Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’April na May: Asụsụ nile—Ụtụ Ụlọ Nche. Magazin ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa maka otu afọ, ₦280. Otu afọ maka ndị a na-ebipụta otu ugboro n’ọnwa ma ọ bụ ọnwa isii maka ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa, ₦140. Maka ozi etiti izu na n’ókèala ndị a na-arụzu mgbe mgbe, a pụrụ iji broshuọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, mee ihe. June: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: Nke ọ bụla n’ime broshuọ na-esonụ nwere peji 32: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ndị so ọgbakọ na-emekọ ihe kwesịrị izite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi nile maka Ụlọ Nche na Teta!, tinyere ụtụ onwe onye ha, site n’ọgbakọ.
◼ N’April 26 na May 31 a ga-emechi ihe owuwu Betel. Ya mere biko abịala maka nleta ma ọ bụ iwere akwụkwọ n’ụbọchị ndị a.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ E Nwere:
Sing Praises to Jehovah (Nke obere)—Isoko