Ntụleghachi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke January 6, ruo April 21, 1997. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ndị Kraịst nwere ezi ihe mere ha ga-eji dị iche n’ụwa. (1 Jọn 5:19) [kl p. 60 para. 18]
2. Ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ụwa nke nwere ikike ịgbaghara mmehie ruo mgbe Jisọs nwụrụ wee nye ihe mgbapụta ahụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 4/15 p. 29.]
3. Jehova ji ndị amụma bụ́ Zekaraịa na Hagaị tụteghachi ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Ya maka mwughachi ụlọ nsọ ahụ. [w89 6/15 p. 30]
4. Baptism na-eme ka nzọpụta bụrụ ihe e ji n’aka. [uw- p. 100 para. 12]
5. Mmadụ nile eketawo mmehie na ọnwụ, ebe ọ bụ na a tụụrụ ime ụmụ nile nke Adam na Iv mgbe ha mehiesịworo. [kl p. 58 para. 13]
6. Ihe mgbapụta ahụ na-ekpuchi mmehie nile nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 12/15 p. 29.]
7. Ndị òtù siri ike nke Babilọn Ukwu ahụ na ndị ndú okpukpe ha ga-eso ‘n’ụmụ ewu’ ahụ a kpọtụrụ aha na Matiu 25:31-46, bụ́ ndị ga-aba ná mbibi ebighị ebi. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 10/15 p. 26 para. 13-15.]
8. Okwu Jisọs e dekọrọ na Matiu 23:33 na-egosi na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, dị ka otu ìgwè, bụ akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 6/1 p. 11 para. 11.]
9. Ịgbaghara ndị ọzọ na-emeghe ụzọ ka Chineke wee gbaghara anyị mmehie anyị. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94-IB 9/15 p. 7.]
10. Baptism e mere Jisọs baa n’ọnwụ malitere na 29 O.A., e mezughịkwa ya ruo mgbe ọ nwụrụ n’ezie, mgbe e sikwa n’ọnwụ kpọlite ya. [uw p. 97 para. 6]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. N’echiche dị aṅaa ka Alaeze Jisọs bụ nke a na-agaghị emebi emebi? (Dan. 7:14) [uw p. 86 para. 15]
12. Ọkwá abụọ dị aṅaa Jisọs Kraịst ji ka a kọwara na Zekaraịa 6:12, 13? [w89 6/15 p. 31]
13. Kama ịkatọ ndị anyị nwere ike iche na ha pụrụ ime kara otú ha na-eme n’ozi Alaeze ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime n’otu n’otu? (Gal. 6:4) [uw p. 93 para. 13]
14. Gịnị ka Zekaraịa ịgbaji mkpanaka ahụ a kpọrọ Ịdị Ụtọ pụtara? (Zek. 11:7-11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 6/15 p. 31.]
15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ụmụ mmadụ si na-erite uru site n’àjà Jisọs n’oge a? [kl p. 68-69 para. 17-19]
16. N’echiche dị aṅaa ka “onye amụma ahụ bụ Elaịja” pụtara na narị afọ mbụ, ná mmezu nke Malakaị 4:5? [w89 7/1 p. 30]
17. Olee otú mmadụ pụrụ isi pụnara Chineke ihe? (Mal. 3:8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 4/15 p. 18 para. 15.]
18. N’ole ebe n’akwụkwọ Matiu ka anyị na-achọta ndụmọdụ ahụ dị mma Jisọs nyere banyere idozi nsogbu ndị siri ike? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 7/15 p. 22.]
19. Gịnị bụ “shilling” ahụ a kpọtụrụ uche n’ilu Jisọs e dekọrọ na Matiu 20:1-16? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee gt 97 para. 6.]
20. Depụta ihe abụọ nkwere Chineke kweere ka ajọ omume dịrị nwapụtaworo. [kl p. 77-78 para. 18-20]
Denye okwu ma ọ bụ ahịrị okwu nke dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. A kpọrọ akwụkwọ Bible bụ́ Matiu _________________________ [w89 7/15 p. 24]
22. Ọ bụghị _________________________ na-akpata ọtụtụ _________________________ na-eti _________________________ ihe otiti. (Jes. 1:13) [kl p. 71 para. 3]
23. A ga-ekpe ndị nwụrụ anwụ e zoro aka na ha ná Mkpughe 20:12 ikpe dị ka ọrụ nile ha si dị, nke ha rụrụ mgbe mbilite n’ọnwụ ha _________________________ Nke a na-enyere anyị aka ịghọta na nke ha agaghị abụ n’ụzọ a na-apụghị igbochi egbochi mbilite n’ọnwụ nke _________________________ (Jọn 5:28, 29) [uw p. 75 para. 12]
24. Ọ bụ ezie na a gụghị Jisọs _________________________ kpọmkwem dị ka aha ọ ga-aza, ọrụ ya dị ka mmadụ mezuru ihe aha ahụ _________________________ (Aịsa. 7:14; Mat. 1:22, 23) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 1/15 p. 22.]
25. “Mmụọ” nke na-apụ n’ahụ mmadụ n’ọnwụ bụ _________________________ ahụ nke na-esite n’aka Chineke. (Abụ Ọma 146:4) [kl p. 81 para. 5-6]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. E nwere ihe àmà na Matiu dere Oziọma ya na (Hibru; Aramaic; Grik) mesịakwa sụgharịa ya gaa na (Hibru; Aramaic; Grik). [w89 7/15 p. 24]
27. Ihe ka ukwuu n’ime (ihe ahụ fọdụrụ; 144,000) nọ n’eluigwe, (ihe fọdụrụ; 144,000), ndị ka nọ n’elu ala, mejupụtakwara (Òtù Na-achị Isi; òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche). [uw p. 80 para. 7]
28. Jisọs ghọrọ Mesaịa mgbe (a mụrụ ya; e mere ya baptism; o bilitere n’ọnwụ), nke weere ọnọdụ n’afọ (2 T.O.A.; 29 O.A.; 33 O.A.). [kl-IB p. 65 para. 12]
29. Baptism “baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ” malitere na (29 O.A.; 33 O.A.; 36 O.A.). (Mat. 28:19) [uw p. 98 para. 9]
30. Ụgwọ ọrụ Jisọs kwere ndị nabatara ndị na-eso ụzọ ya dị ka ndị amụma ná nkwa, dị ka e dekọrọ ya na Matiu 10:41, bụ (ndụ ebighị ebi; nchebe Chineke; ịnụ ozi Alaeze ahụ). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 1/1 p. 24.]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Zek. 4:6; Mat. 4:8-10; Mat. 16:19; Fil. 1:9-11; Hib. 13:5, 6
31. Anyị kwesịrị iji ndụ anyị na-eme ihe n’ụzọ na-egosi na anyị ghọtara n’ezie ihe ndị ka mkpa. [uw p. 91 para. 9]
32. Ezi ụmụazụ Jisọs na-ajụ itinye aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 5/1 p. 12 para. 9.]
33. Ihe ọmụma banyere Alaeze Chineke ga-emeghere ndị Juu, ndị Sameria, na ndị Jentaịl ụzọ ịga eluigwe. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 3/15 p. 5.]
34. E meriwo mmegide zuru ụwa ọnụ nke a na-emegide ọrụ nkwusa anyị, ọ bụghị site ná mgbalị ụmụ mmadụ, kama site ná nduzi na nchebe nke Jehova. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 8/15 p. 17 para. 4.]
35. N’agbanyeghị ọnụ ahịa dị elu na enweghị ọrụ nke jupụtara ebe nile, Jehova ga-ahụ na anyị nwetara ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie. [uw p. 89 para. 6]