Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke January 5 ruo April 20, 1998. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. N’Ọrụ 15:29, okwu ahụ bụ́ [“Ahụ ike dịkwara unu,” NW] bụ nkwa e kwere nke na, ‘Ọ bụrụ na unu ezere ọbara na ịkwa iko, ahụ ga-adị unu mma karị.’ [4, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 6/15 p. 9 para. 7, nkọwa ala ala peji.]
2. N’ikwekọ ná Ndị Efesọs 5:33, nwanyị ịtụ egwu di ya apụtaghị na ọ pụghị ikwupụta echiche ya, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu. [7, kl p. 144 para. 12-13]
3. Nye ndị Ijipt, e lere Fero anya dị ka Horus lọrọ ụwa n’onwe ya, bụ́ chi nwere isi agụ nkwọ. [2, w96 1/15 p. 24 para. 1]
4. Okwu Bekee ahụ bụ́ “simony,” nke e nwetara site n’ihe omume ahụ e dekọrọ n’Ọrụ 8:9-24, na-ezo aka n’ime nkà majik. [1, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 6/1 p. 17 para. 8.]
5. Ná Ndị Rom 8:6, 7 “anụ ahụ” na-ezo aka n’ọnọdụ daworo ada anyị dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị nwere ọchịchọ ime mmehie e ketara eketa. [12, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 3/1 p. 21 para. 4.]
6. Ebe ọ bụ na Jehova mesịrị nakwere onyinye ihe ọkụkụ na mkpụrụ osisi ala ndị ọzọ, o doro anya na a jụrụ onyinye ịnata ihu ọma Ken n’ihi na ọ dị ihe dị njọ banyere obi ya. (Jen. 4:3-5) [8, w96 6/15 p. 4 para. 8]
7. Ka onye Kraịst na-etinye ụkpụrụ omume na nke ime mmụọ nke Bible n’ọrụ ná ndụ ya, Okwu Jehova na-eme ka ọ dị ọcha, ‘sachaa’ ya pụọ n’omume nile Jehova Chineke na-akpọ asị. (1 Kọr. 6:9-11) [1, w96 1/1 p. 30 para. 4]
8. Pọl onyeozi mere ndị òtù ezinụlọ Stefanas baptism n’onwe ya na Kọrint. [11, w96 6/15 p. 29 para. 2]
9. N’Ọrụ 20:20, okwu ahụ bụ́ ‘n’ụlọ nke aka unu n’otu n’otu’ na-ezo aka nanị ná nleta ọzụzụ atụrụ n’ụlọ ndị kwere ekwe ibe ya n’ihi na ihe a na-ekwu na-egosi na Pọl na-agwa ndị okenye ọgbakọ ahụ okwu. [6, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91-IB 1/15 p. 11 para. 5.]
10. Ọ bụrụ na anyị azụọ obi anyị ịghọta ihe ime mmụọ, na-ekpe ekpere ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka na nke a, mgbe ahụ anyị ga-ezere “ichela echiche n’anụ ahụ.” (Rom 8:6, 7, NW) [12, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 3/1 p. 21 para. 5.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Ihe ndekọ dị aṅaa dị n’akwụkwọ Ọrụ na-egosi na nanị inwe Okwu Chineke ma na-agụ ya n’onwe onye ezughị iji nweta ezi ihe ọmụma nke na-eme ka mmadụ na-aga n’ụzọ nke ndụ? [1, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 9/1 p. 19 para. 16.]
12. Gịnị kwesịrị igbochi anyị ikpe ụmụnna ime mmụọ anyị ikpe n’ụzọ dị njọ? [5, w96 3/15 p. 22 para. 6]
13. N’Ọrụ 11:26, gịnị mere New World Translation jiri na-ewere okwu ahụ bụ́ ‘site ná nduzi Chineke, a kpọrọ ha ndị Kraịst’ mee ihe, ebe nsụgharị Bible ndị ọzọ adịghị agụnye echiche nke “nduzi Chineke”? [3, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 6/1 p. 19 para. 19.]
14. Gịnị ga-enyere onye Kraịst bụ́ nwunye aka inwe nsọpụrụ dị omimi maka di ya? (Efe. 5:33) [4, w96 3/1 p. 21 para. 5]
15. Gịnị ka eziokwu nke na Pọl dere, sị: “Ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo” na-egosipụta? (Rom 13:1) [2, kl p. 131 para. 7]
16. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Rom, gịnị ka Pọl guzobesiri ike banyere ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu? [10, w90 8/1 p. 23]
17. Dị ka Ndị Rom 12:2 na-egosi, ruo ókè hà aṅaa ka ike nke Okwu Chineke na-agbanwe ọdịdị mmadụ nke ndị Kraịst? [13, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 4/1 p. 16 para. 3.]
18. Gịnị bụ “ihe omimi” ahụ Pọl kpọtụrụ aha ná Ndị Rom 11:25? [13, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84 2/15 p. 11 para. 16.]
19. N’ihi gịnị ka ọgbakọ ndị Kraịst ji zie ezi n’ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị? (1 Kọr. 5:11, 13) [16, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee g96 9/8 p. 27 para. 2-3.]
20. Olee otú ikpokwasị icheku na-ere ọkụ n’isi onye iro ga-esi nye aka imeri ihe ọjọọ? (Rom 12:20, 21) [13, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee g87 6/8 p. 16 para. 5.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Filip kọwaara ọnaozi Etiopia otú amụma _________________________ siworo mezuo, ozugbo kwa o nwetara ihe ọmụma, onye a jiri obi umeala rịọ ka e mee ya _________________________. (Ọrụ 8:28-35) [1, Ọgụgụ Bible kwa izu]
22. Mgbe a na-arụrịta ụka maka okwu _________________________, ọ bụ _________________________ kwadoro mkpebi ya site n’ikwu, sị: “Nke a na okwu ndị amụma nwekwara otu olu; dị ka e deworo n’akwụkwọ nsọ.” (Ọrụ 15:15-18) [4, Ọgụgụ Bible kwa izu]
23. Àgwà nke _________________________ na-eme ka anyị nwee ike ‘ịgụ ndị ọzọ ná ndị ka anyị mma,’ ebe _________________________ na-eme ka anyị “na-anagide ihe ọjọọ.” (Fil. 2:3; 2 Tim. 2:24, 25) [7, w96 5/15 p. 21 para. 5]
24. Dị ka ihe atụ Pọl nke osisi olive ihe atụ ná Ndị Rom isi nke 11 si gosi, dị ka ebo 12 ahụ nke Israel topụtara site n’Abraham site n’Aịsak, otú a ka ebo 12 ihe atụ nke _________________________ topụtara site na _________________________ site na _________________________. [13, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84-IB 2/15 p. 11 para. 15.]
25. Dị ka Jehova kwagidere ụmụ Israel mara ụlọikwuu n’Ọzara _________________________, o nwere ike ịkwagide anyị n’ime _________________________. [13, w96 8/15 p. 7 para. 1-2]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Site n’okwu ya dị n’Ọrụ isi nke 17, Pọl ji akọ guzobe (ọbụbụeze; ezi omume; ịhụnanya) nke Chineke dị ndụ. [5, Ọgụgụ Bible kwa izu]
27. (Pọl; Pita; Luk) jara ndị (Beria; Masedonia; Jerusalem) mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ihi ịdị uchu ha n’inyocha Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:11) [5, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 5/1 p. 13 para. 3.]
28. Ụgha ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 1:25 na-ezo aka n’ebe (ikpere arụsị; omume mmekọahụ na-adịghị ọcha; omume nke ịgha ụgha) dị. [10, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 11/15 p. 6 para. 6.]
29. N’ezie, (ndị mmadụ; Chineke na Kraịst; Setan na ndị mmụọ ọjọọ) ka a ga-atakarị ụta mgbe ihe gahiere. [16, w96 9/1 p. 5 para. 3]
30. Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ ozi ya nke mbụ mgbe ọ nọ na (Rom; Efesọs; Kọrint) n’ihe dị ka afọ (52; 55; 56) O.A. [15, w90 9/15 p. 24]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ilu 17:27; Ekli. 9:11; Mat. 10:16; Ọrụ 10:34, 35; 2 Kọr. 4:18
31. Dị ka ndị ohu Jehova, anyị kwesịrị ịdị na-ele ndị agbụrụ nile anya dị ka o si ele ha. [2, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 5/15 p. 16 para. 6.]
32. Anyị kwesịrị ile anya gabiga ọnọdụ anyị ugbu a, na-elekwasị anya anyị n’ihe obi ụtọ ga-esi n’ụzọ ndị Kraịst pụta. [3, w96 2/15 p. 27 para. 3-4]
33. Nghọta na ịhụnanya ụmụnna ga-enyere anyị aka ịchịkwa mkpali anyị ikwupụta ihe na-egbu mgbu n’obi. [7, w96 5/15 p. 22 para. 7]
34. Mgbe ha chere mkpagbu ihu, ọ dị ezi ndị Kraịst mkpa ijikọta inwe uche na ịdị ọcha n’ịkpọsara ndị ọzọ ozi Alaeze ahụ. [12, w96 7/15 p. 22 para. 4]
35. E nweghị ihe mere a ga-eji kwere na ọ bụ Onye Okike na-akpata ihe ọghọm ma ọ bụ na a na-enye ndị nwere ihe ọghọm ntaramahụhụ n’ụzọ ụfọdụ. [16, w96 9/1 p. 5 para. 4]