Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/96 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka July

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka July
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite July 8
  • Izu Na-amalite July 15
  • Izu Na-amalite July 22
  • Izu Na-amalite July 29
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 7/96 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka July

Izu Na-amalite July 1

Abụ 90 (51)

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi March maka mba a na ọgbakọ unu.

15 min: “Imezu Nkwa Anyị Kwa Ụbọchị.” Ajụjụ na azịza. Tinye okwu ndị sitere n’Insight, Mpịakọta nke 2, peji nke 1162, paragraf nke 6-7, na-egosi ihe mere nkwa ji bụrụ ibu ọrụ dị oké mkpa.

18 min: “Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ.” (Paragraf nke 1-3) Jiri paragraf mbụ mee ihe iji kọwapụta isi nke isiokwu ahụ. Chọpụta broshuọ nke unu nwere ugbu a n’ọgbakọ nke a pụrụ ịnara nke ọma n’ókèala unu. Mgbe ahụ tụlee nanị paragraf nke 2-3, meekwa ihe ngosi otú a pụrụ isi jiri broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? mee ihe ma n’ọbịbịa mbụ gị ma ná nletaghachi. Gosi otú ndị nkwusa pụrụ isi kwadebe okwu nke ha maka broshuọ ọzọ nke ga-ekwesị ekwesị maka ókèala ọgbakọ.

Abụ 112 (207) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 8

Abụ 63 (43)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

23 min: “Ime Ka Ìhè Anyị Nọgide Na-enwu.” Kwuo okwu mmalite dị mkpirikpi n’adabere na paragraf 1-5. A ga-atụlezu paragraf nke 6-16 site n’ajụjụ na azịza. Gụọ paragraf nke 6-9, 15, na nke 16. Jiri paragraf nke 17-19 mechie. Ọ bụrụ na o kwere omume, onye nlekọta ije ozi ga-eme ya.

17 min: “A Chọkwuru Ụmụnna Nwoke n’Ozi Ọsụ Ụzọ.” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, tụlee aro ndị a tụrụ n’ụzọ isi hụ maka mkpa ego, dị ka a tụlere n’Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peji nke 28-31.

Abụ 16 (128) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 15

Abụ 162 (193)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

20 min: “Ị̀ Nwalewo Ịgba Àmà Uhuruchi?” Okwu nke ndị na-ege ntị ga-ekere òkè na ya na ajụjụ ọnụ ụfọdụ. Kọọ ihe a chọpụtaworo mgbe a na-arụ ọrụ n’ókèala mgbe oge gamiworo n’ụbọchị. Gụnye ahụmahụ ndị na-egosi ezi ihe ịgba àmà uhuruchi na-arụpụta. Kọwapụta usoro ihe omume ọgbakọ kwa izu nke nzukọ maka ije ozi.

15 min: “Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ.” (Paragraf nke 4-5) Tụlee nanị paragraf nke 4-5 na isi ihe ụfọdụ nke broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Mgbe ahụ mee ihe ngosi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a tụrụ aro ha maka ọbịbịa mbụ na nletaghachi.

Abụ 64 (214) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 22

Abụ 108 (183)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi ná mkpirikpi mbipụta ndị kasị ọhụrụ nke magazin, na-arụtụ aka n’isi ihe ndị na-akpali mmasị a pụrụ iji mee ihe n’iche ha n’ihu mmadụ n’ọnụ ụzọ.

12 min: “Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ.” (Paragraf nke 6-8) Jiri paragraf ikpeazụ nke isiokwu ahụ gbaa mmadụ nile ume ime nletaghachi ozugbo na nke ndị e nyefere broshuọ. N’iji paragraf nke 6-7 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ e si enyefe broshuọ Nzube nke Ndụ n’ọbịbịa mbụ na otú e si amalite ọmụmụ ihe n’isi mbụ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma ná nletaghachi. Chetara ndị nkwusa na ha pụrụ ichepụta ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke ha maka broshuọ ndị ọzọ, na-agbaso ihe nlereanya nke iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha n’Ozi Alaeze Anyị.

