Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
3 Akụkọ Ndụ—Iso Ndị Maara Ihe Na-eje Ije Abaarala M Uru
IZU NA-AMALITE NA MEE 1 RUO 7, 2017
8 Na-asọpụrụ Ndị E Kwesịrị Ịsọpụrụ
Ndị Kraịst kwesịrị ịma otú ha ga-esi na-asọpụrụ ndị ọzọ. Olee ndị e kwesịrị ịna-asọpụrụ? Maka gịnị? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a. Ọ ga-emekwa ka anyị mata uru anyị ga-erite ma anyị na-asọpụrụ ndị anyị kwesịrị ịsọpụrụ.
IZU NA-AMALITE NA MEE 8 RUO 14, 2017
13 Nwee Okwukwe, Jiri Amamihe Na-ekpebi Ihe Ị Ga-eme
Baịbụl kwuru na onye ọ bụla kwesịrị iji aka ya na-ekpebi ihe ọ ga-eme. Ma, gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpebi ihe ga-abara anyị uru? Gịnị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ? È nwere mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ịgbanwe ihe anyị kpebiri ime? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a.
IZU NA-AMALITE NA MEE 15 RUO 21, 2017
18 Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova
IZU NA-AMALITE NA MEE 22 RUO 28, 2017
23 Ị̀ Ga-echebara Ihe Ndị E Dere n’Oge Gara Aga Echiche?
Anyị niile na-emejọ n’ihi na anyị bụ ndị na-ezughị okè. Ma, ọ̀ pụtara na anyị agaghị emeli ihe dị Jehova mma? N’isiokwu abụọ a, anyị ga-amụ gbasara ndị eze anọ chịrị Juda na ihe ndị ha mejọrọ. Ụfọdụ n’ime ha mere mmehie dị oké njọ. Ma, Jehova weere ndị eze anọ ahụ ka ndị ji obi ha niile fee ya. Chineke ọ̀ ga-ewere anyị ka ndị ji obi ha niile na-efe ya n’agbanyeghị ihe ndị anyị na-emejọ?