Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/98 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka November

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka November
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite November 2
  • Izu Na-amalite November 9
  • Izu Na-amalite November 16
  • Izu Na-amalite November 23
  • Izu Na-amalite November 30
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 11/98 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka November

Izu Na-amalite November 2

Abụ nke 38

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi July maka mba a na nke ọgbakọ unu.

15 min: “Mmadụ Nile Aghaghị ‘Ịnara Okwu ahụ Nke Ọma’!” Ajụjụ na azịza. Gụnye aro ndị ọzọ sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, paragraf nke 21.

20 min: “Achọrọ M Ọmụmụ Bible!” Nkwurịta okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye nlekọta ije ozi ga-eduzi. Kọwaa otú a ga-esi hazie mgbalị a a ga-ejikọ aka ọnụ mee nke ime nletaghachi n’ọgbakọ unu. Ruo n’ókè o kwere omume, ndị nkwusa nwere ahụmahụ pụrụ isoro ndị ọhụrụ rụọ. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ isi kwuo ka e nwee ọmụmụ ihe ná nletaghachi. Gbaa mmadụ nile ume ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ ihe ọhụrụ.

Abụ nke 35 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 9

Abụ nke 187

13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche maka ozi ubi maka ngwụsị izu. Igbe Ajụjụ.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

17 min: “Wulitenụ Ibe Unu Elu Site n’Ịza Ajụjụ ná Nzukọ.” Ajụjụ na azịza. Kọwaa ụzọ ịza ajụjụ si etinye ihe n’ọganihu ime mmụọ anyị. (Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, ihe ọmụmụ nke 38, paragraf nke 4.) Kpọọ ndị ụfọdụ òkù ịkọ ụzọ ha si merie ịla azụ n’ịza ajụjụ na ụzọ e siworo gọzie ha site n’ikere òkè ná nzukọ.

Abụ nke 51 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 16

Abụ nke 182

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

20 min: “Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onye Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.” Okwu nke onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Tụleghachi Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 11-13, paragraf nke 6-12.

17 min: “Dị Irè n’Ozi Gị.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 1-7 nke ihe ntinye. Lekwasị anya n’isi ihe ndị pụrụ ịdị irè n’ókèala ọgbakọ unu karịsịa.

Abụ nke 167 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 23

Abụ nke 89

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọọ ahụmahụ ndị e bipụtara na peji azụ Teta! nke August 8, 1998, banyere mmetụta akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nweworo n’ahụ ndị mmadụ. Ndị nkwusa nile kwesịrị ịmụrụ anya inyefe akwụkwọ a n’oge ndị kwesịrị ekwesị.

17 min: “Dị Irè n’Ozi Gị.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 8-21 nke ihe ntinye. Lekwasị anya n’isi ihe ndị pụrụ ịdị irè n’ókèala ọgbakọ unu karịsịa.

20 min: Aro Iji Kwalite Ọgụgụ Bible Gị. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke May 1, 1995, peji nke 16-17. Mee ka uru a na-erite n’ụzọ ime mmụọ site n’ịgụ Bible kwa ụbọchị pụta ìhè. Tụleghachi aro ndị a tụrụ, tụleekwa ụzọ isi tinye ha n’ọrụ. Kpọọ ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ka ha kọọ ụzọ ha si na-erite uru site n’ịgụchi Okwu Chineke anya.

Abụ nke 46 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 30

Abụ nke 64

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha. Gbaa ndị ọ bụla na-amaliteghị ọmụmụ ihe na November ume ka ha nọgide na-etinye mgbalị ruo December, bụ́ mgbe a ga na-enyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ịga nletaghachi na-eji igbe dị na peji nke 19 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe; onye nkwusa ahụ akọwaa ụzọ a pụrụ isi jiri akwụkwọ ahụ mee ihe n’ịghọta ozizi Bible ma malite ọmụmụ ihe.

15 min: Jiri 1999 Calendar of Jehovah’s Witnesses Mee Ihe Nke Ọma. Okwu. Tụleghachị akụkụ dị iche iche nke kalenda ahụ: (1) ihe osise ndị na-adọrọ adọrọ ndị na-akọwa ihe omume na nkụzi Bible ndị dị ịrịba ama, (2) usoro ọgụgụ Bible kwa izu maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, (3) usoro ọgụgụ Bible kwa afọ maka oge Ememe Ncheta, (4) ịma ọkwa maka ntụleghachi odide na-abịanụ, na (5) ihe ncheta maka ikerechi òkè anya n’ozi magazin. Tụlee ụzọ ndị a ga-esi jiri ohere ndị e nwere na ya mee ihe idepụta ndokwa maka ozi ubi, idetu akụkọ ozi na agba e yiri iso ndị ọzọ rụkọọ ọrụ, idepụta ihe omume ndị e nwere ná nzukọ, idetu ihe ncheta banyere nleta onye nlekọta sekit na mgbakọ ndị na-abịanụ. Ikowe kalenda ahụ n’ebe a na-ahụ ya nke ọma n’ebe obibi ma ọ bụ n’ebe ọrụ, pụrụ ime ka e nwee ohere iji malite nkwurịta okwu ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Kọọ ahụmahụ sitere na 1988 Yearbook, peji nke 8.

15 min: Rite Uru Zuru Ezu Site na 1998 Yearbook. Nna esoro ezinụlọ ya tụleghachi peji nke 3-6, 31, bụ́ ebe na-akọ banyere ihe ọchịchị Chineke rụzuru n’afọ gara aga n’ụwa dum. Tụlee uru ndị ezinụlọ na-erite site n’ịgụkọ na ịtụlekọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị nakwa akụkụ ụfọdụ nke Yearbook ọnụ n’oge nri, na-ekpebisi ike ịnọgide na-eme otú ahụ n’afọ dum.

Abụ nke 121 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya