Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Jenụwarị 15, 2014
© 2014 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania.
NKE A NA-AMỤ AMỤ
MACH 3-9, 2014
Fee Jehova, Bụ́ Eze Mgbe Ebighị Ebi
MACH 10-16, 2014
Olee Uru Otu Narị Afọ Jizọs Chịrịla Baara Gị?
MACH 17-23, 2014
Mee Mkpebi Ziri Ezi Ugbu A Ị Na-eto Eto
MACH 24-30, 2014
Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute
MACH 31, 2014–EPREL 6, 2014
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ Fee Jehova, Bụ́ Eze Mgbe Ebighị Ebi
Isiokwu a ga-eme ka a ghọta na Jehova bụ Eze kemgbe ụwa nakwa otú o sirila gosi na ihe niile o kere n’eluigwe na n’ụwa nọ n’okpuru ya. Ọ ga-agbakwa anyị ume iṅomi ndị fere Jehova, bụ́ Eze mgbe ebighị ebi, n’oge ochie.
▪ Olee Uru Otu Narị Afọ Jizọs Chịrịla Baara Gị?
Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọtakwuo ihe Alaeze Mesaya merela kemgbe otu narị afọ ọ chịwara n’eluigwe. Ọ ga-agba onye ọ bụla n’ime anyị ume iji obi ya niile na-akwado Alaeze Chineke. Ọ ga-emekwa ka anyị chebara ihe isiokwu afọ 2014 pụtara echiche.
▪ Mee Mkpebi Ziri Ezi Ugbu A Ị Na-eto Eto
▪ Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute
Gịnị ka m ga-eji ndụ m mee? Ihe a bụ ajụjụ dị mkpa onye ọ bụla kpebiri ife Jehova kwesịrị ịjụ onwe ya. N’isiokwu abụọ a, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto aka iji obi ha niile na-ejere Chineke ozi. Anyị ga-atụlekwa ụzọ dị iche iche Ndị Kraịst katawarala ahụ́ nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi.
▪ Olee Mgbe ‘Alaeze Chineke Ga-abịa’?
Mere nke a mere nke a ekweghị ọtụtụ ndị mata ihe ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a pụtara nakwa na Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a n’oge na-adịghị anya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ mere obi ji kwesị isi anyị ike na ọ gaghị adị anya Alaeze Chineke ebibie ụwa ochie a.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ebe a na-ezi ụmụ akwụkwọ mahadum ozi ọma. Ha si mba ọzọ bịa ịgụ akwụkwọ n’obodo Luvif
YUKREN
MMADỤ OLE BI NA YA
45,561,000
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
150,887
Ọgbakọ e nwere na ya dị 1,737. Ìgwè nta na-aghọbeghị ọgbakọ dị 373. Ha niile na-amụ ihe n’asụsụ 15. Ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ bụ Họngerian, Romenian, Rọshịan, Asụsụ Ndị Ogbi nke Rọshịa, na Yukrenian