Isi 91
Mgbe A Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
JISỌS na ndị sonyeere ya erutewo ugbu a n’ili Lazarọs. N’ezie, ọ bụ ọ́gbà nke e ji nkume dọchie ọnụ ya. Jisọs na-asị, “Wepụnụ nkume ahụ.”
Mata kwuru ka a ghara ime otú ahụ, n’amatabeghị ihe Jisọs na-ezube ime. Ọ na-asị, “Onyenwe anyị, ọ na-esi ísì ugbu a: n’ihi na nke a mere ya ụbọchị anọ ọ nwụrụ.”
Ma Jisọs na-ajụ, sị: “Ásịghị m gị na, ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?”
Ya mere e bupụrụ nkume ahụ. Mgbe ahụ Jisọs weliri anya ya elu na-ekpe ekpere, sị: “Nna, ekelee m gị na ị nụrụ olu m. Ma mụ onwe m matara na ị na-anụ olu m mgbe nile: ma n’ihi ìgwè mmadụ a nke guzoro gburugburu ka m kwuru ya, ka ha wee kwere na ọ bụ gị onwe gị zitere m.” Jisọs kpere ekpere n’ihu ọha ka ndị mmadụ wee mara na a gaje imezu ihe ahụ ọ na-achọ ime site n’ike nke a natara n’aka Chineke. Mgbe ahụ o tiri mkpu n’oké olu, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí.”
Ka o tiri mkpu ahụ, Lazarọs pụtara. Ákwà e ji eke ozu ka kechitakwara aka na ụkwụ ya, e jikwa ákwà kpuchite ihu ya. Jisọs kwuru sị, “Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa.”
Mgbe ha hụrụ ọrụ ebube ahụ, ọtụtụ n’ime ndị Juu bịara ịkasi Meri na Mata obi nwere okwukwe n’ebe Jisọs nọ. Otú ọ dị, ndị ọzọ pụrụ ije gwa ndị Farisii ihe merenụ. Ha na ndị isi nchụàjà mere ndokwa ozugbo ahụ ka e nwee nzukọ nke nnọkọ ikpe ukwu nke ndị Juu, bụ́ Sanhedrin.
Nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ gụnyere onye isi nchụàjà e nwere na mgbe ahụ, bụ́ Kaịafas, nakwa ndị Farisii na ndị Sadusii, ndị isi nchụàjà, na ndị bụbu ndị isi nchụàjà. Ndị a kwara arịrị, sị: “Gịnị ka anyị na-eme? N’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.”
Ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe ahụ kwere na Jisọs “na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama,” nanị ihe ha na-echegbu onwe ha banyere ya bụ ọnọdụ nke onwe ha na ịchịisi ha. Ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ bụ ihe mmechuihu karịsịa nye ndị Sadusii, ebe ọ bụ na ha ekweghị ná mbilite n’ọnwụ.
Kaịafas, nke bụ onye Sadusii ma eleghị anya na-ekwu ugbu a, sị: “Unu onwe unu amataghị ihe ọ bụla, unu atụleghịkwa uche na ọ baara unu uru ka otu onye nwụọ n’ọnọdụ ndị Juu, ka mba anyị dum ghara ịlakwa n’iyi.”
Chineke kwaliri Kaịafas ikwu nke a n’ihi na Jọn onyeozi mesịrị dee, sị: ‘Ma [Kaịafas] ekwughị nke a site n’onwe ya.’ Ihe Kaịafas bu n’uche n’ezie bụ na e kwesịrị igbu Jisọs iji gbochie Ya ịga n’ihu iweda ọnọdụ ha nke ịchịisi na inwe ùgwù. Ma, dị ka Jọn si kwuo, ‘Kaịafas buru amụma na Jisọs gaje ịnwụ, ọ bụghị nanị n’ihi mba ahụ, kama ka e wee meekwa ka ụmụ Chineke ndị gbasaworo zukọọ n’otu.’ N’ezie, ọ bụkwa nzube Chineke ka Ọkpara ya nwụọ dị ka ihe mgbapụta nye mmadụ nile.
Ugbu a Kaịafas nwekwara ihe ịga nke ọma n’ịkpali nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ ime atụmatụ iji gbuo Jisọs. Ma Jisọs, ebe ọ matara banyere atụmatụ ndị a, ma eleghị anya site n’ọnụ Nikọdemus, bụ́ onye so ná nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ, onye ya na ya bụ enyi, si ebe ahụ gbapụ. Jọn 11:38-54.
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpee ekpere n’ihu ọha tupu ọ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ?
▪ Olee otú ndị hụrụ mbilite n’ọnwụ nke a si meghachi omume banyere ya?
▪ Gịnị kpughere obi ọjọọ nke ndị nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ?
▪ Gịnị bụ nzube Kaịafas, ma olee amụma Chineke ji ya mee ihe n’ibu?