTU ONYE NKWUSA KETARA
557
MMADỤ OLE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL
35,735