Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. Magazin ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa maka otu afọ: ₦280. Otu afọ maka ndị a na-ebipụta otu ugboro n’ọnwa ma ọ bụ ọnwa isii maka ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa: ₦140. Malite n’October 12, a ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 35. November: Nkesa Akụkọ Alaeze nke 35 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị rụzuru ókèala ha site n’iji Akụkọ Alaeze nke 35 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe obibi nke ọ bụla nwere ike nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma. December: Bekee—New World Translation ya na akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị peji 192. Asụsụ ndị ọzọ—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla dị peji 192. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1985 n’ọnụ ego dị ala. Ọ bụrụ na ọgbakọ ọ bụla nwere akwụkwọ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, ha nwekwara ike nyefee akwụkwọ a n’ọnụ ego dị ala. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị ọzọ dị peji 192 e bipụtara tupu 1985 bụ́ ndị e biri n’akwụkwọ na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego a e mere ka ọ dị ala. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” ahụ, ma ọ bụ Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu, e wezụga Akụkọ Alaeze nke 35 nke a ga-ezigara ọgbakọ nile, kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ihe ntinye dị ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị bụ “Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1998,” e kwesịkwara idebe ya maka ntụaka n’ime 1998 nile.
◼ N’ịbụ nke nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọnwa November nwere ike bụrụ oge dị mma nye ọtụtụ ndị iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Oge nzukọ nke ọtụtụ ọgbakọ ga-agbanwe na January 1. Ya mere, ọ pụrụ ịdị mkpa ịtụ ọda mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù ọzọ iji gosi oge nzukọ ndị a hazigharịrị ahazigharị.