Nzukọ Ije Ozi Maka November
Izu Na-amalite November 6
Abụ 6 (4)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Tụkwasịnụ Uche Unu n’Ihe Ndị Dị n’Elu.” Ajụjụ na azịza.
20 min: “Ihe Nile E Deworo n’Akwụkwọ Nsọ Bara Uru Iji Zie Ihe.” Okwu na ntụle a ga-eso ndị na-ege ntị mee. Mee ihe ngosi abụọ a kwadebere nke ọma.
Abụ 78 (104) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 13
Abụ 33 (13)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo Maka Ezi Ọrụ Nile.” Okwu na-ekpo ọkụ nke okenye ga-ekwu na paragraf nke 1-9.
20 min: “Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo Maka Ezi Ọrụ Nile.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 10-15. Gosipụta mkpa ọgbakọ na ụzọ mmadụ nile pụrụ isi nye enyemaka.
Abụ 156 (68) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 20
Abụ 64 (35)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọta Abamuru nke Bible.” Onye okenye esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ kwurịta ihe mere anyị kwesịrị ime nletaghachi ná nzube nke ịmalite ọmụmụ Bible. Tụleghachi, mgbe ahụkwa mee ihe ngosi ndị a tụrụ aro ha maka nletaghachi, dị ka n’oge mmụgharị ihe.
20 min: “Na-ebinụ Obi n’Ụzọ Kwesịrị Ozi Ọma Ahụ.” Ajụjụ na azịza. Kwuo okwu gaa n’ihu na-adabere n’Ụlọ Nche June 15, 1989, peji nke 16-17, paragraf nke 5-9.
Abụ 23 (22) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 27
Abụ 96 (81)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
13 min: “Ịgachi Nzukọ Anya Dị Mkpa Nye Nguzosi Ike Anyị.” Okwu na ntụle a ga-eso ndị na-ege ntị mee.
15 min: “Idozi Esemokwu n’Ịhụnanya Ndị Kraịst.” Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nile.
12 min: Inyefe Akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ n’Ọnwa December. Tụleghachi akụkụ ndị mara mma nke akwụkwọ ahụ—isiakwụkwọ ndị na-adọrọ adọrọ na ihe osise ndị mara mma, tinyere ịdị mfe nke nkọwa na iji nkà na-eji ajụjụ eme ihe. Họpụta isiokwu nkwurịta okwu ole na ole bụ́ ndị ga-amasị ndị mmadụ n’ókèala ahụ. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ dị mkpirikpi. Gbaa mmadụ nile ume iji akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu mee ihe nke ọma na December.
Abụ 8 (43) na ekpere mmechi.