Nzukọ Ije Ozi Maka October
Izu Na-amalite October 7
Abụ 47 (21)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi July maka mba a na ọgbakọ unu.
15 min: Igbe Ajụjụ. Onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru esoro ndị na-ege ntị na-atụle ihe ọmụma.
20 min: “Kwadebe Ụzọ Iche Magazin n’Ihu Mmadụ nke Gị.” (Paragraf nke 1-7) Jụọ ajụjụ na paragraf nke 1-4, mgbe ahụkwa mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ dị nkenke iji gosi otú a pụrụ isi nyefee magazin ndị kasị ọhụrụ, na-eji aro ndị dị na paragraf nke 5-7 eme ihe. Gụnye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche nke December 15, 1987, peji nke 28, paragraf nke 8-9.
Abụ 222 (119) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 14
Abụ 39 (16)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwaa otú e si amalite ụzọ magazin: (1) Detuo nke ọ bụla e tinyere na isiokwu e chere n’ihu mmadụ, (2) dokwaa iji mbipụta ndị ga-esochi laghachi, (3) setịpụkwa otu oge kpọmkwem n’usoro ije ozi kwa izu gị iji mee nleta ndị a. Nyefee ụtụ otu afọ. Ọ bụrụ na a naraghị ya, nyefee nke ọnwa isii, chetakwa inye akụkọ nleta ọ bụla e mere n’ụzọ magazin dị ka otu nletaghachi.
15 min: “Ikwusa Ozi Ọma nke Ihe Ka Mma.” Ajụjụ na azịza. Gosipụta isiokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ pụtaworo n’Ụlọ Nche.—Lee Ụlọ Nche nke December 1, 1987, peji nke 30.
20 min: “Kwadebe Ụzọ Iche Magazin n’Ihu Mmadụ nke Gị.” (Paragraf nke 8-11) Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị dị n’aro anọ a tụrụ n’Ụlọ Nche nke January 1, 1994, peji nke 24-25, paragraf nke 18-21. N’iji mbipụta magazin nke October eme ihe, gosi otú e si akwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ: (1) Họta otu isiokwu yikarịsịrị ka ọ̀ ga-adọta mmasị n’ókèala gị, (2) chọọ isi ihe na-adọrọ mmasị ị ga-eche n’ihu mmadụ, (3) chepụta otu ajụjụ a pụrụ iji dọrọ mmasị gaa n’isi ihe ahụ, (4) họta otu akụkụ akwụkwọ nsọ ị ga-agụ ma ọ bụrụ na e nyere gị ohere ya, (5) kwadebekwa okwu mmeghe nke gị na ihe ị ga-ekwu banyere magazin ndị ahụ ka i wee gbaa onye nwe ụlọ ume ịnara ya. Mee ka onye ọ bụla n’ime ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. Gụnye otu ntorobịa bụ́ onye ga-eme ihe ngosi nke ụzọ dị mfe e si enyefe magazin.
Abụ 82 (63) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 21
Abụ 169 (57)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
17 min: “Rụzuo Ókèala Gị nke Ọma.” Tụlee isiokwu na ihe bụ ndokwa ọgbakọ mere maka ịrụ ọrụ n’ebe achụmnta ego. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịkọ ahụmahụ na-agba ume ndị ha nwere mgbe ha rụrụ ọrụ n’ụlọ ahịa ndị so n’ókèala ha.
18 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ okwu okenye ga-ekwu n’isiokwu bụ́ “Jidesie Obi Ike Gị Ike Ruo Ọgwụgwụ Ihe Nile,” site n’Ụlọ Nche nke May 1, 1996, peji nke 21-24.
Abụ 12 (40) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 28
Abụ 27 (7)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ka oge ezumike ụwa na-eru nso na December, ikekwe na-eme ka e nwee oge a na-anọghị n’ọrụ ego na n’ụlọ akwụkwọ, gbaa mmadụ nile ume iche echiche banyere ikwe omume nke idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Gbaa mmadụ nile ume inye akụkọ ozi ubi nke October ná ngwụsị izu a.
20 min: “Ụzọ E Si Azụchapụta Oge.” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche nke December 1, 1989, peji nke 16-17, paragraf nke 7-11.
15 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe na November. A ga-enyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma, a ga-emekwa mgbalị pụrụ iche iji sochie ntinye akwụkwọ nile, na-ebu n’obi ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. Ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru atụlee ịdị mkpa nke akwụkwọ ahụ na otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe. Ihe ọmụma dị na ya na-emetụta ndụ ndị mmadụ nọ n’ọnọdụ ọ bụla ná ndụ. Ọ na-emetụtazu isiokwu ndị bụ isi nke Bible na ụkpụrụ dị ndị ọhụrụ mkpa ịghọta tupu e mee ha baptism. Ọ bụrụ na anyị emee ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu n’akwụsịghị akwụsị, onye mmụta ahụ pụrụ inwe ọganihu dị ngwa. Tụlee ma mee ihe ngosi otú e si amalite ọmụmụ ihe site n’iji ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem eme ihe: Tụleghachi ihe osise na okwu nkọwa dị na peji nke 4-5; kọwaa ụzọ anyị si amụ ihe; tụlee ná mkpirikpi paragraf ise mbụ n’isi 1; yie agba ịlọghachi ma e mesịa ma gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ, na-aza ajụjụ bụ, Ndụ ebighị ebi ọ̀ bụ nanị nrọ? Mesie ike ọṅụ na-eso ihe ùgwù nke iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi abịa.
Abụ 162 (89) na ekpere mmechi.