Isiokwu Ndị Dị́ n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 26, 2016 RUO JENỤWARỊ 1, 2017
4 “Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”
Ọ bụ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst kacha agba ndị ọzọ ume. Pọl onyeozi ghọtakwara na ịgba ndị ọzọ ume dị ezigbo mkpa. Ime ihe ha mere ga-enyere anyị niile aka ịhụ ndị ọzọ n’anya ma na-agba ha ume, ma n’ezinụlọ ma n’ọgbakọ.
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 2 RUO 8, 2017
9 Chineke Haziri Ndị Ya Otú Akwụkwọ Nsọ Kwuru
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 9 RUO 15, 2017
14 Ì Ji Okwu Chineke Bụ́ Baịbụl Kpọrọ Ihe?
Ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu abụọ a bụ: Gịnị mere e ji kwesị ịhazi ndị na-efe Jehova ahazi? Olee otú Chineke si hazie anyị otú Akwụkwọ Nsọ kwuru? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji obi anyị niile na-akwado nzukọ Jehova?
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 16 RUO 22, 2017
21 Ndị A Kpọpụtara n’Ọchịchịrị
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 23 RUO 29, 2017
Isiokwu abụọ a ga-akọwa mgbe Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ndị Chineke n’agha nakwa mbọ Ndị Kraịst e tere mmanụ gbara ịghọta Okwu Chineke nke ọma n’ihe dị ka afọ 1870. Anyị ga-eleba anya n’ihe Ndị Mmụta Baịbụl katara obi mee gbasara Babịlọn Ukwu ahụ. Anyị ga-amụtakwa mgbe Chineke napụtara ha.