Ùnu Mezuru Ya n’April?
Olee mgbe anyị pụrụ ikwu na ọgbakọ emezuwo ya? A gbara anyị nile ume ikere òkè ná mkpọsa pụrụ iche nke magazin n’ọnwa April na May, tụkwasị n’ụbọchị e wepụtara iche n’April dị ka Ụbọchị Magazin pụrụ iche. Ọ bụrụ na ndị nkwusa nile keere òkè ná mkpọsa ahụ pụrụ iche, ma ọ̀ bụ n’ụbọchị pụrụ iche e wepụtara maka nkesa magazin ma ọ bụ n’ụbọchị ndị ọzọ n’ime ọnwa ahụ, ọ bụrụkwa na ha nyere akụkọ ozi ubi ha, anyị pụrụ ikwu mgbe ahụ sị, “Anyị mezuru ya!” Ugbu a April gwụsịworo, ọ dị anyị mkpa inyocha ókè anyị mezuru ya. Ozi Alaeze Anyị nke March 1996, peji nke 5, n’okpuru isiokwu bụ́ “Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma,” tụrụ aro 17 n’ụzọ a pụrụ isi mezuo ya n’April na May.
Magazin ọ̀ gwụnahụrụ ọgbakọ unu n’April? Ndị nkwusa ole keere òkè ná mkpọsa pụrụ iche nke magazin n’ọnwa gara aga? Ùnu ga-ekere òkè zuru ezu ná mkpọsa ahụ n’ọnwa a? Anyị nwere ọtụtụ ohere iji kesaa magazin—site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá, site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, n’ụzọ magazin, n’oge ịgba àmà uhuruchi, mgbe a na-eme nletaghachi, na-akpọtụrụ ndị a na-amụburu Bible, mgbe a na-aga ahịa, na-eme njem, na-agwa ndị ikwu okwu, ndị ọrụ ibe anyị, ndị agbata obi, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị nkụzi, n’usoro njem ọha na eze, n’ọnụ ụlọ nchere dị iche iche. Anyị pụrụ ikwu n’ezie na ohere inyefe magazin gbara anyị gburugburu.
A na-aja ọgbakọ nile mezuru ya n’April mma, a na-agba unu ume ịhụ na unu mezuru ya na May n’otu aka ahụ. Gịnị banyere ọgbakọ ndị ahụ na-enweghị ike imezu ya n’April? Gịnị ma unu tụleghachi aro ndị dị irè dị n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1996? Ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa nile kwesịrị ijide n’aka na ha nwere magazin zuru ezu ikesa. A pụrụ ọbụna ime ka ndị nkwusa ọhụrụ malite ozi ubi n’ọnwa a, ka ha wee nwee ike ikere òkè ná mkpọsa a pụrụ iche nke magazin.—Lee Ozi Anyị, peji nke 97-100.
Gị ikere òkè n’ụzọ na-ekpo ọkụ ná mkpọsa pụrụ iche nke magazin ga-eme ka i nwee ike inwe afọ ojuju ime ahụ nke na-abịa site n’ijezu ozi gị.—Ezik. 9:11; Luk 17:10.