13 min: Chụsoo Ihe Mgbaru Ọsọ nke Ozi Oge Nile. Nkwurịta okwu n’etiti otu okenye na otu onye ma ọ bụ abụọ nọ n’afọ iri na ụma, na-adabere n’Ụlọ Nche December 15, 1988, peji nke 25-27. Ndị ntorobịa ahụ na-agbalị ikpebi ihe mgbaru ọsọ ha ga-achụso mgbe ha gasịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ha na-egosi mmasị n’uru ihe onwunwe ndị ọrụ ụwa na-enye. Okenye egosipụta ezi ihe mere ọ ga-eji ka nnọọ mma iru eru maka ozi ọsụ ụzọ. Ndị nọ n’afọ iri na ụma ekwenye ma na-enwe obi abụọ ma hà pụrụ ịsụ ụzọ ma na-akwado onwe ha n’ụzọ anụ ahụ. Okenye akọọ ahụmahụ sitere n’isiokwu Ụlọ Nche ahụ, na-egosi na ozi ọsụ ụzọ bụ ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị na ya, nke a pụrụ iru, bụ́ nke na-ewetara ọtụtụ ndị ọṅụ. Nkwurịta okwu abịa ná njedebe site ná ndị nọ n’afọ iri na ụma ikwupụta ekele maka okwu okenye ahụ kwuru na mkpebi ha ichebara nchụso ihe mgbaru ọsọ nke ikere òkè zuru ezu n’ozi Alaeze echiche.

15 min: “Ụzọ E Si Eji Akwụkwọ Ihe Ọmụma Eme Ndị Na-eso Ụzọ.” Okwu na-atụlezu paragraf nke 12-16 nke ihe ntinye June 1996. Tinye ihe ngosi abụọ nke ebe a na-enwe ọmụmụ Bible. Nke mbụ na-egosi otú e si enye onye a na-eduziri ọmụmụ ihe ọzụzụ ịkwadebe ihe ọmụmụ site n’idenye ihe ma ọ bụ ịkanye akara n’okpuru okwu na nkebi ahịrịokwu ndị kasị zaa ajụjụ ndị e biri ebi. Nke abụọ na-egosi ihe ị pụrụ ikwu iji gbaa onye a na-amụrụ Bible ume ịga Okwu Ihu Ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.

Abụ 116 (63) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 29

Abụ 212 (188)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Gịnị Ka Ọ Na-ewe Iji Nweta Ọmụmụ Bible? Otu onye okenye eduzie nkwurịta okwu n’etiti mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nweworo ihe ịga nke ọma n’ọrụ ọmụmụ Bible, na-atụleghachi ụzọ ndị a ga-esi nwee ihe ịga nke ọma karị n’ịmalite ọmụmụ ihe: (1) Kpee ekpere maka enyemaka Jehova. (2) Kere òkè chiri anya n’akụku dị iche iche nke ije ozi iji chọta ndị nwere mmasị. (3) Detuo mmasị nile, meekwa nletaghachi ozugbo. (4) Na-ekwu mgbe nile ka a malite ọmụmụ ihe n’ebe e gosiri mmasị. (Lee isiokwu nta bụ́ “Ịmalite Ọmụmụ Bible,” n’Ụlọ Nche February 15, 1996, peji nke 20.) (5) Zụlite obi ike n’ikike i nwere izi ihe site n’iji aro anọ ndị e depụtara na peji nke 13-17 nke Ụlọ Nche February 1, 1985, eme ihe.

25 min: “Òkè Gị n’Iwu Ihe Maka Ọdịnihu.” Ajụjụ na azịza, na-atụlezu ihe dị n’ihe ntinye. Gụpụta paragraf nke 6, 7, 13, na 14. Jaa ụmụnna mma maka onyinye afọ ofufo e nyere n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze na maka nkwado e nyere ọrụ ihe owuwu ọ bụla nke ọgbakọ.

Abụ 12 (93) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya