Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 5/15 p. 13
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Obe
    Teta!—2017
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 5/15 p. 13

AJỤJỤ NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ

Ndị Izrel oge ochie hà na-akwụgbu ndị omekome n’osisi?

N’oge ochie, otú ọtụtụ mba si egbu ndị omekome bụ ịkwụgbu ha n’osisi. Ndị Rom na-ekedo ụdị onye ahụ n’osisi ma ọ bụ kpọgide ya n’osisi. Onye ahụ nwere ike ịnọ ebe ahụ ruo ụbọchị ole na ole tupu ahụ́ ụfụ, akpịrị ịkpọ nkụ, agụụ, anwụ ma ọ bụ mmiri ozuzo egbuo ya. Ndị Rom weere na ụdị ahụhụ na-emenye ihere e kwesịrị ịta onye kacha kpaa arụ bụ ịkwụgbu ya n’osisi.

Ndị Izrel oge ochie hà na-eme ụdị ihe ahụ? Jehova nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ, e wee gbuo ya, i wee kwụwa ya n’osisi, ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị dum; kama ị ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ.” (Diut. 21:22, 23) N’ihi ya, o doro anya na n’oge a na-ede Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-ebu ụzọ gbuo onye a mara ikpe ọnwụ tupu a kwụwa ya n’osisi.

Ọ bụ ya mere Levitikọs 20:2 ji sị: “Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel nakwa onye ọ bụla n’ime ndị mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’Izrel, nke nyere Molek nwa ya ọ bụla, a ghaghị igbu ya. Ndị ala unu ga-eji nkume tụgbuo ya.” A na-egbukwa ndị “nwere mmụọ ịgba afa ma ọ bụ mmụọ ịkọ ọdịnihu.” Olee otú e si egbu ha? ‘A na-eji nkume tụgbuo ha.’—Lev. 20:27.

Diuterọnọmi 22:23, 24 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwee nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke nwoke kwere nkwa ọlụlụ, nwoke ọzọ ewee hụ ya n’obodo, ya na ya ewee dinaa, unu ga-akpọpụta ha abụọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma were nkume tụgbuo ha. Nwa agbọghọ ahụ ga-anwụ n’ihi na o tighị mkpu n’obodo, nwoke ahụ ga-anwụkwa n’ihi na o wedara nwunye nwoke ibe ya n’ala. Ị ga-esi otú a kpochapụ ihe ọjọọ n’etiti unu.” Otú e si egbu ndị kacha kpaa arụ n’Izrel oge ochie bụ iji nkume tụgbuo ha.a

O doro anya na n’oge a na-ede Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-ebu ụzọ gbuo onye a mara ikpe ọnwụ tupu a kwụwa ya n’osisi

Diuterọnọmi 21:23 sịrị: “Ihe a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ ka onye a kwụwara n’osisi bụ.” Onye omekome bụ onye “a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ.” Ihe mere ndị Izrel ji akwụwa ozu onye omekome n’osisi bụ iji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị.

a Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na a na-ebu ụzọ gbuo onye omekome tupu a kwụwa ya n’osisi dị ka Iwu Mozis kwuru. Ma, e nwere ihe gosiri na n’oge Jizọs na ndị ozi ya, ndị Juu na-akpọgide ụfọdụ ndị omekome n’osisi, ha anọrọzie ebe ahụ nwụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya