Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 2 p. 3-4
  • Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị Ji Dị Oké Ọnụ Ahịa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Olee Onyinye Kacha Onyinye Niile?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Jizọs Kraịst—Otú Ozi Ya Si Gbasa Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 2 p. 3-4
Ebe otu agadi nwoke na-enye otu nwatakịrị ihe e ji aka pensụl yiri ụgbọ mmiri

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ANABATA ONYINYE KACHANỤ CHINEKE NYERE ANYỊ?

Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị

E NWERE otu nwatakịrị nwoke aha ya bụ Jordan. Otu nwoke ya na ezinụlọ ha dị ná mma nyere ya ihe e ji aka pensụl yiri ụgbọ mmiri. Aha nwoke ahụ bụ Russell. Ihe a o nyere ya nwere ike iyi ka o nweghị oké ihe ọ bụ, ma ọ bụ otu n’ime ihe ndị Jordan ji kpọrọ ezigbo ihe. Jordan kwuru, sị: “O nyere m ihe a mgbe m dị obere.” Mgbe Russell nwụrụ, Jordan nụrụ na o nyeere nna mama ya aka, nyekwara nne na nna ya ezigbo aka mgbe ihe siiri ha ike. Jordan mechara kwuo, sị: “Ugbu a m matakwuru onye Russell bụ, m jizi onyinye a o nyere m kpọrọ ihe karịa.”

Ihe a a kọrọ gbasara Jordan na-egosi na ihe e nyere mmadụ nwere ike ịdị ndị ọzọ ka ihe na-abachaghị uru. Ma o nwere ike ịbụ oké ihe n’anya onye ahụ e nyere ya. E nwere otu onyinye na-enweghị atụ Baịbụl kwuru gbasara ya. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Onyinye a Chineke nyere nwere ike ime ka onye nabatara ya nwee ndụ ebighị ebi. È nwere ihe ọzọ a ga-enye mmadụ ga-abara ya uru karịa ihe ga-eme ka ọ dị ndụ ebighị ebi? Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike ha amachaghị uru onyinye a bara, ma ezigbo Ndị Kraịst weere ya ka ihe dị “oké ọnụ” ahịa. (Abụ Ọma 49:8; 1 Pita 1:18, 19) Gịnị mere Chineke ji nye Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka ụmụ mmadụ?

Pọl onyeozi kọwara ihe mere o ji mee ya. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile.” (Ndị Rom 5:12) Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam kpachaara anya nupụrụ Chineke isi. Ọ bụ ya mere o ji nwụọ. Ọnwụ sizi n’aka ya rute ụmụ ya niile, ya bụ, mmadụ niile.

Baịbụl kwuru na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi.” (Ndị Rom 6:23) Chineke zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst n’ụwa ka o jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka ọnwụ. Àjà a ga-eme ka ndị niile nwere okwukwe na Jizọs nweta ndụ ebighị ebi. Ihe a na-akpọ àjà ahụ bụ ‘ihe mgbapụta.’—Ndị Rom 3:24.

Chineke ga-esi n’aka Jizọs Kraịst gọzie ndị niile na-efe ya. Pọl kwuru banyere ngọzi a, sị: “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.” (2 Ndị Kọrịnt 9:15) N’eziokwu, ihe mgbapụta bụ onyinye magburu onwe ya nke na anyị agaghị akọwachali uru ọ bara. Ma, n’ime onyinye niile Chineke nyere anyị, gịnị mere ihe mgbapụta ahụ ji pụọ iche?a Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya? Biko, gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere ajụjụ ndị a n’isiokwu abụọ na-esonụ.

a Jizọs ji obi ya niile ‘tọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi anyị.’ (1 Jọn 3:16) Ma, ebe ọ bụ Chineke chọrọ ka Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà, isiokwu atọ mbụ dị n’Ụlọ Nche a kọwara otú Chineke si nye anyị ihe mgbapụta ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya