Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/97 p. 1
  • A Na-atụkwasị Ìgwè Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Na-atụkwasị Ìgwè Mmadụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Anyị Nile Pụrụ Iso Mee Ka Mmadụ Ghọọ Onye Na-eso Ụzọ Kraịst
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • April—Oge Iji ‘Dọgbuo Onwe Anyị n’Ọrụ Ma Gbasie Mgba Ike’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • “Na-emenụ Ka Ibe Unu Dị Ike”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 4/97 p. 1

A Na-atụkwasị Ìgwè Mmadụ

1 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, uto nke ọgbakọ ndị Kraịst na-enwe taa dị ịrịba ama. (Ọrụ 2:41; 4:4) N’afọ gara aga, e mere 366,579 ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism, nkezi nke ihe gafere 1,000 kwa ụbọchị! E mere ihe gafere otu nde baptism n’ime afọ atọ gara aga. N’ezie, Jehova anọgidewo na-atụkwasị ìgwè ndị kwere ekwe.—Ọrụ 5:14.

2 Ọtụtụ ndị ọhụrụ ahụ na-enweghị ahụmahụ n’ibi obi ndị Kraịst chọrọ enyemaka na ọzụzụ site n’aka ndị dị ike n’okwukwe. (Rom 15:1) N’etiti ndị Kraịst oge mbụ e nwere ụfọdụ ndị, ọbụna ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị ha baptism, na-enweghị ike ‘iru ntozu okè.’ (Hib. 5:12; 6:1) Ọ bụ ya mere, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, Pọl mere ka akụkụ ebe ndị ọ dị ndị Kraịst mkpa ito n’ụzọ ime mmụọ pụta ìhè. Gịnị bụ ndị a, oleekwa otú a pụrụ isi nye enyemaka dị mkpa?

3 Inweta Ezi Àgwà Ịmụ Ihe: N’ikwekọ ná ntụziaka Pọl, ịbụ ezi onye mmụta gụnyere ịmụ ihe n’ụzọ dị irè, ịmụgharị ihe, na iji “nri siri ike” nke nzukọ Jehova na-enye eme ihe. (Hib. 5:13, 14; lee Ụlọ Nche, August 15, 1993, peji nke 12-17.) Site n’isoro ndị ọhụrụ kwere ekwe nwee mkparịta ụka n’ihe ime mmụọ na isoro ha kerịta akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke eziokwu ndị i gwupụtaworo site ná nnyocha onwe onye, ị pụrụ ịkpali ha inweta ezi àgwà ịmụ ihe. Ikekwe mgbe ụfọdụ ị pụrụ ịkpọ onye ọhụrụ isonyere gị n’ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụ nke ezinụlọ gị.

4 Ịgachi Nzukọ Anya: Ihe nlereanya ikwesị ntụkwasị obi na okwu ịhụnanya nke agbamume gị ga-enyere ndị òtù ọhụrụ nke ọgbakọ aka izere akụkụ ọzọ na-akpata nchegbu nke Pọl hotara—‘omenala’ ụfọdụ ndị nwere nke ịhapụ nzukọ ndị Kraịst. (Hib. 10:24, 25) Nyere ha aka ịghọta na nzukọ ndị ahụ bụ eriri ndụ ime mmụọ nke jikọtara ha na ọgbakọ. Bute ụzọ n’ime ka ha bụrụ ndị ahụ ruru ala dị ka ndị so n’òtù ụmụnna anyị.

5 Iji Obi Ike Gakwuru Jehova: Iji merie adịghị ike anụ ahụ na ntụpọ n’ụdị onye mmadụ bụ, anyị aghaghị ịchọ Jehova n’ekpere, na-agwa ya echiche anyị ndị kasị omimi na ihe kasị echegbu anyị. Ndị ọhụrụ aghaghị ịmụta na site n’ịrịọ Jehova arịrịọ maka enyemaka, dị ka Pọl gbara ume, ọ dịghị mkpa ka ha daa. (Hib. 4:15, 16; 10:22) Ịkọ ahụmahụ ndị nke gị n’akụkụ a ga-ewusi obi ike nke onye ọhụrụ ike na Jehova na-anụ ekpere ndị sitere n’obi.

6 Iwepụta Oge Maka Ozi: Pọl gosikwara na mgbe anyị “na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile,” ọ na-ewusi ike n’ụzọ ime mmụọ. (Hib 13:15) Ị̀ pụrụ ịkpọ onye nkwusa ọhụrụ òkù isonyere gị ná ndokwa gị kwa izu maka ozi ubi? Ikekwe unu abụọ pụrụ ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu gị ma ọ bụ tụlee otu akụkụ ozi ahụ nke onye ahụ bụ onye ọhụrụ karị na-anwalebeghị.

7 Ìgwè mmadụ a na-atụkwasị bụ ihe na-enye oké ọṅụ. Anyị ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ịzụ na n’ịgba ndị òtù ọhụrụ nke ọgbakọ ume ga-enyere ha aka ịzụlite okwukwe siri ike dị mkpa iji ‘nweta mkpụrụ obi ha.’—Hib. 3:12, 13; 10:39.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya