Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/98 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka October

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka October
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite October 5
  • Izu Na-amalite October 12
  • Izu Na-amalite October 19
  • Izu Na-amalite October 26
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 10/98 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka October

IHE ỊRỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-ahazi Nzukọ Ije Ozi maka izu nke ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka ọ dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nakwa maka ntụleghachi ga-ewe minit 30 nke isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu na-eso ya. Ntụleghachi kwa ụbọchị nke usoro ihe omume mgbakọ ahụ bụ nke e kwesịrị inye ụmụnna atọ ruru eru tupu oge eruo bụ́ ndị ga-enwe ike ilekwasị anya n’isi ihe ndị pụtara ìhè. Ntụleghachi a a kwadebere nke ọma ga-enyere ọgbakọ aka icheta ihe ndị bụ́ isi maka itinye ha n’ọrụ ná ndụ ha nakwa maka iji ha eme ihe n’ubi. Okwu ọ bụla ndị na-ege ntị kwuru na ahụmahụ ndị a kọrọ kwesịrị ịdị nkenke ma gaa kpọmkwem n’ihe a na-ekwu.

Izu Na-amalite October 5

Abụ nke 199

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Onyenwe Anyị Bụ Onye Na-enyere M Aka.” Okwu na-ekpo ọkụ, na-agba ume nke onye okenye ga-ekwu.

20 min: “‘Ịgha Mkpụrụ nke Alaeze’ n’Ụzọ Magazin.” Ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Hazie ka ndị ụfọdụ kọwaa otú ha si malite ma nọgide na-enwe ụzọ magazin. Mgbe ahụ mee ihe ngosi nke nnyefe magazin ebe e mere ndokwa iji mbipụta ọzọ gaghachi.

Abụ nke 133 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 12

Abụ nke 42

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi isi ihe ndị a pụrụ iji mee ihe ná mbipụta magazin ndị ọhụrụ. Kọọ ahụmahụ ndị sitere na 1997 Yearbook, peji nke 45, na Teta! (Bekee) nke October 22, 1996, peji nke 32. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè ná nkesa magazin ná ngwụsị izu a.

10 min: “Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Odeakwụkwọ.” Okwu nke odeakwụkwọ ọgbakọ ga-ekwu, na-atụleghachi ọrụ ndị e kenyere ya. O kwusie okwu ike na mmadụ nile pụrụ inye aka site n’inye akụkọ ozi ubi ha ngwa ngwa.

10 min: Ha Nwere Mmụọ Ịsụ Ụzọ Na-ekpo Ọkụ. Okwu na-agba ume dabeere na 1998 Yearbook, peji nke 104-107. Kọwaa ihe mere e ji nwee ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na Japan, ihe na-enyere ndị nwunye nọ n’ebe ahụ aka ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ, ihe dị n’azụ akwụkwọ ịsụ ụzọ nke ọ bụla e dejupụtara, na ndị mejupụtara ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọsụ ụzọ ahụ. Gosi mmetụta dị mma nke ndị nne na nna bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-enwe. Mee ka mkpebisi ike a chọrọ iji mee mgbanwe ndi dị mkpa ná ndụ mmadụ iji sụọ ụzọ pụta ìhè. Gbaa mmadụ nile ume iji ekpere chesie echiche ike banyere ịtụleghachi ohere ha nwere ịsụ ụzọ.

20 min: “Ị̀ Na-agụ Magazin Ndị Ahụ?” Ajụjụ na Azịza. Tụleghachi aro ndị dị irè maka idokwa oge maka ọgụgụ ihe onwe onye ndị dị n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, ihe ọmụmụ nke 4, paragraf nke 5-6.

Abụ nke 107 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 19

Abụ nke 16

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: Otú E Si Akwadebe Maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-eduzi, na-adabere n’Ụlọ Nche nke November 15, 1986, peji nke 19-20, paragraf nke 16-18 na Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, ihe ọmụmụ nke 7, paragraf nke 11, na ihe ọmụmụ nke 18, paragraf nke 4-6. Kpọọ òkù maka azịza nye ajụjụ ndị na-esonụ: (1) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na anyị nwetara uru kasị ukwuu site n’isiokwu ọ bụla dịịrị ọmụmụ dị n’Ụlọ Nche? (2) Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị natara mbipụta ọhụrụ? (3) Olee ụzọ dị mma iji kwadebe maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche? (4) Nlebara anya dị aṅaa ka e kwesịrị inye akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha na isiokwu nke ihe ọmụmụ ahụ? (5) Olee otú anyị pụrụ isi tụleghachi ihe anyị mụtara? (6) Olee isi ihe ndị anyị ga-atụgharị uche na ha mgbe anyị na-eweta ọmụmụ ihe onwe onye anyị nke ihe ọmụmụ ahụ ná njedebe? (7) Olee otú anyị kwesịrị isi akwadebe azịza? (8) Olee otú a pụrụ isi enye azịza dị iche iche n’otu ajụjụ? Hazie ka ụfọdụ kọọ ihe ha meworo n’onwe ha iji rite uru kasị ukwuu site n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.—Leekwa Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 65-67.

Abụ nke 95 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 26

Abụ nke 98

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kpọpụtasịa aha mbipụta ochie ndị e nwere n’ọgbakọ, bụkwa ndị a pụrụ inyefe n’ozi dị ka ohere dapụtara. Ebe e nwere oge ezumike na-abịanụ na December, nke a ga-abụ oge dị mma maka ndị ntorobịa na ndị ọzọ e meworo baptism ịtụle ịsụ ụzọ inyeaka.

20 min: Nrubeisi Chineke n’Ezinụlọ E Kewara Ekewa n’Ụzọ Okpukpe. Okwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke June 1, 1995, peji nke 26-29. Nye agbamume na ndụmọdụ n’ụzọ obiọma nke ga-enyere ndị nwere ndị òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe aka ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi na isoro ọgbakọ na-akpakọrịta nke ọma.

15 min: Ịga Nzukọ n’Oge. Ntụle nke ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi abụọ ma ọ bụ atọ ga-enwe banyere nsogbu nke ịbịarute nzukọ n’azụ oge. Ha ekweta na ọnọdụ ndị a na-adịghị enwekebe, gụnyere ihe ndapụta, ọnọdụ ihu igwe, njem okporo ụzọ, na ihe ndị ọzọ, pụrụ igbu mmadụ oge. Otú ọ dị, ọ bụ àgwà ndị ụfọdụ ịbịa n’azụ oge. N’ụzọ na-ewuli ewuli, ìgwè ahụ atụlee ma mee ihe atụ ihe dị mkpa iji na-abịa n’oge: (1) ekele sitere n’obi dum maka ihe ùgwù nke ịga nzukọ nakwa maka nri ime mmụọ na mkpakọrịta nke a na-enwe ebe ahụ, (2) ime ezi atụmatụ tupu oge eruo na ịhazi ihe omume onwe onye, (3) ịrụkọ ọrụ ọnụ site n’obi n’etiti ndị òtù ezinụlọ, (4) ịhapụ n’oge nakwa ịmawapụta oge maka nsogbu ndị a na-atụghị anya ha, na (5) ịkpachara anya n’ezie ịghara ịkpatara ndị ọzọ bịaranụ ihe ndọpụ uche. Ha nile ekweta na a pụrụ idozi nsogbu a nke ịbịa n’azụ oge site n’itinye mgbalị mgbe nile iji meziwanye ihe.

Abụ nke 86 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya