Nzukọ Ije Ozi Maka April
Izu Na-amalite April 6
Abụ 27
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara mmadụ nile ebe na oge ime Ememe Ncheta na Saturday, April 11. Akụkọ Ọchịchị Chineke.
15 min: “Ozi Anyị—Ngosipụta nke Ezi Ịhụnanya.” Ajụjụ na azịza. Tinye okwu dị mkpirikpi site n’Ụlọ Nche nke November 15, 1987, peji nke 22-23, paragraf nke 3-7.
20 min: “Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ.” Okenye esoro otu ìgwè ndị nkwusa atọ ma ọ bụ anọ bụ́ ndị dị irè n’itinye magazin tụlee isiokwu. Tụlee ihe ndị na-adọrọ adọrọ na magazin ndị ọhụrụ, na-atụ aro ụzọ a pụrụ isigasị webata isi ihe ndị a n’ụzọ anyị si eche ihe n’ihu mmadụ. Tụlee ụzọ a pụrụ isi mụbaa nkesa magazin n’ókèala ọgbakọ. Na-eji mbipụta ndị ọhụrụ, zoo aka n’isiokwu ndị na-akpali mmasị, dị ka ndị gbasara nsogbu ọha na eze, ezinụlọ, ma ọ bụ ógbè. Mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ dị mkpirikpi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ.
Abụ 205 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 13
Abụ 90
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwaa na oge agafechabeghị itinye akwụkwọ maka ịsụ ụzọ inyeaka na May.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Gaa Nzukọ ‘Karịakwa Otú a.’” Ajụjụ na azịza. Ka oge nyere ohere ya, tụleghachi okwu ịdọ aka ná ntị a na-achọta n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 64-65. Nye ndị nile na-abịachi nzukọ anya ịja mma na-ekpo ọkụ.
Abụ 119 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 20
Abụ 5
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu bụ́ onye ga-eji obiọma rụtụ aka kpọmkwem n’ụzọ dị iche iche a pụrụ isi mee ka ihe ka mma n’ọgbakọ.
25 min: “Iji Ọṅụ Na-egbo Mkpa Owuwe Ihe Ubi Ahụ.” Ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu. Nke onye okenye ruru eru ga-eme. Mesie ike uru nke ijekwu Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè tupu ịmalite ọrụ owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nyere mmadụ nile aka ịhụ mkpa ọ dị iji ihe ndị a raara nye mee ihe n’ụzọ amamihe site n’iji nlezianya zụta ihe, ụkpụrụ ihe owuwu dị mfe, na usoro ngụkọ ego metụtara ihe nile.
Abụ 133 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 27
Abụ 100
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Maa ọkwa aha ndị ga-asụ ụzọ inyeaka na May. Gụpụta ndokwa ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ maka nzukọ ije ozi. Tụọ aro ụfọdụ na-enye aka maka ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị na-eji magazin ndị ọhụrụ eme ihe.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke October 1996, peji nke 8.
15 min: Otú Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ́ Ndị Kraịst Si Na-ejere Gị Ozi. Okwu onye okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke March 15, 1996, peji nke 24-27.
18 min: Nwee Àgwà Dị Mma Mgbe A Na-eme Nkwusa n’Ókèala A Na-arụkarị Ọrụ. Onye okenye esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ bụ́ ndị nweworo nkụda mmụọ n’ihi nzaghachi dị nta n’ókèala a na-arụ ugboro ugboro tụlekọọ mkpa a. O soro ha tụleghachi Ụlọ Nche nke July 15, 1988, peji nke 16-19, paragraf nke 4-14. Ha ejiri mmụọ dị mma kwurịta banyere ụzọ dị iche iche isi tinye aro ndị a n’ọrụ n’ọgbakọ.
Abụ 191 na ekpere mmechi.