Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1998
Ntụziaka
N’ime afọ 1998, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
AKWỤKWỌ IHE OMUME: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi [kl-IB], Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ [fy-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu ga-abụ ebe ndị a ga-esi na-enye ihe omume.
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata wee malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, mgbe ahụ, e wee gaa n’ihu n’usoro nke a:
IHE OMUME NKE 1: minit 15. Onye kwesịrị ime nke a bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche. A ga-eme ihe omume a dị ka okwu izi ihe ga-ewe minit 15 n’enweghị ajụjụ ọnụ. Nzube ya kwesịrị ịbụ, ọ bụghị nanị ikwuzu ihe mmụta ahụ, kamakwa ịdọrọ uche gaa n’abamuru nke ihe mmụta ahụ a na-atụle, na-eme ka ihe ndị ga-akachasị nyere ọgbakọ aka pụta ìhè. Ebe a na-enweghị isiokwu, e kwesịrị ịhọrọ otu.
Ụmụnna ndị e kenyere okwu nke a kwesịrị iji nlezianya ghara ịgabiga oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ma ọ bụ ọ bụrụ na ọkà okwu ahụ arịọ maka ya.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: minit 6. Onye ga-eme nke a kwesịrị ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, bụ́ onye ga-atụle isiokwu ahụ n’ụzọ dị irè ikwekọ ná mkpa ọgbakọ. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ọgụgụ ahụ e kenyere ka a gụọ. A pụrụ ịgụnye ntụleghachi metụtara ihe nile nke isi Bible ndị e kenyere bụ́ nke ga-ewe sekọnd 30 ruo 60. Otú ọ dị, nzube bụ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere na ụzọ ihe mmụta ahụ si baara anyị uru. Mgbe ahụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwa ndị mmụta ka ha gaa na klas ha dị iche iche.
IHE OMUME NKE 2: minit 5. Nke a bụ ọgụgụ Bible nke ebe e kenyere ka a gụọ, bụ́ nke nwanna nwoke ga-agụ. Otú a ka ọ ga-adị n’ụlọ akwụkwọ nke mbụ na n’ìgwè ndị ọzọkwa. Ọgụgụ ihe ahụ na-adịkarị nkenke iji nye ndị mmụta ahụ ohere ikwu okwu nkọwa dị mkpirikpi ná mmalite na mmechi okwu ya. A pụrụ ịgụnye ihe omume nke akụkọ ihe mere eme, nghọta nke okwu amụma ma ọ bụ ozizi, na ụzọ a pụrụ isi jiri ụkpụrụ mee ihe. E kwesịrị ịgụ amaokwu nile ahụ e kenyere n’enweghị nkwụsịtụ. Otú ọ dị, n’ebe amaokwu ndị a gaje ịgụ na-adịghị n’usoro, onye mmụta ahụ pụrụ ịkpọ amaokwu ebe ọgụgụ ihe ahụ na-aga n’ihu.
IHE OMUME NKE 3: minit 5. A ga-ekenye nwanna nwanyị nke a. Isiokwu nke okwu a ga-adabere n’Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, ma ọ bụ Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu. Ọnọdụ okwu ahụ pụrụ ịbụ ịgba àmà mberede, nletaghachi, ma ọ bụ ọmụmụ Bible ebe obibi, ndị na-eme ya nwekwara ike ịnọdụ ala ma ọ bụ iguzo ọtọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta ahụ si enyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’isiokwu ahụ na ịghọta ya, na n’ụzọ e si jiri akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ mee ihe. Onye mmụta e kenyere okwu a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye otu onye inyeaka, ma a pụrụ iji onye inyeaka ọzọ mee ihe. Onye mmụta ahụ pụrụ ikpebi ma onye nwe ụlọ ọ̀ ga-agụ paragraf ụfọdụ mgbe a na-atụle akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ na ọ gaghị agụ. Ọ bụghị ọnọdụ okwu ahụ kama iji ihe mmụta ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè kwesịrị ka e were ya n’ihe kasị mkpa.
IHE OMUME NKE 4: minit 5. Mgbe ihe omume a dabeere n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu, a ga-ekenye ya nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị. Mgbe ọ dabeere n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, a ga-ekenye ya nwanna nwoke. Maka ihe omume ọ bụla, e wepụtara isiokwu n’usoro ihe omume ahụ. Mgbe e kenyere ya nwanna nwoke, nke a kwesịrị ịbụ okwu a ga-agwa ndị dum na-ege ntị. Ọ ga-akachasị mma ma nwanna nwoke ahụ kwadebe okwu ya na-eburu ndị na-ege ntị n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze n’uche, ka o wee bụrụ okwu nwere nnọọ ihe mmụta, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru n’ezie.
*USORO ỌGỤGỤ BIBLE NTỤKWASỊ: E tinyere nke a n’ime akara ngebichi na-eso abụ a ga-eji mee ihe maka izu ọ bụla. Site n’ịgbaso usoro a, na-agụ ihe dị ka peji iri n’otu izu, a pụrụ ịgụcha Bible dum n’afọ atọ. Ọ dịghị akụkụ dị n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ntụleghachi odide nke dabeere n’usoro ihe ọgụgụ ntụkwasị ahụ.
RỊBA AMA: Iji nwetakwuo ihe ọmụma na ntụziaka banyere ndụmọdụ, idebe oge, ntụleghachi odide, na nkwadebe nke ihe omume, biko lee peji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996.
USORO IHE OMUME
Jan. 5 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 7-8
Abụ nke 162 [*Jenesis 1-9]
Nke 1: “Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ” (w96 1/1 p. 29-31)
Nke 2: Ọrụ 7:44-60
Nke 3: Na-erubere Ịbụisi Kasị Elu Isi Mgbe Nile (kl p. 130-131 para. 1-6)
Nke 4: td 28B Jisọs Bụ Ọkpara Chineke na Eze Ọ Họpụtara
Jan. 12 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 9-10
Abụ nke 14 [*Jenesis 10-18]
Nke 1: Bụrụ Onye Ji Obi Ike Na-ekwusa Okwu Chineke (w96 1/15 p. 24-25)
Nke 2: Ọrụ 9:1-16
Nke 3: Doo Onwe Gị n’Okpuru Ndị Na-achị Isi (kl p. 131-133 para. 7-10)
Nke 4: td-IB 28D Ihe Mere Anyị Na-aghaghị Iji Kwere na Jisọs Kraịst
Jan. 19 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 11-13
Abụ nke 187 [*Jenesis 19-24]
Nke 1: Lee Anya Gabiga Ihe Ndị Ị Na-ahụ! (w96 2/15 p. 27-29)
Nke 2: Ọrụ 13:1-12
Nke 3: Nwee Ekele ná Ndokwa Chineke Maka Ịbụisi n’Ime Ezinụlọ (kl p. 134-136 para. 11-18)
Nke 4: td 28E Ọrụ Aghaghị Isochi Okwukwe na Kraịst
Jan. 26 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 14-16
Abụ nke 163 [*Jenesis 25-30]
Nke 1: Ibi Ndụ n’Ụzọ Kwekọrọ ná Nkwa Alụmdi na Nwunye Gị (w96 3/1 p. 19-22)
Nke 2: Ọrụ 16:1-15
Nke 3: Ịbụisi n’Ime Ọgbakọ—Ndokwa Ịhụnanya Sitere n’Aka Jehova (kl p. 137-139 para. 19-25)
Nke 4: td 4B Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Ihe A Kpọrọ Mmadụ
Feb. 2 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 17-19
Abụ nke 97 [*Jenesis 31-36]
Nke 1: Jehova—Onye Na-ahụ Ezi Omume na Ezi Ikpe n’Anya (w96 3/15 p. 21-23)
Nke 2: Ọrụ 18:1-11
Nke 3: Otú Ịnọgidesi Ike n’Ihe Si Etinye Ihe n’Alụmdi na Nwunye Obi Ụtọ (kl p. 140-141 para. 1-6)
Nke 4: td 4C Ịchịisi Alaeze Amalite Mgbe Ndị Iro Kraịst Ka Nọ n’Ọrụ
Feb. 9 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 20-21
Abụ nke 103 [*Jenesis 37-42]
Nke 1: Na-atụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị Mgbe Nile (w96 4/1 p. 27-30)
Nke 2: Ọrụ 21:1-14
Nke 3: Ọrụ Dị Mkpa nke Nkwurịta Okwu n’Alụmdi na Nwunye (kl p. 142-143 para. 7-9)
Nke 4: td 4E Alaeze Chineke Adịghị Abịa Site ná Mgbalị Mmadụ
Feb. 16 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 22-24
Abụ nke 107 [*Jenesis 43-49]
Nke 1: “Mgbe Ịgba Nkịtị, na Mgbe Ikwu Okwu” (w96 5/15 p. 21-23)
Nke 2: Ọrụ 22:1-16
Nke 3: Gosi Onye Òtù Ọlụlụ Gị Nsọpụrụ na Nkwanye Ùgwù (kl p. 143-144 para. 10-14)
Nke 4: td 58A Ihe “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara n’Ezie
Feb. 23 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 25-26
Abụ nke 89 [*Jenesis 50–Ọpụpụ 7]
Nke 1: Gịnị Ka Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara? (w96 6/15 p. 4-7)
Nke 2: Ọrụ 25:1-12
Nke 3: Setịpụ Ezi Ihe Nlereanya ma Gosi Ụmụ Gị Ịhụnanya (kl p. 145-146 para. 15-18)
Nke 4: td 58B Mụrụ Anya Maka Ihe Àmà nke Mgbe Ikpeazụ
Mar. 2 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 27-28
Abụ nke 92 [*Ọpụpụ 8-13]
Nke 1: w90 5/15 p. 26 para. 1-4 (gụnyere igbe ndị dị na peji nke 25 na 26.)
Nke 2: Ọrụ 27:33-44
Nke 3: Ihe Ịdọ Aka ná Ntị Ịhụnanya na Ezi Ndụmọdụ Pụrụ Ịrụzu (kl p. 148-149 para. 19-23)
Nke 4: td 34B Chineke Na-ekwe Nkwa Ndụ Ebighị Ebi Maka Ihe A Kpọrọ Mmadụ Na-erube Isi
Mar. 9 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 1-3
Abụ nke 79 [*Ọpụpụ 14-20]
Nke 1: w90 8/1 p. 23-24 para. 3
Nke 2: Ndị Rom 1:18-32
Nke 3: Ihe Mere Anyị Ji Chọọ Ịbịaru Chineke Nso (kl p. 150-151 para. 1-5)
Nke 4: td 34D Ọ Bụghị Mmadụ Nile Ga-eje Eluigwe
Mar. 16 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 4-6
Abụ nke 36 [*Ọpụpụ 21-27]
Nke 1: “Rịbanụ Ndị Ikom Dị Otú ahụ Ama” (w96 6/15 p. 28-30)
Nke 2: Ndị Rom 4:1-15
Nke 3: Ihe Ndị A Chọrọ Maka Ịbịaru Chineke Nso (kl p. 152-153 para. 6-9)
Nke 4: td 34E E Kwere Ọnụ Ọgụgụ A Na-akaghị Aka nke “Atụrụ Ọzọ” Nkwa Ndụ Ebighị Ebi
Mar. 23 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 7-9
Abụ nke 84 [*Ọpụpụ 28-33]
Nke 1: Ihe Ihe Ndị E Kere Eke “Maara Ihe nke Ukwuu” Pụrụ Ịkụziri Anyị (w96 7/15 p. 21-23)
Nke 2: Ndị Rom 9:1-18
Nke 3: Gwa Chineke Okwu, Ka Ọ Nụkwa Olu Gị (kl p. 154-156 para. 10-14)
Nke 4: td 56B A Ghaghị Ịsọpụrụ Nkekọ Alụmdi na Nwunye
Mar. 30 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 10-12
Abụ nke 165 [*Ọpụpụ 34-39]
Nke 1: Ihe Mmụta Ndị Bara Uru Site n’Ala Nkwa Ahụ (w96 8/15 p. 4-8)
Nke 2: Ndị Rom 10:1-15
Nke 3: Nọgidesie Ike n’Ekpere ma Gee Ntị (kl p. 156-159 para. 15-20)
Nke 4: td 56C Ndị Kraịst Aghaghị Ịkwanyere Ụkpụrụ Ịbụisi Ùgwù
Apr. 6 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 13-16
Abụ nke 175 [*Ọpụpụ 40–Levitikọs 7]
Nke 1: w90 8/1 p. 24 para. 4 ruo p. 25 para. 4 (gụnyere igbe)
Nke 2: Ndị Rom 13:1-10
Nke 3: Chọta Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Etiti Ndị Chineke (kl p. 160-161 para. 1-4)
Nke 4: td 56D Ọrụ Nne na Nna Bụ́ Ndị Kraịst n’Ebe Ụmụaka Nọ
Apr. 13 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 1-3
Abụ nke 173 [*Levitikọs 8-13]
Nke 1: w90 9/15 p. 24-25 para. 1 (n’agụnyeghị igbe)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 1:10-25
Nke 3: Otú Jehova Si Enye Nri Ime Mmụọ (kl p. 161-163 para. 5-8)
Nke 4: td 56E Ndị Kraịst Kwesịrị Ịlụ Nanị Ndị Kraịst Ibe Ha
Apr. 20 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 4-6
Abụ nke 170 [*Levitikọs 14-19]
Nke 1: Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka? (w96 9/1 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 4:1-13
Nke 3: Ihe Iyikwasị Ịhụnanya Pụtara (kl p. 163-166 para. 9-14)
Nke 4: td 56F Ezi Ndị Kraịst Adịghị Alụ Ìgwè Nwanyị
Apr. 27 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Ọrụ 7–1 Ndị Kọrint 6
Abụ nke 26 [*Levitikọs 20-25]
May 4 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 7-9
Abụ nke 152 [*Levitikọs 26–Ọnụ Ọgụgụ 3]
Nke 1: Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ezie Ịrịọ Mgbaghara? (w96 9/15 p. 22-24)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 7:10-24
Nke 3: Ọgbakọ—Ebe Ịnọ ná Ntụkwasị Obi (kl p. 167-169 para. 15-20)
Nke 4: td 18A Meri Abụghị “Nne Chineke”
May 11 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 10-12
Abụ nke 185 [*Ọnụ Ọgụgụ 4-9]
Nke 1: Ịlaghachi n’Ájá—N’ụzọ Dị Aṅaa? (w96 9/15 p. 29-31)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 11:1-16
Nke 3: Ṅomie Jisọs—Fee Chineke Ruo Mgbe Ebighị Ebi (kl p. 170-171 para. 1-6)
Nke 4: td 18C Bible Na-egosi na Meri “Anọgideghị n’Amaghị Nwoke”
May 18 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 13-14
Abụ nke 55 [*Ọnụ Ọgụgụ 10-15]
Nke 1: Ihe Ịma Aka nke Mmadụ Igbo Mkpa Ezinụlọ Ya (w96 10/1 p. 29-31)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 14:1-12
Nke 3: Nzọụkwụ Dị Mkpa Ndị Na-eduba ná Ndụ (kl p. 173-175 para. 7-9)
Nke 4: td 14A Ihe Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere Ememe Ncheta Ahụ
May 25 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 15-16
Abụ nke 158 [*Ọnụ Ọgụgụ 16-22]
Nke 1: w90 9/15 p. 25 para. 2-6 (gụnyere igbe ndị dị na peji nke 24-25)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 16:1-13
Nke 3: Ihe Mere Baptism Ji Dị Mkpa (kl p. 175-176 para. 10-12)
Nke 4: td 14B Ememe Mas Esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ
June 1 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Kọrint 1-4
Abụ nke 58 [*Ọnụ Ọgụgụ 23-29]
Nke 1: w90 9/15 p. 26 para. 1-6 (gụnyere igbe)
Nke 2: 2 Ndị Kọrint 4:1-12
Nke 3: Baptism—Nzọụkwụ Kasị Mkpa ná Ndụ Gị (kl p. 176-177 para. 13-16)
Nke 4: td 40A Ihe Mere E Ji Akpagbu Ezi Ndị Kraịst
June 8 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Kọrint 5-8
Abụ nke 102 [*Ọnụ Ọgụgụ 30-35]
Nke 1: Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—N’ụzọ Dị Aṅaa, n’Ebee, Olee Mgbe? (w96 10/15 p. 4-7)
Nke 2: 2 Ndị Kọrint 7:1-13
Nke 3: Ihe Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye na Baptism Gị Pụtara (kl p. 178-180 para. 17-22)
Nke 4: td 40C Nwunye Ekwesịghị Ikwe Ka Di Ya Kewapụ Ya n’Ebe Chineke Nọ
June 15 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Kọrint 9-13
Abụ nke 43 [*Ọnụ Ọgụgụ 36–Deuterọnọmi 4]
Nke 1: w90 9/15 p. 27 para. 1-4 (gụnyere igbe)
Nke 2: 2 Ndị Kọrint 10:1-12
Nke 3: Ịkwadebe Ugbu A Maka “Ndụ ahụ nke Bụ Ndụ n’Ezie” (kl p. 181-182 para. 1-5)
Nke 4: td 40D Di Ekwesịghị Ikwe Ka Nwunye Ya Gbochie Ya Ife Chineke
June 22 Ọgụgụ Bible: Ndị Galetia 1-3
Abụ nke 127 [*Deuterọnọmi 5-11]
Nke 1: w90 11/15 p. 23 para. 1-3
Nke 2: Ndị Galetia 1:1-12
Nke 3: Amagedọn Gasịa—Ụwa Paradaịs (kl p. 182-184 para. 6-11)
Nke 4: td 11A Ekpere Ndị Chineke Na-anụ
June 29 Ọgụgụ Bible: Ndị Galetia 4-6
Abụ nke 98 [*Deuterọnọmi 12-19]
Nke 1: w90 11/15 p. 23 para. 4-6 (gụnyere igbe)
Nke 2: Ndị Galetia 6:1-18
Nke 3: Udo n’Ebe Nile na Mbilite n’Ọnwụ nke Ndị Nwụrụ Anwụ (kl p. 184-187 para. 12-18)
Nke 4: td 11C Ihe Mere na Ekpere Ụfọdụ Adịghị Irè
July 6 Ọgụgụ Bible: Ndị Efesọs 1-3
Abụ nke 71 [*Deuterọnọmi 20-27]
Nke 1: w90 11/15 p. 24 para. 1-4
Nke 2: Ndị Efesọs 1:1-14
Nke 3: Ihe Izu Okè Ga-apụta, na Otú Anyị Pụrụ Isi Nweta Ya (kl p. 187-191 para. 19-25)
Nke 4: td 53A A Kaghị Ọdịnihu Mmadụ Aka
July 13 Ọgụgụ Bible: Ndị Efesọs 4-6
Abụ nke 214 [*Deuterọnọmi 28-32]
Nke 1: w90 11/15 p. 24 para. 5-8 (gụnyere igbe)
Nke 2: Ndị Efesọs 6:1-13
Nke 3: td 22A Ndụ Mmadụ Jisọs Bụ “Ihe Mgbapụta Maka Mmadụ Nile”
Nke 4: Ezinụlọ Nọ n’Ọgba Aghara (fy p. 1-9 para. 1-14)
July 20 Ọgụgụ Bible: Ndị Filipaị 1-4
Abụ nke 123 [*Deuterọnọmi 33–Joshua 6]
Nke 1: w90 11/15 p. 25 (gụnyere igbe)
Nke 2: Ndị Filipaị 1:1-14
Nke 3: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ (fy p. 10-12 para. 15-23)
Nke 4: td 22B Ihe Mere Jisọs Pụrụ Iji Kwụọ Ihe Mgbapụta Ahụ
July 27 Ọgụgụ Bible: Ndị Kọlọsi 1-4
Abụ nke 64 [*Joshua 7-12]
Nke 1: w90 11/15 p. 26 (gụnyere igbe)
Nke 2: Ndị Kọlọsi 4:1-13
Nke 3: td 48A Ụzọ Isi Mata Otu Ezi Okpukpe Ahụ
Nke 4: Ị̀ Dị Njikere Maka Alụmdi na Nwunye? (fy p. 13-15 para. 1-6)
Aug. 3 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Tesalọnaịka 1-5
Abụ nke 35 [*Joshua 13-19]
Nke 1: w91 1/15 p. 22 (gụnyere igbe)
Nke 2: 1 Ndị Tesalọnaịka 2:1-12
Nke 3: Ihe Mere Ị Ga-eji Mara Onwe Gị ma Chezie Echiche (fy p. 16-18 para. 7-10)
Nke 4: td 48C Ọ̀ Dị Njọ Ịkatọ Ozizi Ụgha?
Aug. 10 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Tesalọnaịka 1-3
Abụ nke 10 [*Joshua 20–Ndị Ikpe 1]
Nke 1: w91 1/15 p. 23 (gụnyere igbe)
Nke 2: 2 Ndị Tesalọnaịka 1:1-12
Nke 3: td 48E Mgbe Chineke Na-akwado Mgbanwe Okpukpe
Nke 4: Ihe Ị Ga-ele Anya Ha n’Onye Ị Ga-alụ (fy p. 18-22 para. 11-15)
Aug. 17 Ọgụgụ Bible: 1 Timoti 1-3
Abụ nke 221 [*Ndị Ikpe 2-7]
Nke 1: w91 1/15 p. 30 para. 1-3
Nke 2: 1 Timoti 1:3-16
Nke 3: Ihe Ndị A Ga-atụle Tupu Ime Nraranye Na-adịgide Adịgide (fy p. 22-23 para. 16-19)
Nke 4: td 48G Chineke Ọ̀ Na-ahụ Ihe Dị Mma n’Okpukpe Nile?
Aug. 24 Ọgụgụ Bible: 1 Timoti 4-6
Abụ nke 30 [*Ndị Ikpe 8-13]
Nke 1: w91 1/15 p. 30 para. 4-8 (gụnyere igbe)
Nke 2: 1 Timoti 4:1-16
Nke 3: td 30A Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ?
Nke 4: Mee Ka Mbedo Unu Dị Nsọpụrụ, ma Lee Anya Gabiga Agbamakwụkwọ (fy p. 24-26 para. 20-23)
Aug. 31 Ntụleghachi Odide. Gụzuo 1 Ndị Kọrint 7–1 Timoti 6
Abụ nke 59 [*Ndị Ikpe 14-19]
Sept. 7 Ọgụgụ Bible: 2 Timoti 1-4
Abụ nke 46 [*Ndị Ikpe 20–Rut 4]
Nke 1: w91 1/15 p. 31 (gụnyere igbe)
Nke 2: 2 Timoti 3:1-13
Nke 3: Ụkpụrụ Bible Ndị Pụrụ Inyere Gị Aka Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma (fy p. 26 igbe ntụleghachi)
Nke 4: td 30B N’ebee Ka A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ Gaa?
Sept. 14 Ọgụgụ Bible: Taịtọs 1–Faịlimọn
Abụ nke 155 [*1 Samuel 1-8]
Nke 1: w91 2/15 p. 22-23 (gụnyere igbe)
Nke 2: Taịtọs 3:1-14
Nke 3: td 38A Nlaghachi Kraịst Bụ nke A Na-adịghị Ahụ Anya
Nke 4: Mkpịsị Ugodi nke Mbụ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide (fy p. 27-29 para. 1-6)
Sept. 21 Ọgụgụ Bible: Ndị Hibru 1-3
Abụ nke 149 [*1 Samuel 9-14]
Nke 1: w91 2/15 p. 24 para. 1-6 (n’agụnyeghị igbe)
Nke 2: Ndị Hibru 3:1-15
Nke 3: Mkpịsị Ugodi nke Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide (fy p. 30-31 para. 7-10)
Nke 4: td-IB 38B A Na-aghọta Nlaghachi Kraịst Site n’Ihe Na-eme Eme A Na-ahụ Anya
Sept. 28 Ọgụgụ Bible: Ndị Hibru 4-7
Abụ nke 51 [*1 Samuel 15-19]
Nke 1: N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe? (w96 11/1 p. 28-30)
Nke 2: Ndị Hibru 6:1-12
Nke 3: td 59A Iwu Ejighị Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike
Nke 4: Ịbụisi nke Nwoke Kwesịrị Iyi nke Kraịst (fy p. 31-33 para. 11-15)
Oct. 5 Ọgụgụ Bible: Ndị Hibru 8-10
Abụ nke 143 [*1 Samuel 20-25]
Nke 1: Ṅomie Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu nke Jehova (w96 11/15 p. 25-27)
Nke 2: Ndị Hibru 8:1-12
Nke 3: Otú Nwunye Ga-esi Kwesị Di Ya (fy p. 34-35 para. 16-19)
Nke 4: td 59B E Nyeghị Ndị Kraịst Iwu Ụbọchị Izu Ike
Oct. 12 Ọgụgụ Bible: Ndị Hibru 11-13
Abụ nke 108 [*1 Samuel 26–2 Samuel 2]
Nke 1: w91 2/15 p. 24 para. 7 (gụnyere igbe) ruo p. 25 para. 3
Nke 2: Ndị Hibru 11:1-10
Nke 3: td 59D Mgbe Ụbọchị Izu Ike Chineke Malitere ma Gwụsịa
Nke 4: Ihe Nkwurịta Okwu Dị Mma Pụtara n’Ezie (fy p. 35-38 para. 20-26)
Oct. 19 Ọgụgụ Bible: Jemes 1-5
Abụ nke 144 [*2 Samuel 3-10]
Nke 1: w91 3/15 p. 23 (gụnyere igbe)
Nke 2: Jemes 5:1-12
Nke 3: Ụkpụrụ Bible Ndị Pụrụ Inyere Gị Aka Ịnụ Ụtọ Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide, nke Obi Ụtọ (fy p. 38 igbe ntụleghachi)
Nke 4: td 44B Chineke Na-enye Nzọpụta Nanị Site na Kraịst
Oct. 26 Ọgụgụ Bible: 1 Pita 1-5
Abụ nke 54 [*2 Samuel 11-15]
Nke 1: w91 3/15 p. 30 (gụnyere igbe)
Nke 2: 1 Pita 4:1-11
Nke 3: td 44D Ozizi “A Zọpụta Otu Ugbo, A Zọpụtasịwo” Esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ
Nke 4: Konye Akpa Gị Ebe Aka Gị Ga-eru (fy p. 39-41 para. 1-6)
Nov. 2 Ọgụgụ Bible: 2 Pita 1-3
Abụ nke 177 [*2 Samuel 16-20]
Nke 1: w91 3/15 p. 31 (gụnyere igbe)
Nke 2: 2 Pita 3:1-13
Nke 3: Ilekọta Ebe Obibi Bụ Ọrụ nke Ezinụlọ (fy p. 42-44 para. 7-11)
Nke 4: td-IB 44E Ozizi “Nzọpụta Ụwa Nile” Esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ
Nov. 9 Ọgụgụ Bible: 1 Jọn 1-5
Abụ nke 114 [*2 Samuel 21–1 Ndị Eze 1]
Nke 1: w91 4/15 p. 29 (gụnyere igbe)
Nke 2: 1 Jọn 5:1-12
Nke 3: td 41A Ihe Mmehie Bụ
Nke 4: Ihe Mere Jehova Ji Chọọ Ka Anyị Dị Ọcha (fy p. 45-49 para. 12-20)
Nov. 16 Ọgụgụ Bible: 2 Jọn–Jud
Abụ nke 22 [*1 Ndị Eze 2-6]
Nke 1: w91 4/15 p. 30-31 (gụnyere igbe)
Nke 2: 2 Jọn 1-13
Nke 3: Ihe Ịja Mma na Ekele Si n’Ezi Obi Pụrụ Imere Ezinụlọ (fy p. 49-50 para. 21-22)
Nke 4: td-IB 41B Ihe Mere Mmadụ Nile Ji Ata Ahụhụ Site ná Mmehie Adam
Nov. 23 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 1-3
Abụ nke 195 [*1 Ndị Eze 7-10]
Nke 1: w91 5/1 p. 21 (gụnyere igbe) ruo p. 22 para. 4
Nke 2: Mkpughe 3:1-11
Nke 3: td 41C Gịnị Bụ Mkpụrụ Osisi ahụ A Machibidoro Iwu?
Nke 4: Echiche Bible Banyere Ụmụaka na Ibu Ọrụ Ezinụlọ (fy p. 51-52 para. 1-5)
Nov. 30 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 4-6
Abụ nke 168 [*1 Ndị Eze 11-15]
Nke 1: Ị̀ Gaara Amataworị Mesaịa Ahụ? (w96 11/15 p. 28-31)
Nke 2: Mkpughe 5:1-12
Nke 3: Ihe Imezu Mkpa Nwatakịrị Pụtara (fy p. 53-55 para. 6-9)
Nke 4: td 41F Gịnị Bụ Mmehie Megide Mmụọ Nsọ?
Dec. 7 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 7-9
Abụ nke 53 [*1 Ndị Eze 16-20]
Nke 1: Gịnị Mere A Ga-eji “Cheta Ụbọchị Ndị Gaworo Aga”? (w96 12/1 p. 29-31)
Nke 2: Mkpughe 8:1-13
Nke 3: td 37A Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?
Nke 4: Kụnye Eziokwu ahụ n’Ime Nwa Gị (fy p. 55-57 para. 10-15)
Dec. 14 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 10-12
Abụ nke 34 [*1 Ndị Eze 21–2 Ndị Eze 3]
Nke 1: Echiche Chineke Banyere Ihe Ọṅụṅụ Ndị Na-aba n’Anya (w96 12/15 p. 25-29)
Nke 2: Mkpughe 10:1-11
Nke 3: Kụziere Nwa Gị Ụzọ Jehova (fy p. 58-59 para. 16-19)
Nke 4: td 37B Olee Otú Mkpụrụ Obi na Mmụọ Si Dị Iche?
Dec. 21 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 13-15
Abụ nke 60 [*2 Ndị Eze 4-9]
Nke 1: Olileanya Ka Mma Maka Mkpụrụ Obi (w96 8/1 p. 4-8)
Nke 2: Mkpughe 13:1-15
Nke 3: td 29A Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?
Nke 4: Mkpa Gbara Ọkpụrụkpụ nke Ịdọ Aka ná Ntị n’Ụdị Ya Dị Iche Iche (fy p. 59-61 para. 20-23)
Dec. 28 Ntụleghachi Odide. Gụzuo 2 Timoti 1–Mkpughe 15
Abụ nke 212 [*2 Ndị Eze 10-15]