Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka April

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka April
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite April 7
  • Izu Na-amalite April 14
  • Izu Na-amalite April 21
  • Izu Na-amalite April 28
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 4/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka April

Izu Na-amalite April 7

Abụ 100 (50)

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee “Mgbakọ Mba Nile na 1998.” Hota isi ihe a pụrụ iji kwuo okwu ndị dị na magazin ndị ọhụrụ.

15 min: “A Na-atụkwasị Ìgwè Mmadụ.” Ajụjụ na azịza. Tụleghachi aro ndị bụ isi a tụrụ n’Ụlọ Nche nke August 15, 1993, peji nke 12-17.

18 min: “Nyere Ndị Na-enweghị Uche Aka Ịghọta.” Ajụjụ na azịza. Tụleghachi ihe ndị dị na broshuọ Na-achọ: ụzọ ịmụ ihe e mere ka ọ dị mfe, ajụjụ ndị bịara n’ezi oge, ihe osise ndị na-adọrọ mmasị, ụbara izo aka Akwụkwọ Nsọ. Mesie ike ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe ndị ga-emesịa duga n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ isi malite ọmụmụ ihe na-eji ụzọ e depụtara na paragraf nke 4 eme ihe. Gbaa ndị nile nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị mụrụ ụmụ ume isoro ụmụ ha ndị na-eto eto mụọ broshuọ ahụ.

Abụ 130 (58) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 14

Abụ 107 (57)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ, meekwa ka ọgbakọ mara ma ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ ụfọdụ dị mkpa iji mejupụta ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

15 min: “Iduzi Ndị A Na-amụrụ Ihe Gaa ná Nzukọ Nwe Aha Anyị.” (Paragraf nke 1-6) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 5-6 na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha. Kọọ ahụmahụ ndị e nwetara n’ógbè banyere mmeghachi omume nke ndị a na-amụrụ Bible banyere ikiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name.

20 min: “Kụziere Ndị Ọzọ Ihe Chineke Na-achọ.” Nkwurịta okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke paragraf nke 1-4. Mee ka e mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu ndị dị na paragraf nke 5, na-eji ọnọdụ anọ dị iche iche—n’okporo ámá, n’ụlọ, n’ebe achụmnta ego, na n’ọdụ ụgbọala. Chetara mmadụ nile inweta broshuọ na magazin maka ozi ubi tupu ha ahapụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’abalị a.

Abụ 126 (89) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 21

Abụ 113 (62)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwaa na oge agafebeghị nke ukwuu itinye akwụkwọ maka ịsụ ụzọ inyeaka na May. Akụkọ ndekọ ego. Dị ka oge nyere ohere ya, kọọ ná mkpirikpi ahụmahụ ndị e nwetara n’ubi n’ógbè unu banyere itinye broshuọ Na-achọ ma ọ bụ iji ya malite ọmụmụ Bible.

15 min: “Iduzi Ndị A Na-amụrụ Ihe Gaa ná Nzukọ Nwe Aha Anyị.” (Paragraf nke 7-14) Ajụjụ na azịza. Mee ka onye nkụzi ruru eru gosi ụzọ isi soro onye a na-amụrụ ihe nwee nkwurịta okwu sitere n’obi banyere mkpa ọ dị ịga nzukọ.

15 min: Iji Akwụkwọ Anyị Na-eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu. Okwu onye okenye ga-ekwu. (Lee Ozi Alaeze Anyị nke March 1996, peji nke 3-5.) Akụkọ na-egosi na ọgbakọ dị iche iche ọtụtụ mgbe na-etinye ọda magazin karịa ókè ha na-ekesa kwa ọnwa n’ezie. A dịghị edenye ihe ruru 50 pasent dị ka ndị e tinyere ma ọlị. (Kwuo ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi n’ọgbakọ unu.) Gịnị na-eme magazin ndị a? Ọtụtụ mgbe a na-akwakọba ha n’elu shelf ma ọ bụ tụfuo ha. Olee otú a pụrụ isi zere nke a? Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị iji nlezianya gbakọọ ókè dị ya mkpa ma tụọ ọda nanị maka ókè ọ pụrụ itinye. Mee ya ka ọ bụrụ omume gị inyefe ndị nile anyị na-ezute magazin. Ekwela ka magazin ndị ochie laa n’iyi. Na-ekerechi òkè anya n’ozi magazin.

Abụ 128 (99) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 28

Abụ 121 (68)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile itinye akụkọ ozi ubi ha maka April. Maa ọkwa aha ndị nile ga-asụ ụzọ inyeaka na May. Kọwapụta ndokwa ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ maka nzukọ ije ozi. Na May, e kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche isochi broshuọ nile e tinyere ná nzube nke ịmalite ọmụmụ ihe. Ná mkpirikpi tụọ aro ụzọ ndị anyị pụrụ isi jiri akọ jụọ aha na adres nke ndị anyị na-agbara àmà na mberede. Ị pụrụ ibu ụzọ kwuo aha gị na adres gị wee jụọ ma e nwere nọmba fon a pụrụ iji nweta ha. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịtụ aro ndị ọzọ dịwooro ha irè.

15 min: “N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Na-eme Ya?” Onye okenye esoro ndị ọsụ ụzọ oge nile abụọ ma ọ bụ atọ kwurịta isiokwu. (Ọ bụrụ na e nweghị ha, jiri ndị na-arụkarị ọsụ ụzọ inyeaka mee ihe.) Gụnye isi ihe ndị sitere n’isiokwu bụ́ “Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi,” n’Ụlọ Nche nke January 15, 1994. Mee ka onye ọ bụla kọwaa ihe mere o ji were ozi ọsụ ụzọ. Gwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ndị na-egosi ụzọ e siworo gọzie ha n’ihi ime otú ahụ.

15 min: Mkpa ọgbakọ. Ndị okenye pụrụ iji oge a nye ihe ọmụma banyere mkpa ọgbakọ ụfọdụ kpọmkwem.

Abụ 129 (66) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya