Kwuo Okwu Banyere Jehova Kwa Ụbọchị
1 Ụmụ mmadụ na-enwe ọṅụ ikwu okwu banyere ihe ọ bụla ha nwere mmasị na ya, n’ihi na ọnụ na-ekwu okwu site n’ihe obi nwebigara ókè. (Luk 6:45b) Gịnị na-amasị obi anyị? Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ire m ga na-ekwu okwu, dị ka onye na-atụgharị uche, banyere ezi omume Gị, banyekwara otuto Gị ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 35:28) O nwere ekele miri emi maka Jehova ma were ya n’ihe ùgwù n’ezie ikwu banyere Chineke na ito ya n’oge ọ bụla. N’ihi ịmata Jehova nke ọma, ọbụ abụ ahụ nwere ọtụtụ ihe dị mma ite egwú ọṅụ n’ime ha. (Abụ Ọma 35:9) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ezi ihe nlereanya ya?
2 Kwuo Okwu Banyere Jehova n’Ụlọ Gị: Jehova kwesịrị ịbụ isiokwu mkparịta ụka kwa ụbọchị n’ime ezinụlọ. Nne na nna ndị nwere ịhụnanya siri ike maka Jehova ga na-ekwu maka ya n’ihe nile ha na-eme. (Deut. 6:5-7) Ka ha na-eme nke a, ụmụ ha ga-ahụ na nne na nna ha nwere okwukwe ma jiri iwu Chineke kpọrọ ihe. Mgbe ahụ ụmụaka ahụ ga-ele ọmụmụ Bible ezinụlọ anya dị ka ezi ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke nke ndị mụrụ ha.—2 Pita 3:11.
3 Soro Ụmụnna Gị Kwurịta Okwu Banyere Jehova: N’oge usoro ihe omume ọchịchị Chineke anyị kwa izu, anyị nwere ọtụtụ ohere inye uche na obi anyị nri ime mmụọ. Anyị anọghị n’ụkọ ihe ndị dị mma anyị ga-ekwu mgbe ọ bụla. (Luk 6:45a) Ọ̀ dị ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe onwe onye gị ma ọ bụ site n’ọgụgụ Bible kwa izu nke masịrị gị karịsịa? Soro ụmụnna gị kerịta ya, si otú a nyere ha aka ịmụba ịhụnanya ha n’ebe Jehova nọ.—Abụ Ọma 35:18; Hib. 10:24.
4 Gwa Ndị Ọzọ Banyere Jehova: Ná mmekọrịta anyị na ndị mmadụ kwa ụbọchị—n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa anyị na ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe—o kwesịrị ido nnọọ anya na ebe nlekwasị anya anyị ná ndụ bụ n’ịgba àmà banyere Jehova. Kama ịbụ nke e ji okwu ụwa ndị na-akpasu iwe, ndị na-adịghịkwa mma ná ntị tetọọ, okwu anyị kwesịrị ibuli Chineke elu. Kwa ụbọchị, n’ohere ọ bụla, gwa ndị ọzọ banyere ozi ọma o nyeworo anyị iwu ikwusa.—Ọrụ 5:42; Kọl. 4:6.
5 Dị ka ndị na-efe Jehova ezi ofufe, ka anyị were oge dị iche iche kwa ụbọchị kwuo banyere Chineke anyị na-enweghị atụ, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 106:47.