Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 5/1 p. 11
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mbọ Aka Gị—Ị̀ Na-elekọta Ha?
    Teta!—1998
  • Devid na Golayat
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 5/1 p. 11

Ị̀ MAARA?

Gịnị mere e ji akụjisi ndị omekome ụkwụ ma a kpọgide ha n’osisi?

E nwere ihe Oziọma Jọn kwuru banyere Jizọs na ndị omekome abụọ a kpọgidere ha na ya n’osisi. Ọ sịrị: ‘Ndị Juu rịọrọ Paịlet ka o mee ka a kụjisie ha ụkwụ, ka e bupụkwa ozu ha.’—Jọn 19:31.

Ebe Jizọs nọ n’elu osisi a kpọgidere ya

E kwuru n’iwu ndị Juu na ọ bụrụ na e gbuo onye omekome ma kwụwa ozu ya n’osisi, a gaghị ahapụ ozu ya “n’elu osisi abalị dum.” (Diuterọnọmi 21:22, 23) Ọ ga-abụkwa na ndị Juu na-eme ihe a e kwuru n’iwu ha ma ndị Rom kpọgbuo ndị Juu n’osisi. Ihe mere ndị Juu ji rịọ Paịlet ka a kụjisie Jizọs na ndị omekome abụọ ahụ ụkwụ bụ na ha chọrọ ka ha nwụọ ngwa ngwa ka e nwee ike ili ha tupu Ụbọchị Izu Ike amalite ná mgbede.

Otú ndị Rom na-esikarị akpọgbu ndị omekome bụ na ha na-eji ntu akụgide aka onye omekome na ụkwụ ya n’osisi. E bulie osisi ahụ elu, ụfụ ga na-afụ ya abụghị ihe e ji ọnụ ekwu n’ihi na ihe ji ahụ́ ya niile bụ ntu ahụ a kụgidere ya n’ụkwụ na n’aka. Ọ bụrụ na onye ahụ achọọ ikuru ume, ọ ga-agbagidesi ụkwụ ike ná ntu a kụrụ ya n’ụkwụ ka o nwee ike ibuli onwe ya elu kuru ume. Ma, ọ gaghị emeli ya ma a kụjisie ya ụkwụ. Ọ ga-anwụ n’egbughị oge maka na ọ naghịzi eku ume nke ọma ma ọ bụkwanụ ya anwụọ maka na ọbara anaghịzi agazu ya ahụ́.

Olee otú e si eji èbè alụ agha n’oge ochie?

Ọ bụ èbè ka Devid ji gbuo otu nwoke gbara ajọ dimkpa aha ya bụ Golayat. Ọ ga-abụ na Devid mụtara otú e si agba èbè n’oge ọ na-azụ atụrụ mgbe ọ bụ nwata.—1 Samuel 17:40-50.

Ihe a kpụrụ n’ahụ́ ájá nke gosiri ebe ndị agha Asiria na-agba èbè

Ihe a kpụrụ n’ahụ́ ájá nke gosiri ebe ndị Asiria ji èbè na-alụso obodo ndị juu agha

E nwere ọtụtụ ihe ndị Ijipt na ndị Asiria kpụrụ n’ahụ́ ájá n’oge Baịbụl. Èbè so na ha. Èbè bụ obere akpụkpọ anụ ma ọ bụ obere ákwà nwere oghere e kegidere eriri n’isi ya abụọ. Onye na-agba èbè na-etinye nkume kwọrọ mụrụmụrụ ma ọ bụ dị okirikiri n’etiti obere akpụkpọ anụ ahụ ma ọ bụ obere ákwà ahụ. Nkume ahụ nwere ike ịha ka obere oroma. Ọ na-efegharị èbè ahụ n’elu isi ya ma hapụ otu n’ime eriri abụọ ahụ ka nkume ahụ gbapụ. Ọ bụrụ na ọ gbapụ, ọ na-efere gaa kụọ n’ihe a chọrọ ka ọ kụọ.

A hụla ọtụtụ nkume ndị na-agba èbè ji lụọ agha n’oge ochie. A hụrụ ha n’ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie gwupụtara n’Izrel nakwa ná mba ndị gbara ya gburugburu. Ndị bụ́ aka ochie n’ịlụ agha nwere ike iji èbè ha gbapụ nkume otú ọ ga-eji oké ọsọ gaa kụọ n’ihe a chọrọ ka ọ kụọ. Ọsọ ọ ga-eji nwere ike ịkarị nke ụgbọala na-efe ọsọ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwuola na ọ bụrụ na e jiri èbè gbapụ nkume, o nwere ike iru ebe akụ́ a gbapụrụ agbapụ ga-eru. Ma, otu ihe doro anya bụ na otú ahụ e nwere ike iji ụta gbaa mmadụ akụ́, onye ahụ anwụọ, ọ bụkwa otú ahụ ka e nwere ike iji èbè gbaa mmadụ nkume, onye ahụ anwụọ.—Ndị Ikpe 20:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya