Nzukọ Ije Ozi Maka December
Izu Na-amalite December 4
Abụ 181 (92)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Too Jehova Kwa Ụbọchị.” Ajụjụ na azịza. Mee ka a gụọ paragraf nile. Mee ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kọọ ahụmahụ ndị na-agba ume ha nwere mgbe ha na-agba àmà mberede.
20 min: “Inyefe Akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.” Onye okenye atụlee akụkụ ndị gbara ọkpụrụkpụ nke ọmarịcha akwụkwọ a, mgbe ahụkwa mee ndokwa maka ọtụtụ ihe ngosi ndị dị nkenke na-egosi ụzọ a pụrụ isi tinye aro ndị dị n’isiokwu ahụ n’ọrụ n’ubi. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè ná nkwụsị izu.
Abụ 224 (106) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 11
Abụ 201 (66)
13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ná mkpirikpi ihe ụfọdụ mere anyị kwesịrị iji mee atụmatụ maka ikere òkè zuru ezu na nke bara uru n’ozi ubi. Kama ịkpara onwe anyị ókè ịnọ otu hour ma ọ bụ ihe yiri ya mgbe anyị pụtara n’ozi, gịnị ma i dokwaa ịnọ ruo hour abụọ ma ọ bụ karị ma ọ bụrụ na o kwere omume? Ihe ịga nke ọma na-adaberekarị n’iburu ụzọ dokwaa ime nletaghachi na idokwa isoro ndị ọzọ na-eme atụmatụ ije ozi ruo hour abụọ, atọ, ma ọ bụ karị rụọ ọrụ.
15 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ okwu dabeere n’isiokwu bụ́ “Ụgwọ Ọrụ nke Nnọgidesi Ike,” site n’Ụlọ Nche nke August 1, 1995, peji nke 25-29.
17 min: “Kwadebe Maka Nzukọ Ọgbakọ Nile ma Nụ Ụtọ Ha.” Okwu na mkparịta ụka. Kpọọ otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ òkù ịkọ ihe ha na-eme nke na-enyere ha aka ịnụ ụtọ nzukọ, na-eritekwa uru zuru ezu site na ha.
Abụ 28 (5) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 18
Abụ 139 (74)
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na akụkọ ndekọ ego. Tụọ aro ụfọdụ n’ụzọ e si eji akọ na-azaghachi ekele oge ezumike. Maa ọkwa ndokwa ịgba àmà pụrụ iche maka December 25.
15 min: “Mee Ka Ịga n’Ihu Gị Pụta Ìhè.” Ajụjụ na azịza.
18 min: “Ịkwadebe Maka Nletaghachi Ndị Dị Irè.” Ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu. Tinye ọtụtụ ihe ngosi dị mkpirikpi.
Abụ 44 (18) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 25
Abụ 88 (42)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na oge unu ji enwe nzukọ kwesịrị ịgbanwe malite na January 1, gbaa mmadụ nile ume inye nkwado zuru ezu site n’ime nhazigharị ndị dị mkpa. (Lee Ozi Alaeze Anyị nke December 1994, peji nke 2.) Maa ọkwa ndokwa ịgba àmà pụrụ iche maka January 1.
12 min: Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit.”
13 min: Igbe Ajụjụ. Ntụle ajụjụ na azịza. Gụọ paragraf nile.
15 min: “Olileanya—Ihe Nchebe Dị Mkpa n’Ime Ụwa nke Dị Egwu.” Ntụle nke isiokwu dị n’Ụlọ Nche, April 15, 1993, peji nke 10.
Abụ 3 (89) na ekpere mmechi.