Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/97 p. 2
  • N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Na-eme Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Na-eme Ya?
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ugbu A Bụ Oge Ime Nkwusa!
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • “Ị Ga-eme nke Ọma ma Ị Bụrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile!”
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 4/97 p. 2

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Na-eme Ya?

1 E buru n’amụma banyere Kraịst na ‘ekworo nke ụlọ Chineke ga-eripịa ya.’ (Abụ Ọma 69:9) Ekworo Jisọs maka ezi ofufe nke Jehova kwaliri ya ibute ozi ahụ ụzọ. (Luk 4:43; Jọn 18:37) A na-egosipụta otu ekworo a nke ịgbara eziokwu àmà taa n’ozi nke Ndịàmà Jehova. N’afọ ije ozi gara aga, nkezi nke 645,509 n’ụwa nile keere òkè kwa ọnwa n’ụdị ụfọdụ nke ozi ọsụ ụzọ. N’ihi nraranye anyị nye Chineke, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji ekpere tụlee ma anyị pụrụ idozi ọnọdụ anyị iji jee ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile.—Abụ Ọma 110:3; Ekli. 12:1; Rom 12:1.

2 N’ibi n’ime usoro ihe a nke na-achọ ihe onwunwe n’ụzọ ọdịmma onwe onye nanị, ọ na-esiri ọtụtụ ndị nọ n’ụwa ike ịghọta ihe mere mmadụ ọ bụla ga-eji chọọ ịrụsi ọrụ ike otú a n’ozi ahụ maka ihe na-enweghị uru ego ma ọ bụ otuto ọ na-enye. N’ihi gịnị ka ndị ọsụ ụzọ ji na-eme ya? Ha maara na ha na-etinye aka n’ọrụ na-azọpụta ndụ. N’ịbụ ndị ịhụnanya miri emi maka Jehova na maka mmadụ ibe ha kpaliri, ha na-enwe echiche ibu ọrụ siri ike, nke onwe onye inye aka iji zọpụta ndụ. (Rom 1:14-16; 1 Tim. 2:4; 4:16) Otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ chịkọtara ya n’ụzọ dị mma site n’ikwu, sị: “N’ihi gịnị ka anyị ji na-asụ ụzọ? Ọ̀ dị otú anyị pụrụ isi gosi na ụta adịghịrị anyị n’ihu Jehova ma ọ bụrụ na anyị asụghị ụzọ?”

3 Nwanna nwanyị ọzọ dere nke a banyere mkpebi ya ịmalite ịsụ ụzọ: “Mụ na di m mere atụmatụ iji ihe otu onye na-akpata na-ebi ndụ, nke pụtara ịhapụ ihe nile na-adịghị mkpa. Ma, Jehova gọziri anyị nke ukwuu, ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ anyị n’ogbenye ma ọ bụ ná mkpa. . . . Achọtawo m ezi ihe mere m ga-eji adị ndụ—nke bụ inyere ndị nọ ná mkpa aka ịmara na Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ, anọghị n’ebe dị anya nye ndị na-achọ ya.” N’ịhụ ịdị ngwa nke oge a, ndị ọsụ ụzọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị mkpa ná ndụ ka ha na-achọsi ike inweta akụ̀ ime mmụọ ndị ga-adịru ebighị ebi.—1 Tim. 6:8, 18, 19.

4 Ọ bụrụ na ọnọdụ gị kwe, gịnị ma i sonyere ọtụtụ narị puku ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ụwa nile bụ́ ndị na-asụ ụzọ? N’ụzọ ahụ ị pụrụ inweta otu ọṅụ ahụ ha na-enweta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya