Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/98 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 4/98 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ April na May: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! Magazin ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa maka otu afọ, ₦280. Otu afọ maka ndị a na-ebipụta otu ugboro n’ọnwa ma ọ bụ ọnwa isii maka ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa: ₦140. June: Nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị na-esonụ nwere peji dị 192 nke ọgbakọ pụrụ inwe: Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, “Ka Alaeze Gị Bịa,” Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ, na Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ. July na August: Bekee—A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe: Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile. Ọzọkwa, e kwesịrị ịgba ndị bụ nne na nna ume inweta ma mee ka ndị nkụzi ụmụ ha mara maka broshuọ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ na Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile. Igbo—A pụrụ iji nke nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe. Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs.

◼ Mgbe a na-arụ ókèala a na-eketaghị ọrụ, ndị nkwusa pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ. A pụrụ inyefe mbipụta ọzọ ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enweworị mbipụta abụọ ndị a. Mmadụ nile kwesịrị ịchịrị traktị dị iche iche maka ndị na-anọghị n’ụlọ ma ọ bụ ndị na-anataghị akwụkwọ. E kwesịrị ịhapụrụ ndị nwe ụlọ Akụkọ Alaeze nke 35 ọ bụla ndị nkwusa ma ọ bụ ọgbakọ ka nwere. E kwesịrị ime mgbalị isochi mmasị, karịsịa n’ókèala ndị a na-eketaghị ọrụ bụ́ ebe ndị ọgbakọ ndị dị nso pụrụ ịgaru.

◼ N’inwe ngwụsị izu ise zuru ezu, ọnwa May bụ oge dị mma nye ọtụtụ ndị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Na May 30, 1998, a ga-emechi ihe owuwu Betel. Biko abịala maka nleta ma ọ bụ inweta akwụkwọ n’ụbọchị a.

◼ Ọ bụrụ na o nwere ụmụnna na-aga United States ma chọọ inweta ụlọ na họtel dị Betel nso, biko detara alaka nke Nigeria akwụkwọ, anyị ga-enyekwa unu ihe ọmụma dị ọhụrụ.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Ndụ n’ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo

(Traktị nke 15) —Urhobo

Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?

(Traktị nke 16) —Edo, Itsekiri, Ogoni

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya