Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 2/15 p. 30
  • O Si n’Ezinụlọ Keyafas

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Si n’Ezinụlọ Keyafas
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Ihe Mgbe Ochie nke Na-agba Akaebe na Jizọs Biri n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nnukwu Onye Nchụàjà nke Mara Jizọs Ikpe Ọnwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • A Kpọọrọ Jizọs Gakwuru Anas, Mechaa Kpọrọ Ya Gakwuru Keyafas
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mgbe A Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 2/15 p. 30

O Si n’Ezinụlọ Keyafas

[Foto dị na peeji nke 30]

a bụ ọgba a na-edewe igbe ndị e tinyere ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ n’oge ochie

Mgbe ụfọdụ, ihe e dere n’ihe ndị ọkachamara gwutere n’ala na-egosi na ọ bụ onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl nwe ihe ahụ ma ọ bụ na onye ahụ na onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl mekọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2011, ndị ọkà mmụta n’Izrel dere banyere ihe a chọtara nke gosiri na onye nwe ihe ahụ na onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl mekọrọ ihe. Ihe ha chọtara bụ igbe a chọrọ mma, nke e ji ụrọ na-acha nzu nzu rụọ. Ihe dị na ya bụ ọkpụkpụ onye nwụrụ anwụ. Igbe ahụ anọruola puku afọ abụọ.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ihe e dere n’igbe ahụ bụ: “Miriam ada Yeshua nwa Keyafas, onye nchụàjà Meazaya, onye Bet Imraị.” Nnukwu onye nchụàjà nke so kpee Jizọs ikpe ma maa ya ikpe ọnwụ bụ Keyafas. (Jọn 11:48-50) Ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Fleviọs Josifọs, kpọrọ ya “Josef, onye a na-akpọ Keyafas.” O doro anya na onye nwe igbe ahụ bụ onye ikwu Keyafas. Ihe e dere n’ụdị igbe ahụ a chọtaburu, nke e chere na ọ bụ nke nnukwu onye nchụàjà ahụ, bụ “Yehosef nwa Keyafa,” ya bụ, Josef, nwa Keyafas.a N’ihi ya, Miriam bụ onye ikwu Keyafas.

Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Mgbe Ochie n’Izrel kwuru na ndị ha natara igbe ahụ e tinyere ọkpụkpụ Miriam bụ ndị gara zuo ohi n’ebe e liri ndị mgbe ochie. Mgbe a tụlechara ihe ahụ e gwutere na ihe e dere na ya, o doro anya na ọ bụ nke Miriam, bụ́ onye si n’ezinụlọ Keyafas.

E nwere ihe ọzọ igbe ahụ e tinyere ọkpụkpụ Miriam mere ka anyị mata. O kwuru banyere Meazaya, nke ezinụlọ ya bụ ndị ikpeazụ n’ime ụzọ iri abụọ na anọ e kere ndị nchụàjà ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (1 Ihe 24:18) Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Mgbe Ochie n’Izrel kwuru na ihe ahụ e dere n’igbe ahụ gosiri na e nwere ihe jikọrọ “ezinụlọ Keyafas na ezinụlọ Meazaya.”

Ihe ahụ e dere kpọkwara aha Bet Imraị. E nwere ụzọ abụọ e nwere ike isi kọwaa aha ahụ e dere. Ụlọ ọrụ ahụ kwuru, sị: “Ụzọ nke mbụ bụ na Bet Imraị nwere ike ịbụ aha otu ezinụlọ ndị nchụàjà, ya bụ, ụmụ Ịma (Ezra 2:36-37; Nehemaya 7:39-42), bụ́ ndị ụmụ Meazaya so n’ụmụ ụmụ ha. Ụzọ nke abụọ e nwere ike isi kọwaa ya bụ na Bet Imraị bụ obodo Miriam ma ọ bụ obodo ndị ezinụlọ ha niile.” Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, igbe ahụ e tinyere ọkpụkpụ Miriam mere ka o doo anya na ndị Baịbụl kpọrọ aha bụ ndị dịrị ndụ, ndị nwekwara ezinụlọ ha si.

a Ị chọọ ịgụkwu banyere igbe e tinyere ọkpụkpụ Keyafas, gụọ isiokwu bụ́ “Nnukwu Onye Nchụàjà nke Mara Jizọs Ikpe Ọnwụ,” n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2006, peeji nke 10-13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya